SS 3 IGBO FIRST TERM LESSON NOTE PLAN SCHEME OF WORK

 

FIRST TERM SS 3

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

IGBO LANGUAGE

 

WEEK     TOPIC

 

1-2        Mmeghari na Tensi na Aspekiti -1 ihe bu tensi,(i)udidi tensi 2 Ihe bu Aspekiti (i) udidi ya Ahiriokwu nwer tensi na nke nwere aspekiti

 

3-4 Atumatuokwu- A)mputara ya B)Udidi ya dika;mburu,ndika,mmemmadu,nsinuda,ogharaokwu,ilu, ukabuilu,akpaalaokwu C) omumatu ha

 

  1. Akaraedemede:1.Nkowa akaraedemede2.Udi akaraedemede di iche iche3.Itinye akaraedemede n’ahiriokwu4.uru akaraedemede bara

 

  1. Echichi na echimechi odinaala-(A)Udidi echichi di iche iche(B) Mmalite ha, Etu esi aba ha na oru di iche iche ndi chiri echichi na-aru.Njirimara onye chiri echichi dika

 

nze,ozo, obi,igwe,iyom                                                 dgz .mgbanwe batarala n’echichi na echimechi ufodu

 

  1. EZUMIKE NTA (MID-TERM BREAK)

 

  1. Ogugu na Aghotaazaa-Agumakwukwo dika ihe na emeghe uzo agamnihu

 

  1. Edemede leta: 1.udi leta di iche iche 2. Ikwu mpaghara di iche iche e nwere na leta 3. Ikwu etu esi ahazi leta 4. Ide udi leta di iche iche

 

  1. Edemede nka na udi ya.(I)uru o bara (2).Njirimaraya na ide edemede nka

 

  1. Ntughari—(1)Mputara ya .(2)Usoro esi eme ntughari.Ntughari n’Igbo

 

  1. Mmghari na ule

 

  1. Ule na mmechi

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

IZUUKA MBU (WEEK 1)

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

UBOCHI……

 

 

IHE OMUMU

 

 

ASUSU IGBO

 

 

 

 

KLAASI

 

 

ISIOKWU

 

 

 

 

SS III

 

Mmeghari

 

naAspeekiti

 

 

na

 

 

Tensi

 

 

NDINAYA

 

 

 

 

  • NKOWA TENSI, UDIDI TENSI UFODU (ii)

 

(II) TENSI NGAWANYE NA EJIRI MARA YA.

 

TENSI

 

Tensi bu katigori uto asusu e nwere na ngwaa nke na–eji oge kpomkwem ara oru. Tensi na – egosi oge ihe mere. O na-egosi ma ihe o na-eme ugbu a, ka o bu echi, ka o meela emee. Tensi na-enwe Nkwe na nju.

 

UDIDI TENSI DI ICHE ICHE

 

Tensi nwere udi ya di iche iche. Ha bu:

 

  • Tensi Ndinihu

 

  • Tensi Ndinaazu

 

(ch)       Tensi Ngaraadi

 

  • Tensi Ndiughba

 

  • Tensi Ngawanye

 

  1. TENSI NDINIHU – Tensi ndinihu bu tensi na – eziputa ihe ga-eme n’ihu. Tensi Ndinihu naenwe nkwe na nju.

 

Omumaatu Tensi Ndinihu (a)

 

Ada ga – aga Aba (b)  Nne Ebere ga

 

– esi ofe ohuru

 

(ch)       Ndi obodo ga – echi eze.

 

  • Ulo akwukwo anyi ga – emepe n’izu uka ozo.

 

Nkwe Nju
   
o ga-aga ahia O gaghi aga ahia.
   
  1. TENSI NDINAAZU – TENSI

 

Ndinaazu bu tensi na-eziputa ihe mere eme n’oge gara aga. O nwere ike ibu unyaahu ka o mere. Tensi ndinaazu na-enwekwa nkwe na nju.

 

 

3|Page

 

 

Nkwe

 

Nju

 

 

 

Nne m ziri m ozi

 

Nne m ezighi m ozi

 

 

 

Eze riri ji

 

 

Eze erighi ji

 

 

 

Ada gburu agwo

 

 

Ada egbughi agwo

 

 

 

Chike bere akwa                                            Chike ebeghi akwa

 

 

  1. TENSI NGAARADI – Tensi ngaraadi bu tensi na – eziputa ihe gaara ime nke emeghizi. Tensi ngaraadi na-enwekwa nkwe na nju.

 

  Nkwe Nju
     
  Nne m gaara ikwusi m akwukwo Nne m agaaraghi ikwusi
    m akwukwo
     
  Ugboala gaara ikutu Nne obi Ugboala agaaraghi ikutu Nne obi
     
  Onye nkuzi gaara Ipiagbu Chidi Onye nkuzi agaaraghi ipiagbu chidi
     
  Nne m gaara ite ofe Nne m agaaraghi ite ofe
     
  Egwu gaara atu m Egwu agaaragha atu m
     
4. TENSI NDIUGBUA  

 

Tensi Ndiugbua – Tensi Ndiugbua bu tensi ndi na – eziputa ihe na-eme eme ugbua.

 

Tensi ndiugbua na – enwe nkwe na nju.

 

Omumaatu:

 

Nkwe Nju
     
1) Ada na-eri nri Ada anaghi eri nri
   
2) Eze na – ebe akwa Eze anaghi ebe akwa
     
3) Nne Ngozi na-esi ofe Nne Ngozi anaghi esi ofe
     

NNWALE

 

  1. Kowaa ihe Tensi bu.

 

  1. Udi tensi ole ka e nwere?

 

  1. Gosiputa nju tensi ndi a:

 

  1. Ebere na-abia.

 

  1. Nne Ada na-ete ofe.

 

 

 

TENSI NGAWANYE NA EJIRI MARA YA

 

Tensi Ngawanye bu tensi na – eziputa ihe na-eme eme ka na – aga n’ihu. Tensi ngawanye na – eziputakari aka oru. Tensi ngawanye na-eziputa ihe mmadu na – aru o ji eri nri.

 

Dika

 

NKWE     NJU
       
1) Nne m na–akwa akwa Nne m anaghi akwa akwa
       
2) Ngozi na-aru oru Bekee Ngozi anaghi aru oru Bekee
       
3) Eze na – azu ahia   Eze anaghi azu ahia
     
4)Chike na-aru oru ugbo   Chike anaghi aru oru ugbo
       

NJIRIMARA TENSI

 

Tensi nwere ihe ndi ejirimara ha. Ejirimara Tensi bu ihe ndi ahu tensi na-enwe.

 

  1. Tensi niile na – enwe nsonazuhi ‘ghi’ na nju ha.

 

 

 

 

  • Nju Ada agahi abia

 

  • Nne m agaghi eti m ihe. (ch) Ezenwanne agaghi ada n’ule ii) Tensi Ngawanye na TensiNdiugbua na-enwe nnyemakangwaa na nkwe ha.

 

 

 

  • Eze na-azu ahia mmanu

 

  • Umunne chinwe na-aru n’ulo ogwu.

 

  • Tensi Ndiniihu na – enwe nnyemaka ngwaa ‘ga’ –

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

  1. Tensi nke na-eziputa maka ihe mere n’oge gara aga bu – (a) Aspeekiti (b) Mkpoaha (ch) Ngawanye (d) Tensi ndinaazu.

 

5|Page

 

  1. Tensi nwere –

 

(a) Nganihu (b) Nkpoaha (ch) Nkwe na nju (d) Nkowaaha.

 

  1. Tensi na –eziputa ihe gaara eme bu tensi – (a) Ngaraadi (b) Ndi niihu (ch) Ndinaazu (d) Nkwe.

 

  1. Tensi bu –

 

  • Ihe na-ekwu maka oge.

 

  • Ihe na-ekwu maka mgbati oge

 

(ch)       Ihe na-ekwu maka oge kpomkwem

 

  • Ihe na- ekwu maka mmaahu.

 

  1. Tensi bu katigori utoasusu nke na – esi na – aputa.

 

  • Mbuuzo (b) Ngwaa (ch) Nnochiaha (d) Nkwuwa.

 

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  1. Gini bu Tensi?

 

  1. Tensi olee ka e nwere?

 

  1. Nye nkowa tensi ndiniihu.

 

  1. Meputa ahiriokwu ato nwere nkwe tensi ndiniihu.

 

  • Nye nju ahiriokwu ato ndi ahu.

 

  1. Kwuo otu ihe e ji ama tensi.

 

 

 

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

 

Guo. Katigoi utoasusu ndi na – emetuta Ngwaa n’isi iri abuo na asato n’akwukwo EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME.Nke Emenanjo et’al

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

 

Guo maka Aspeekiti n’isi iri abuo na itoolu n’akwukwo. EXAM FOCUS maka WASSE & JME. Nke Emenanjo et’al

 

 

 

 

IHE OMUME NGWUCHA IZUUKA

 

  1. Deputa udi Tensi ano masiri gi ma, nye omumaatu ahiriokwu ato n’otu otu n’ime ha; Nke ga-enwe nkwe na nju.

 

 

 

AKWUKWO NLERE ANYA

 

1.Ntuziaka maka Udaasusu, uto asusu na omenala Igbo nke ndi Sekondiri Ukwu nke Abuo Nke OGECHUKWU LETI OKOYE.

 

 

 

 

 

 

IZUUKA ABUO (WEEK TWO)

 

 

 

 

 

 

UBOCHI……

 

 

 

IHE OMUMU

 

 

 

ASIUSU IGBO

 

 

 

KLAASI ISIOKWU

 

–             SS III

 

:MMEGHARI ASPEEKITI

 

 

 

NDINISIOKWU

 

  1. NKOWA A SPEEKITI NA UDI ASPEEKITI E ii. UDIDI ASPEEKITI iii. ASPEEKITI MMAHU iv. ASPEEKITI MMECHA( ASP. MMECHA NKWE

 

NA MMECHA NJU) v.                            ASPEEKITI NGAWANYE

 

 

 

ASPEEKITU

 

Aspeekiti bu katigori utoausu e nwere na ngwaa nke na-egosi ogologo oge. Tensi na aspeekiti yitere onwe ha; kama Tensi na-eji oge kpomkwem ebe Aspeekiti na-eji ogologo oge aru oru ya. Aspeekiti na-enwe Nkwe na nju ka Tensi.

 

UDIRI ASPEEKITI ENWERE anyi

 

nwere udidi aspeekiti ndi a:

 

  • Aspeekiti mmaahu

 

  • Aspeekiti ngawanye

 

  • Aspeekiti mmecha

 

 

 

 

  1. ASPEEKITI MMAAHU

 

 

 

 

Aspeekiti mmaahu bu aspeekiti na-eziputa ihe mmadu bu maobu eme bu eziokwu. O bu ihe na-agaghi akwusi akwusi. Aspeekiti mmaahu nwere nkwe na nju. Dika

 

 

NKWE   NJU
     
a) Nwanyi na-amu nwa Nwanyi anaghi amu nwa
     
b) Nnunu na – efe efe. Nnunu anaghi efe efe
     
ch) Mmadu na-anwu anwu Mmadu anaghi anwu anwu
     
  1. ASPEEKITI MMECHA:

 

Aspeekiti mmecha bu udi nke na – ezuputa, ihe merela eme nke amaghi oge o jiri mee kpomkwem.

 

Udi aspeekiti a na – enwe nsonaazu ‘La’ na nkwete ya ebe o na-enwe nsonaazu ‘beghi’ na nju ya.

 

Dika:

 

ASPEEKITI MMECHA

 

NKWE   NJU
         
  a) Nne Ada akaala nka Nne Ada akabeghi nka
       
  b) Ogoo eriela nri Ogoo eribeghi nri
       
  ch) Chima anwuola Chima anwubeghi
       
  d) Ndi uweojii akpochiela Ibe Ndi uwe ojii akpochibeghi
      Ibe
         
         
  1. ASPEEKITI NGAWANYE

 

Aspeekiti ngawanye bu aspeekiti na –eziputa ihe na – eme eme ka na-aga n’ihu.

 

Aspeekiti ngawanye na-enwekwazi nkwe na nju dika udi aspeekiti ndi ozo. Dika:

 

 

  Nkwe Nju
a) Adaaku na-eke isi Adaaku anaghi eke isi
b) Ana m akuzi nkuzi Anaghi m akuzi nkuzi
ch) Nne m na-aru oru Nne m anaghi aru oru bekee

 

 

8|Page

 

 

d) Okeke na-achu nta Okeke anaghi achunta.
NCHIKOTA NNWALE    

 

  1. Katigori utoasusu na-eji oge di ogologo aru oru bu –

 

  • Aspeekiti (b) ngwaa (ch) Tensi (d) Nkwe

 

  1. Udi aspeekiti ato e nwere bu

 

  • Tensi, mmaahu na mmecha

 

  • Mmecha, aspeekiti na mmaahu

 

(ch)       Ngawanye, mmecha na Tensi

 

  • Mmecha, mmaahu nangawanye

 

  1. Ihe eji ama aspeekiti mmecha bu nsonaazu ‘_’ na ngwaa ya

 

(a)           ‘ghi’ (b) ‘La’ (ch) ‘beghi’   (d) ‘ri’.

 

  1. Ahiriokwu bu ‘nkwe’ aspeekiti mmaahu bu – (a) Egbe na – ebu okuku

 

  • Ada biara be anyi.

 

(ch)       Ezenwa na – azuta okuko o ga-eri.

 

  • Nne Ada na – akpo m.

 

5.`Ahiri okwu ziputara nju aspeekiti mmecha bu –

 

  • Eze akaala nka.

 

(b)         Umu ya akaghi nka. (ch)       Chioma akachaghi nka

 

  • Eze akabeghi nka.

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  • Gini bu Aspeekiti?

 

  • Udi aspeekiti ole ka e nwere.

 

  1. Were omuma atu gosi aspeekiti ngawanye.

 

 

 

9|Page

 

  1. Nye nju aspeekiti ndi a (a) Nna m akaala nka. (b) Ndi be anyi egbuola mmadu

 

(ch)       Onwa ohuru aputaala.

 

  1. Dee otu ihe di iche n’etiti Tensi na Aspeekiti.

 

 

 

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

 

Guo atumatu okwu Igbo n’akwukwo Exam Focus Maka WASSCE & JME.

 

Isi iri ano na abuo.

 

 

 

IHE GUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

 

Guo akaraedemede Igbo n’ akwukwo Igbo 3 Junio Sekondiri N’ Usoro B’ezik Edukeshon.

 

 

 

IHE OMUME NGWUCHA IZUUKA

 

  1. Deputa ahiriokwu iri bu, nkwe aspeekiti mmecha.

 

AKWUKWO NLERE ANYA

 

  • EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME nke Emenanjo et’al

 

  • Nchikota Akwukwo maka ULE SINIO SEKONDIRI nke A. I. Nze.

 

IZUUKA NKE ATO (WEEK THREE) UBOCHI……
IHE OMUMU : ASUSU IGBO
KLAASI : SS 111  
ISOKWU   : ATUMATUOKWU

 

  • MPUTARA ATUMAATUOKWU

 

  • UDIDI ATUMAATUOKWU (CH) OMUMATU.

 

 

 

NKOWA ATUMATUOKWU.

 

 

 

 

 

10|Page

 

 

Atumatuokwu bu okwu nka di iche iche e nwere n’asusu Igbo. Asusu Igbo bu asusu okwu nka juputara n’ime ya. O bu okwu nka di iche iche ka ode na-ewebaata n’ederede iji choo asusu mma. O. na-emekwa ka ederede buru okaibe.

 

Nnwale:

 

 

 

UDIDI ATUMATUOKWU NA OMUMATU HA.

 

  • ILU (PROVERBS):

 

Ilu bu okwu amamihe nke ndi Igbo ji acho asusu mma. N’uzo ozo, ilu bu manu ndi Igbo ji eri okwu. E nwere ka e si amalite ilu: (a) “Ndi Igbo turu ilu si …” (b) “A na-ekwu n’okwu si … Omumatu ilu Igbo ufodu na nkowa ha.

 

  ILU NKOWA YA IHE MMUTA DI NA YA
       
I Aka aja aja na-ebuteee onu Onye ruo o rie Ino nkiti abughi ezigbo
  mmanu mmanu   ihe (nkiti adighi) (mma
      onumo)
       
Ii Isi kote ebu, o gbaa ya Ihe onye choro ka o O nweghi ihe na-eme
    naahu onye aka ya di ocha
       
  • MBURU (METAPHOR):

 

Mburu na-akowa kpomkwem ihe okwu bu. Mkpuruokwu eji amata mburu bu “bu”.

 

 

 

 

  1. Obi bu edi –

 

 

 

 

  1. Chima bu mbe.

 

 

 

 

 

 

Mmemmadu bu atumatu okwu na-eji ihe abughi mmadu were mere mmadu.

 

Omumatu:

 

  1. Ahuhu akpuola nwaanyi ahu isi. Nkowa: Egwu na-atu ya.

 

 

 

 

 

  1. MYIRI (SIMILE):

 

Myiri bu atumatuokwu na-asi na out ihe dika ihe ozo. Ihe e ji eziputa myiri bu “Dika” ma obu “ka”.

 

Omumatu: i. Akwa okuko ahu di ka nke ogazi; ii. Ada dika nne ya. E.

 

NSINUUDA. (ONOMATOPEIA):

 

Nsinuuda bu okwu uda na-aru oru dika mkpuruokwu ha no na ya.

 

Omumatu:

 

  1. Isi ya na-aku KPOOKPOO N’AJA KA HA NA-ALU OGU.

 

  1. Okwute dara tughum n’ime mmiri.

 

 

 

F.NZARAONWE (RHETORIC):

 

Nzaraaonwe bu okwu nka na-eji ajuju were na-ekwuputa ebumnuche ya. O bukwa

 

okwu ajuju nke anaghi enwe aziza n’ihi na ajuju ahu na-aza onwe ya.

 

Omumaatu:

 

  1. A na-ebu ala ebu?

 

  1. Akwa okuko o na-eti aki?

 

  1. AKAALAOKWU (IDIOMS):

 

Akaalaokwu bu okwu amamihe nke di nkenke ndi Igbo ji acho asusu mma.

 

Omumaatu:

 

  1. Nwata ahu na-eme aka abuo.

 

Nkowa:                            Nwata ahu na-ezu ohi.

 

  1. Nkita anaghi eri nsi ya.

 

Nkowa:- O naghi enyenwu mmadu ihe.

 

Nnwale:

 

  1. Kowaa ihe bu nsinuuda?

 

  1. Kedu ndiiche di na mburu na mmemmadu?

 

 

12|Page

 

Nchikota NNwale: Tumbo Tumbo

 

Horo out n’ime ndi a:

 

  1. Obi dejiri penu. Atumatuokwu a bu:

 

  • Abuabughi (B) ilu (CH) Akpaalaokwu (D) Ukabuilu ii. Chidi dika chisom. Atumatuokwu a bu:

 

 

 

  • Ike bu chinchi. Nke a bu:

 

  • Myiri (B) Mburu (CH) Akpalaokwu (D) Ilu iv. Afo tara ya mmiri. Nke a bu

 

  • Mburu (B) Myiri (CH) Akpaalaokwu (D) Ilu

 

  1. Ada di ahu abuo. Nke a bu

 

(A) Ada nweziri ahu abuo                                 (B) Ada di ime                              (CH) Ada bufere ibu oke                                (D) Ada

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

ajokazi.

 

 

 

 

 

 

IZUUKA NKE ANO (WEEK 4) UBOCHI——-
IHE OMMU : ASUSU IGBO  
KLASI : SS I  

 

ISIOKWU UDIDI ATUMATUOKWU,

 

NDINISIOKWU

 

 

 

13|Page

 

  1. OMUMAATU HA

 

  1. URU ATUMAATUOKWU BAA N’AGUMAGU.

 

UDI DI ATUMATUOKWU NA OMUMATU HA.

 

A.UKABUILU (PARABLE):

 

Ukabuilu bu ilu e tinyee na nwantakiri akuko. O bu obere akuko ndi Igbo na-ako n’uzo ilu iji were choo okwu mma.

 

Omumatu:

 

  1. Udele ghuchara ahu were juo umunna ya kedu ka o di ugbua, umunna ya were zaa ya si ya na o bu ugbu a ka njo malitere riwa ya elu.

 

 

 

Nkowa:

 

Nke a na-akowa mi mime ihe ojoo

 

Karia otu o si eme na mbu.

 

  1. Otu nwa mmuo na-acho mmadu. O were puta n’uzo were hu ozu nwuru anwu, o were

 

tie E hee na ije eberela ya nkenke.

 

Nkowa: Nke a putara mmadu inweta ihe o na-acho na ntumadi n’atughi anya ya.

 

  1. EGBEOKWU (HYPERBOLE)

 

Egbeokwu bu atumatuokwu a na-akpunyefe nnu n’ihe a na-ekwu site n’iji ihe kariri ihe a na- ekwu wee ma atu iji mee ka ihe a na-ekwu maka ya na-ada ka egbe.

 

Omumatu:

 

  1. Ndi no n’ama egwuregwu ahu kariri aja di n’ala. ii.

 

Uwa dum na-anu ka okeke na-agwo ura n’abali.

 

 

 

  1. IGBUDUOKWU (PARADOX)

 

Igbuduokwu bu atumatuokwu ebe a na-ekwu okwu na-adiba ka okwu iberiibe ma e chemie echiche lee ha anya, ha eziputa eziokwu.

 

Omumaatu:

 

 

 

 

 

 

  1. Ura ga-eju onye nwuru anwu afo. ii. Onye atufughi o naghi atututa.

 

 

  1. EKWUECHOZO (IRONY)

 

O bu atumatuokwu nke mmadu ji eziputa ihe ozo o bu n’uche nke na-aru uka n’ihe onye ahu kwuputara.

 

 

 

 

  1. I biakazi n’oge wee bia mgbe a na-agbasa. ii.

 

Akola m oji n’ihi na oji juru ulo a.

 

 

 

  1. MBIAMBIAUDA (ASSONANCE)

 

O bu ebe uduaume na-aputa ugboro kwuru ugboro.

 

 

 

 

  1. Nna Ada si Aba gaa ahia na Gwagwarada.

 

  1. Amara na-ata akara na achaghari anya na-acho achicha.

 

 

 

 

F.MBIAMBIAMGBOCHI (ALLITERATION)

 

Mbiambiamgbochi bu ebe otu mgbochiume na-aputa ugboro kwuru ugboro.

 

Omumatu:

 

  1. Nna ya ochie bulawara akwukwo. ii. Onye ohi ahu no ugbua na-esi igwe n’imi

 

 

 

  1. ASINIILU (WELLARISM)

 

Asiniilu bu udi ilu a na-akpo out onye maobu out ihe aha sin a o bu ihe onye/ihe ahu

 

kwuru.

 

 

 

15|Page

 

Omumatu:

 

  1. Udara siri na o bughi naani ya mutara nwa a na-apiwa onu.

 

  1. Nkita siri onye ya turu oche wenatakwara ya ego na ntukwu amarala ya ahu. Nnwale:

 

  1. Deputa ndiiche di n’etiti mbiambiamgbochi na mbiambiauda?

 

 

 

 

  1. Atumatuokwu bu okwu nka a na-etinye n’okwu maobu n’edemede iji meek a o nwee ugwu ma too uto n anti.

 

  1. A na-enye nwata akwukwo na-etinye atumatu okwu n’edemede ya maak

 

puru iche n’ule.

 

iii. E ji atumatuokwu acho edemede agumagu mma. iv. Atumatuokwu na-abata n’edemede o bula e dere n’asusu Igbvo.

 

  1. Mmuta atumatuokwu na-eme ka ederede aguoazaa di mfe. Nnwale:

 

  1. Deputa uru abuo atumatuokwu bara n’agumagu?

 

 

 

 

 

 

 

  1. Kedu akpaalaokwu nkowa ya bu I gba nnukwu uzo?

 

(A)          Edi suru ya onu (B) Onwu o bu n’aka (CH) O na-agu okpa onu                (D) O ji mbe n’aka.

 

  1. Nneka dika nza putara na (A) Nneka nwere nku ka nza.

 

  • Nneka tara nnukwu ahu

 

(CH)      Nneka di mkpumkpu

 

  • Nneka nwere ugbene ka nza.

 

 

 

 

  1. Kedu udi atumatu okwu Gwongworo bu?

 

  • Ndika (B) Mburu (CH) akpaalaokwu (D) Nsinuuda.

 

  1. Kedu udi atumatu okwu ahiriokwu a-onwu, I mee aru na-egosi?

 

(A)            Ndika (B) mburu (CH) mmemmadu                 (D) akpaalaokwu.

 

  1. Ole nke bu aha nsinuuda n’ime ndia? (A) Mkpurumkpu (B) komkom (CH) osisi (D) agbisi Edemede Nnwale:

 

  1. Kowaa ihe bu mmemmadu? Were ahiriokwu di iche iche were choo nkowa gi mma.

 

  1. Were omumatu ato kowaa n sinuuda?

 

  1. Akpaalaokwu na ilu ha bu out? Kowaa onwe gi nke oma.

 

  1. Kedu ka ukabuilu si mere di iche n’ilu na akpaalaokwu?

 

  1. Deputa ndiiche di n’etiti ilu na ukabuilu? Were ihe omumatu were choo nkowa gi mma.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

17|Page

 

ORU NGWUCHA IZUUKA:

 

  1. Guo Nchikota Ihe omumu nke Asusu Igbo maka Ule Sinio Sekondiri nke Maazi M. C. Ngoesi, Optimal, Press Ltd. Nig. Ihu akwukwo nke out nari na iri anon a out wee rue na out nari na iri anon a asato.

 

 

 

 

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka o zo:

 

Gua oruaka na uru oruaka bara.

 

 

 

 

Ihe omume nke ngwucha izuuka.

 

Deputa akpaalaokwu ise I mara ma kowakwo ha nkeoma?

 

Akwukwo nlere anya:

 

  1. Ndezu utoasusu Igbo nke ndi Sinio Sekondiri nke Chinekum E. Ofomatadere; Format Publishers (NIg.) Ltd.

 

  1. Nchikota Ihe omumu nke Asusu Igbo maka Ule Sinio Sekondiri nke Maazi M. C. Ngoesi dere. Optimal Press Ltd. Nigeria.

 

 

 

 

 

IZUUKA NKE ISE (WEEK 5)                          UBOCHI……

 

ISIOKWU: AKARAEDEMEDE

 

NDINISIOKWU:

 

  1. NKOWA AKARAEDEMEDE

 

  1. UDI AKARAEDEMEDE DI ICHE ICHE.

 

  • ITINYE AKARAEDEMEDE N’AHIRIOKWU

 

  1. IV.URU AKARAEDEMEDE BARA

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

?.,‘;:“”()-!

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

19|Page

 

 

NKOWA AKARAEDEMEDE

 

Akaraedemede bu akara a na-etinye n’edemede nke na-eme ka ihe e dere nwee nghota ma doo anya. O na-emekwa ka ihe e dere nwee ogugu.

 

UDI AKARAEDEMEDE DI ICHE ICHE NA ]M[MAAT[ AHIRIOKWU).

 

1. Kpom . full stop  
2. Rikom , comma    
3. Rikom elu apostrophe  
4. Rikom ngwu “ ” quotation mark
5. Akara ngudo ( ) bracket    
6. Kpom rikom ; semi colon  
7. Kpom kpom : colon    
8. Akara mkpu (ntimkpu) ! exclamation mark
9. Akara ajuju ? question mark  
10. Akara uhie hyphen    
11. Zam   __ dash      

 

 

 

 

 

  1. Kpom :

 

A na-etinye kpom na njedebe ahiriokwu ma o buru na ahiriokwu ahu abughi ahirimkpu ma o bu ahiriajuju.

 

Omumaatu

 

  • Bia ebe a.

 

  • Achoro m ikwu okwu.

 

 

A na-etinyekwa kpom n’ihu mkpuruedemede e jiri debiri mkpuruokwu nakwa na ngwucha mkpirisi okwu.

 

Omumaatu

 

  • S.C.E.

 

  • H,.N.D.

 

  • Y.S.C. (d) G.C.E.

 

A na-etinyekwa ya n’ego.

 

Omumatu

 

  • ₦50.75K

 

  • ₤12.3O

 

 

 

 

20|Page

 

 

  1. RIKOM :

 

A na-etinye rikom mgbe a na-aguputa ihe n’usoro.

 

Omumatu

 

  • Ndi no n’ogbako ahu gunyere Obi, Nweke, Chinedu na Ikenna.

 

  • Ha nwere ofe onugbu, ofe egusi na ofe oha.

 

A na-etinyekwa ya mgbe e dechabeghi otu ahiriokwu.

 

Omumatu

 

  • Mgbe o bula I jiri di njikere, mee ka m mara.

 

  • O buru na Nkechi bia, bia be Ugoye kpoo m.

 

A na-etinyekwa ya tupu e kwuo okwuihu.

 

Omumatu

 

  • Onye nkuzi siri, “onye o bula gee nti”.

 

  • Ihe Ifeoma sara ya bu, “Amaghi m ihe m ga-agwa gi”.

 

  1. RIKOM ELU:

 

A na-eji rikom elu eziputa mbuuzoma o buru na udaume bidoro okwu na-eso mbuuzo. Omumatu

 

  • Na +elu = n’elu

 

  • Na +olulu = n’olulu

 

  • Na + Enugwu = n’Enugwu

 

  1. RIKOM NGWU:

 

A na-eji akaraedemede a eziputa okwuihu mmadu. Yabu okwu mmadu kwuru dika o siri kwuputa ya.

 

Omumatu

 

  • O siri, “Achoghim onye ga-enye m nsogbu maoli”. (b) Dokita siri ya, “I nuo ogwu a, I ga-agbake”.

 

  1. AKARA NGUDO:

 

 

 

  • Anyi emeela akuko ifo, ilu, agwugwa na ejije (agumagu odinaala).

 

  • Tupu mmadu amuta etu e si ede asusu Igbo, o ga-ebu uzo muo abiidii (mkpuruedemede) nke oma.

 

A na-ejikwa akara ngudo achikota ndebiri mkpuruedemede putara n’ahiriokwu. Omumatu

 

  • Obi ga-ele ule General Certificate of Education (G.C.E.) n’afo ozo.

 

  1. KPOM RIKOM:

 

21|Page

 

 

Kpom rikom na-aru oru abuo; o na-aru oru ikepu ahiriokwu ndi yiri onwe ha mana njiko adighi n’etiti ha.

 

Omumatu

 

  • O bu dibia; o gwoola otutu mmadu oria. (b) Ekemma no ebea; nne ya na-abia.

 

O na-arukwa oru ikepu ahiriokwu ndi nwere “n’ihi ya” n’etiti ha.

 

Omumatu

 

  • O ruru oru hinne; n;ihi ya ike gwuru ya.

 

  • O naghi agu akwukwo; n’ihi ya o dara uleakwukwo.

 

 

 

  1. KPOM KPOM:

 

E ji kpom kpom eziputa na ihe ndi na esota di otutu.

 

Omumatu

 

(a) Ndi a ga-anochita anya uloakwukwo anyi: Adaku, Chinwendu, Obiageli na Chinyere.

 

O na-abatakwa n’etiti awa na nkeji.

 

Omumatu

 

  • 6:15

 

  • 2:30

 

  • 12:00

 

A na-etinyekwa ya n’etiti isiokwu na amaokwu ma e dewe okwu sina Akwukwo Nso Omumatu

 

  • Jon 3:16

 

  • Mkpuhe 21: 8

 

  1. AKARA NTIMKPU:

 

E ji nke a emechi ahiri mkpu.

 

Omumatu

 

  • Ewoo!

 

  • Ahusiela m anya!

 

  • Anwuo m oo! (d) Chi moo!

 

  1. AKARA AJUJU:

 

A na-akanye nke a na ngwucha ahiri ajuju ma o bu na njuajuju.

 

Omumatu (a) Kedu

 

aha gi?

 

  • Onye ka I bu?

 

  • Nne m o biara ebe a? (d) Ebee?

 

  • Kedu?

 

22|Page

 

 

(f) Gini? (g) Ole?

 

  1. AKARA UHIE:

 

A na-etinye nke a n’etiti nnymakangwaa na omekangwaa.

 

Omumaatu (a) Ha

 

na-eri nri.

 

(b) O ga-abia echi.

 

  1. ZAM:

 

Zam ka akara uhie n’ogologo. A na-etinye ya n’edemede ma a choo iweputa okwu di oke mkpa.

 

  • Otu okwu ka na-aga n’ihu __ abiaghi oru n’oge.

 

  • Onye isi ala mbu nke Naijiria __ Dkt. Nnamdi Azikiwe.

 

URU DI N’AKARA EDEMEDE

 

1.Akaraedemede na-eme ka a gh]ta ihe e dere

 

2.O na-eme ka edemede di mma n’anya

 

3.O na-eme ka edide di uto ogugu

 

NNWALE

 

Deputa uru abuo akara edemede nwere.

 

 

NCHIK}TA NNWALE

 

  1. Tinye akaraedemede n’ahiriokwu ndi a:

 

  1. Anyi edechaala ule ii. Onye na—abia

 

iii.         Mmiri di nite iv.         Akuku ahu

 

mmadu bu anya isi nti ukwu

 

  1. Gosiputa akara ndi a:

 

  1. Rikomelu ii.

 

Kpom kpom

 

  • Akara ajuju

 

  1. Akara uhie

 

  1. Akara ngudo

 

 

 

ORU ULO

 

  1. Anyi na-agu akwukwo. Na a karanyere ihe bu —————–

 

  1. Mbuuzo

 

  1. Nnyemakangwaa

 

 

23|Page

 

 

  1. Njiko

 

  1. Isingwaa

 

  1. Olee ahiriokwu ebe a nke ‘na’ di ya bu njiko

 

  1. Ada bara n’ulo

 

  1. Ubochi satodee na ubochi uka abughi ubochi akwukwo

 

  1. Ndi Igbo bi na Legoosi bara uba

 

  1. Otutu ndi mmadu na-aga akwukwo ubochi satodee

 

  1. Akara e ji egosi nkwusi na ngwucha ahiriokwu bu?

 

a)-    b)’ c), d).

 

4.A na-etinye akara uhie(-) n’otu n’ime okwu ndia

 

a)ya b)uru c)ga d)mu

 

5.Otu n’ime ndi a bu akara e ji egosi ihe mmadu kwuru a). B): c)() d)”

 

 

 

 

 

 

 

IZUUKA ISII (WEEK 6)     UBOCHI———-
IHE OMUMU : ASUSU IGBO
KLAASI : SSS III
ISIOKWU : NKOWA IHE BU ECHICHI NA ECHIMECHI ODINAALA,
    NDINISIOKWU  

 

  1. MMALITE NA-ETU ESI ABA HA

 

  1. UDIDI ECHICHI DI ICHE ICHE

 

  • MMALITE HA, ETU ESI ABA HA.

 

 

  1. NJIRIMARA ONYE CHIRI ECHICHI DIKA NZE, OZO, IGWE, IYOM DGS.

 

  1. MGBANWE BATARALA N’ECHICHI NA -ECHIMECHI UFODU

 

 

 

 

 

 

 

 

24|Page

 

 

NKOWA ECHICHI NA ECHIMECHI ODINAALA

 

  1. Echichi bu ihe di ukwu nan du onye Igbo. Otutu mmadu na-eme emume ma o bu echichi n’obodo ha otutu emume ma o bu echichi nwere mkporogwu n’igo mmoo n’ihi na mgbe obula ha na-eme ya, ha na-akpoturu arusi di iche iche..

 

Echichi na-abu emume oriri na onunu. Onye na-echi echichi na-egosiputa nay a kpatara ego ma o bu aku. Nke a na-egosikwa na akwara siri mmadu ike. Aha echichi a naechi n’ala Igbo na etu e si echi ha di iche iche. Ma out ihe jikoro ha onu bu mmemme oriri na onunu nke by otu ihe na-agbanyeghi akuku Igbo ha sitere.Umuaka, umuokorobia na umuagboghobia nwere echichi nke ha ha-echi.

 

UDIDI ECHIMECHI DI ICHE ICHE BU:

 

(i) Echimechi ozo (ii) Nze (iii) Ichi eze (iv) Ichi ezeji/Diji (v) Ichi atama (vi) Ichi iyom (v) Ichi Loolo

 

 

 

 

Nnwale:

 

  • Kowaa ihe bu echimechi?

 

  • Deputa udi echimechi di iche iche?

 

 

 

 

MMALITE NA ETU E SI ABA HA.

 

  1. ECHIMECHI OZO.

 

Ozo bu echichi nwoke na-echi n’ala Igbo iji gosi na onye ahu eruola ihe e ji nwoke eme. Onye chiri ozo ga-abu onye na-ekwu eziokwu. Nke a mere na a na-asi na onye ozo gaabu onye sara ire. O ga-abu onye agwa ya kwu oto anaghi eme ihe ojoo. O ga-abu onye nwere eg,

 

Na mmalite, onye choro ichi ozo ga-ebu uzo mee otutu umu obere emume dika igba agu, ibu amanwuru, ime ekwu, ime ozo ulo na ihe ndi ozo ga. N’obodo ufodu, mmadu abanyeghi amanwuru agghi enye ya ikike.

 

 

  • bu site n’etiti ndi chiri ozo ka e si ahoputa ndi nze. O bu onye kachasi buru okenye n’umunna ga-abu nze. Nke a putara na o bu ihe ihere diri umunna na-enweghi nze.

 

  • ICHI EZE

 

25|Page

 

 

  • bun di eze odinaala bun di na-achi obodo o bula. O bu onye bukarisiri isi ma obu buru uzo chie ozo na-anochite anya umunna n’ochichi obodo. Onye ga-abu eze ga na-ekwu eziokwu, akpa ezi agwa ma hu n’ochi obodo na-aga n’ihu.

 

  1. ICHI EZEJI (DIJI)

 

N’ala Igbo eze jib u onye kacha wee kota ji n’obody n’afo ahu. Onye ahu ga-eke ji n’akuku oba ano ma wusakwa ufofdu ji n’ala. Onye a ga-echi echichie ga-ebute ji ndi ezeji ndi ozo ga-eri ubochi ano kpoba ewu n’oba ya ka o taa ji mkpuru ubochi ano. O ga-egbu okuko, ewu na-ehi na anu ndi, ozo iji siri ndi obi a nri.

 

  1. ICHI ATAMA

 

Echichi atama bu echichi a na-echi nwoke tozuru ihe e ji mmadu eme. O bu onye naelekota mmuo atama nwuo e chie onye ozo atama. A ga-ebu uzo juta ase n’arusi onye gaanochi onye nke nwuru anwu. Ha agaghi agwa onye ahu a ga-echi ya wee rue ubochi a gaechi ya echichi ka o ghara I gbapu.

 

  1. ICHI IYOM:

 

Iyom bu echichi umunwaanyi kpatara ego na-echi. Umuaka umunwaanyi be ha nwere ego nwere ike ichi iyom. Onye choro ichi echichie a ga-ebu uzo gakwuru onyesi ndi chiri iyom gwa ya ebumunuche ya. Ihe ndi ozo a ga-eleba anya bu. Ihe ndi o ga-azuta a gaenye ndi okenye no n’out ahu. Ubochi a ga-echi echichi a ka a ga-agbanye onye ahu odu aka na nke ukwu. Ubochi agbanyee ya nke a ka a na-akpo “MMACHA”.

 

VII.        ICHI LOOLO.

 

  • bu umunwaanyi tozuru ihe e ji mmadu eme tumadi nwunye Igwe nan di eze ya ka a na-echi echichi a. Loolo igwe ga-ahu nan di loolo ndi ozo na-elekota ogbe ha na ezinaulo ha dika o kwesiri.

 

Nnwale:

 

  1. Kpoputa echichi ano imara?

 

Nchikota Nnwale:                                      Tumbom Tumbom

 

Horo otu n’ime ndi a:

 

  • Otu n’ime ndi a bu echichi

 

(A) Igu aha        (B) iru mgbede      (CH) nze                      (D) ohu.

 

  • Out n’ime ndi a abughi eziokwu. Onye chiri echichi n’ala Igbo.

 

26|Page

 

 

  • na-enwe nsopuru (B) na-eme aka abuo (CH) na-edozi esemokwu (D) naanochite anya obodo ya ma a choo.

 

  • Otu n’ime ndia bu echichi

 

(A) Iyom (B) omugwo (CH) ile obia                                (D) ilu nwaanyi

 

  • Echimechi bun di a na-echi ya

 

  • Umu nwoke na umu nwaanyi (B) umu odibo (CH) umu akwukwo (D) ndi mara akwukwo

 

  • Oti n’ime ndi a bu echimechi umunwoke

 

(A) Iyom            (B) Loolo                  (CH) ezeji (diji) (D) okpu

 

Edemede Nnwale:

 

  • Deputa oru abuo ndi chiri echichi na-aru?

 

  • Kedu ihe onye choro ichi ozo ga-ebu uzo mee tupu o chiwe ozo?

 

  • Deputa iwu ato di n’ichi ozo?

 

  • Deputa mgbanwe abuo batara n’ichi ozo?

 

  • Ihe ato e ji ama ndi chiri echichi bun di a

 

 

 

 

Oru ngwucha Izuuka.

 

Guo Ntuziaka maka Udaasusu, utoasusu na omenaala Igbo nke ndi Sekondiri Ukwu nke abuo, nke Leti Okoye dere. Innoge Tradidng Company Ltd.

 

 

 

 

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka ozo. Deputa uzo ihe ano onye chiri ozo kwesiri ime? Akwukwo Nlere anya.

 

Ntuziaka Maka Udaasusu, utoasusu na omenaala Igbo nke ndi Sekondiri ukwu

 

 

 

 

 

 

 

ORU DI ICHE ICHE NDI CHIRI ECHICHI NA-ARU.

 

 

27|Page

 

 

Ndi chiri echichi n’ala Igbo nwere oru di iche iche ha na-aru dika ndi a:

 

  • INYE AKA N’OCHICHI OBODO:

 

Ndi chiri echichi na-enyere igwe nan di Eze aka ihu achichi ya na-aga n’ihu otu o kwesiri.

 

  1. Ha na-elekota ndi a hanyere ha n’aka. Ndi chiri echichi agaghi anoro ndi obodo ozo abia

 

mekpaa ndi ha na-elekota ahu. iii) Ha na-achikota ma na-achoputa ihe ndi obodo kwesiri ime.

 

  1. Otutu ndi chiri echichi na-enyere ndi ogbenye aka.

 

  1. Ha na-ahu na udo na idi n’out di n’obodo.

 

  1. Ha na-eme ka obodo di ocha ma na-ewebata ihe ndi na-enyere ndu aka. vii) Ha na-enye aka weputa ndi na-eme ka obodo gaa n’hu.

 

Nnwale:

 

  • Deputa oru abuo ndi chiri echichi na-aru?

 

 

 

 

NJIRIMARA ONYE CHIRI ECHICHI NA MGBANWE BATARALA N’ECHICHI NA ECHIMECHI UFODU.

 

N’ala Igbo: Ihe ndi ejirimara onye chiri echichi:

 

  • Ndi nze na ozo na-ekpu okpu mmee mmee.

 

  • Ha na-eyi efe agu.

 

  • Ha na-agba eriri ozo n’ukwu ha.

 

  • Ndi chiri echichi a naghi eri ihe n’oha.

 

  • Ndi nze na ozo na-eji mkpo n’aka ha.

 

  • Ha anaghi agafe mmiri.

 

  • Ha anaghi ejete aka.

 

  • Ha na-ekwu eziokwu

 

  • Ha na-eji akupe n’aka ha.

 

28|Page

 

 

MGBANWE BATARALA N’ECHICHI NA ECHIMECHI UFODU:

 

  1. Ugbu a, ufodu ndi chiri echichi na-ejezi uko

 

  1. Ha anaghi amazi akwa.

 

  1. Ndi chiri echichi na-ejetezi aka.

 

  1. E wepula otutu ihe ndi ogommoo a na-eme nay a. Nke a mere nan di uka sozi echi ozo.

 

  1. Igba eriri ukwu buzi onye choo o gbaraa.

 

 

 

 

 

 

 

Nnwale:

 

  1. Deputa oru ato ndi chiri echichi na-aru? Nchikota Nnwale: Tumbom Tumbom

 

Horo otu n’ime ndi a:

 

  1. Onye chiri ozo na-ekpu okpu (a) ocha (b) edoedo (ch) ojii (d) ogwu.

 

  1. Onye choro ichi ozo ga-ebu uzo chie echichi nke a. (a) iba amanwuru (b) ichi nze (ch) ichi diji (d) ichi atama

 

  1. Ndi chiri echichi kwesiri i na- (a) asi asi (b) ekwu eziokwu (ch) ago mmuo (d) ebu iro

 

  1. (iv) Otu n’ime ndia bu echichi ndi igbo (a) ichi loolo (b) ichi akajiaku (ch) ichi ugbene

 

(d) ichi mma.

 

  1. Kedu nke e ji ama onye chiri echichi (a) ikpe ikpe ziri ezi (b) igho aghugho (ch) inu mmanya (d) igba n’ezi.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Edemede Nnwale:

 

  • Kowaa etu e si echi echichi abuo?

 

  • Deputa uzo echichi ato ndi Igbo na-echi?

 

  • Kwue etu echichi abuo si amalite?

 

29|Page

 

 

  • Deputa oru abuo ndi chiri echichi na-aru n’obody?

 

  • Kowa uzo ihe ato e jiri mara onye chiri ozo?

 

 

 

 

Oru ngwucha izuuka:

 

Guo Ntuziaka maka Udaasuru, Utoasusu na omenaala Igbo nke ndi Secondiri ukwu nke abuo; nke Leti Okoye dere, Innoe Trading Company Ltd. Ihu akwukwo nke out nari, iri iteghete na asaa rue na nari abuo na ato.

 

 

 

 

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka ozo:

 

Guo ogugu na Aghotaazaa – Agumakwukwo dika ihe na-emeghe uzo agamnihu.

 

 

 

 

Akwukwo Nlere anya:

 

  1. Ntuziaka Maka Udaasusu, Utoassusu na omenala Igbo nke Leti Okoye dere. Innoge Trading Company Ltd.

 

 

 

 

IZUUKA ASATO (WEEK 8)

 

 

 

 

UBOCHI——–

 

 

 

IHE OMUMU

 

 

 

 

ASUSU IGBO

 

 

 

KLAASI

 

 

 

 

SS III

 

 

 

TAAM

 

 

 

 

ABUO

 

 

 

ISIOKWU

 

 

-OGUGU NA AGHOTAZAA

 

 

 

NDINISIOKWU

 

AGUMAKWUKWU DIKA IHE NA-EMEGHE UZO

 

NDINISIOKWU

 

  • NKOWA IHE BU AGHOTAAZAA, AGAMNIIHU/OGAANIHU NA AGUMAAKWUKWU.

 

  • IDE OTU EDEMEDE UMUAKWUKWO GA – AGU ZAA AJUJU SO YA.

 

NKOWA IHE BU AGHOTAAZAA, AGAMNIIHU/OGAANIHU NA AGUMAAKWUKWU.

 

30|Page

 

 

Aghotaazaa bu igu ederede e deputara nke oma iji zaa ajuju so ya nke oma. Mgbe obula a kporo aghotuazua, a ga-enwe ajuju ga-eso ya a ga-aza.

 

Agamniihu/oganiihu bu mmadu ibu onye na-eme nke oma n’ ihe nnweta. Onye nwere oganiihu bu onye nwere ego igbo mkpa ya na ezinulo ya ma nwekwa nke o ji eme imakwa ndi anyi bu.Agumaakwukwu so n’otu uzo mmadu si enwe agamniihu.

 

 

 

IDE OTU EDEMEDE UMUAKWUKWO GA – AGU ZAA AJUJU SO YA.

 

Lee ederede a Guo ya nke oma ma zaa ajuju so ya:

 

Mazi Ukaga bu onye obodo Ukobo di n’Ogbakara. Obodo Ukobo nwere otutu umu ha na-azu ahia na oru aka di iche iche. Obodo Ukobo bu obodo a maara dika obodo laghachiri azu nke ukwu mgbe e leere obodo ndi ha na ha malitekoro.

 

Obodo a enweghi ulo ogwu, Ha enweghi mmiri ozizo, oku eletiriki buzi anu nwaem nye ha. Obodo a dika obodo agbaghara agbagha. Ogbenye putara ihe n’obodo a. O dika e deere ya n’ihu onye ukobo obula. O di otu a otutu afo.

 

Ndi Ukobo bu nani igba odibo bu –oru ha.

 

Onodu a di otua otutu afo wee ruo mgbe mazi Ukaga toputere.

 

Mmeghari aka obodo a malitere mgbe mazi Ukaga tolitere we gaa odibe be ndi ocha bi na Lagos.

 

Onye ocha a huru ihe di nwata a n’ime were duga ya akwukwo. O malitere guwa akwukwo nke elementri na-agbanyeghi na o toola nke ukwu. Chi nwa mgbenye anaghi eji ngwa/oso. Mgbe mazi Ukaga gosiri akwukwo elementri, o dighi onye huru azu ya. O mechara gaa koleji, gaa Mahadum muo gbasara ibu dibia Bekee. O tuurukwara ugo di egwu na mahadum mere ndi ocha jiri kporo ya.

 

O mechara luo nwany nweezie nnukwu ego wee malite tiwe obodo ya bu Ukobo mmanwu. Obodo ha gbanwere. Ndi Ukobo wee buruzie ndi nwere ihe nile na – eme ka obodo gaa n’ihu.

 

Ha nwere mmiri poompu ebe nile, Oku eletriki nyu sia ebe nile oku ndi ukobo anaghi anyu anyu.

 

Ugbu a, anaghi agu umuaka obodo Ukobo no zi ala Bekee. Nwoke a biara nye ndi obodo ha oghere igu akwukwo n’efu.

 

NCHIKOTA NNWALE

 

 

 

31|Page

 

 

  1. Mazi Ukaga bu onye –

 

  • Bini (b) Oka (ch) Onicha (d) Ukobo

 

  1. Ukobo di na –

 

(a) Aba (b) Legosi (ch) Ogbakara (d) Ibado

 

  1. Ihe mepere ndi Ukobo uzo bu – (a) izuahia (b) oru mekanik (ch) igu akwukwo igba odibo

 

  1. ____ buzi dibia bekee

 

(a) Mazi Ukobo

 

(b) Mazi Ukaga

 

(ch) Mazi Unachukwu

 

(d) Mazi Ogbakara

 

  1. Igu akwukwo na – eweta – n’ obodo. (a) Mgbasa (b) ntisa (ch) ilu ogu Agamnihu.

 

  1. Agughi akwukwo na – ewete ihe ndi a bere so out.

 

  • Obodo I no n’isi

 

  • Obodo ibu ohu

 

(ch)       Obodo inwe odinihu di mma

 

(d) Obodo igbasasi

 

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  1. Gini butere onodu ndi Ukobo nobu na ya?

 

  1. Gwa m uru abuo igu akwkwo na – abara mmadu.

 

  1. Olee otu onodu onye agughi akwukwo na – adi?

 

  1. Olee otu onodu diiri ndi Ukobo taa?

 

  1. Olee atumatu okwu “tiwe obodo ha mmanwu” bu.

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

 

Guo aghotaazaa di n’akwukwo EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME -Isi iri na ise.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

(d)

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

(d)

 

 

 

32|Page

 

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

 

Guo ihe ndi di mkpa n’edemede ‘Leta’.

 

IHE OMUMU NGWUCHA IZU UKA.

 

Guo ederede di n’akwukwo EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME Isi iri na ise page 40.

 

Zaa ajuju so ederede a.

 

 

 

 

AKWUKWU NLERE ANYA

 

EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME. Emenajo et’al

 

 

 

 

IZUUKA ITOOLU (WEEK 9)   UBOCHI——–
IHE OMUMU ASUSU IGBO
KLAASI   SS III
ISIOKWU   EDEMEDE LETA
NDINISIOKWU      

 

  • NKOWA LETA,

 

  • I KWU MPAGHRA DI ICHE ICHE E NWERE NA LETA NA OUT E SI AHAZI LETA.

 

  • (III)IDE UDI LETA DI ICHE ICHE

 

 

 

 

 

 

IKOWA LETA

 

Leta bu uzo anyi si ezikorita ozi. O bu uzo anyi si ezi nne na nna anyi ozi mgbe anyi na ha anoghi nso.

 

Edemede leta na – emetuta iju ase, achomooru, azumaahia na kwa laye ekele.

 

Leta di iche iche nwere otu e si ahazi ya.

 

E nwere udi Leta abuo

 

 

 

 

 

33|Page

 

 

  1. LETA NKEONYE: leta nkeonye by leta anyi na – edegaa nne na nna anyi, ndi enyi ndi ikwunaibe na ndi odimma anyi. E nwere ike iju ase na ya.

 

USORO LETA NKEONYE:

 

Leta nkeonye na – agbaso usoro ndi a –

 

  • Adresi odee

 

  • Ekele mmeghe / mmalite

 

(ch)       Ahu Leta (ozi e ji ede leta)

 

  • Mmechi – (Nkowa onye dere leta).

 

  1. LETA ANAMACHOORU

 

Leta Anamachoihe / Anamachooru bu leta anyi na – edere ulooru di iche iche na – ewe n’oru mgbe anyi na – acho oru. Anaghi aju ase na ya.

 

USORO LETA ANAMACHOORU

 

  1. Adresi Abuo (Nke ode na nke onye a na-edere.

 

  1. Ekele mmeghe/mmalite

 

  1. ISIOKWU

 

  1. Ahu Leta

 

  1. Nkowa onye dere Leta.

 

 

 

NNWALE

 

  1. Gini bu Leta?

 

  1. Udi Leta ole ka e nwere?

 

Ch)        Gini bu leta Nkeonye?

 

 

 

 

OMUMAATU LETA NKEONYE

 

Deeper Life High School,

 

Km.42 Lagos/Ibadan Expressway

 

 

34|Page

 

 

Lagos

 

20th August 2013

 

Ezigbo onye nkuzi m,

 

Leta a bu iji gwa gi na mu agaghi abia akwukwo echi nile n’ihi ahu onwunwu.Ana m enwe ahu oku kemgbe abali ato gara aga. Ahu oku na-ere m ya na oyi omuma. Nne m siri na mu agaghi abia akwukwo ka o were kporo m gaa ulo ogwu.

 

Aga m abia akwukwo echi nile ma m nweta onwe m. Biko, o ga – ama si m ma i nye m ihe omume ndi klasi anyi mere echi ma m bia akwukwu Ndeewo.

 

O bu m,

 

Nwa klasi gi,

 

Chinwe Obi

 

 

 

 

 

 

OMUMAATU LETA ANAMACHOIHE

 

Deeper Life High School,

 

Km.42 Lagos/Ibadan Expressway

 

Lagos

 

25th August 2013

 

The General Manager,

 

First Bank of Nigeria Plc,

 

P.M.B.            5003,

 

Lagos

 

 

Ezigbo Nna m ukwu,

 

ICHOORU DIKA ONYE ODEKO EGO

 

Agutara m n’akwukwo akuko ‘Nation’ Newspaper nke ubochi ‘Monday’ onwa Agustu di na mkpuru abali iri abuo na ulooru unu na-acho ndi oru odeko ego nke ulooru unu.

 

O ga-amasi m ma o buru na unu ga-ewere m n’ oru ahu.

 

Aha m bu chinwe Obika Abu m onye Amaagu Nze di na Nkanu. A gbara m afo iri abuo na ise. Etoro m ogologo.

 

 

 

35|Page

 

 

Aguru m akwukwo na mahadum nke Nnamdi Azikiwe University di n’ oka, Anambra Steti. Aguru m ihe gbasaru ibu onye odeko ego na mahadum. E tuoro mugo na ule akwukwo the ngucham na Mahadum ahu. E nwere m nzere 1st CLASS na ule ngucha m.

 

Ana m ele anya na unu ga-enye m ohere iru oru a.

 

Abu m,

 

Nwa Odibo gi,

 

Chinwendu Obika

 

NCHIKOTA NNWALE

 

  1. ____ bu ihe e ji ezikorita ozi.

 

(a) Nkebiahri (b) Leta (ch) Udaume                                                  (d) Adresi.

 

  1. Udi Leta abuo e nwere bu – (a) Leta udaume na mgbochhiume

 

  • Leta mbido na mmechi

 

(ch)       Leta mbuuzo na jiko

 

  • Leta Nkeonye na Anamachooru

 

  1. Letaa – na – wnwe out address

 

(a)            Nkowa (b) Nkeonye (ch) ozi                (d) Leta Anama chooru.

 

  1. Leta nke a na – aju ase nay a bu Leta –

 

(a) Anamachooru        (b) Nkeonye (ch) Nkengwaa (d) Nkenkowa.

 

  1. Ebe a na-ede ozi leta na Leta Anamachooru bun a – (a) Ekele mmalite (b) ahu Leta

 

(ch) Isiokwu     (d) isiahiri

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  1. Deputa usoro ato leta na – agbaso.

 

  1. Dee nkonke I he maka leta nkeonye.

 

  1. Degara nwanne gi ahu adighi leta iji si ya ndo.

 

  1. Deputa ihe ato di iche na eta Nkeonye na nke Anamachooru.

 

  1. Deputa ato onye na-ede leta Anamachooru aghaghi ide

 

36|Page

 

 

ORU NGWUCHA IZU UKA

 

Guo maka ntughari n’akwukwo Nchikota Akwukwu MAKA ULE SINIO Sekondiri nke Mazi A. I. Nze

 

PeJi 31 – 32

 

IHE OGUGU MAKE NKWADO IZUUKA OZO

 

Guo akwukwo Exam Focus maka WASSCE & JME nke Nolue Emenano et al Isi iri na ano maka Edemede Mgbagha.

 

 

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

 

Degara nne ni nna gi leta gwa ha ihe ndi di gi mkpa I chooro ka ha wetere gi n’ulo akwukwu.

 

 

 

AKWUKWO NLERE ANYA    
1) EXAM FOCUS IGBO maka WASSCE & JME
Nolue Emenanjo et al  
IZUUKA IRI (WEEK 10) UBOCHI——–
       
IHE OMUMU   ASUSU IGBO
KLAASI     SS 3
NDINAYA    
ISIOKWU EDEMEDE NKA  

 

NDINISIOKWU

 

  1. IKOWA IHE BU EDEMEDE NKA

 

  1. EDEMEDE NKA N’UDIDI AKUKO YA

 

  • AKUKO

 

IV.ABU

 

  1. EJIJE

 

 

VI.

 

VII.

 

 

URU EDEMEDE NKA BARA

 

NJIRIMARA EDEMEDE NKA

 

 

 

NKOWA IHE BU EDEMEDE NKA

 

37|Page

 

 

Edemede nka bu edemede ndi puru iche nke a na – agbaso iwu were ede. Edemede nka di iche n’edemede nkiti nke onye obula nwere ike imaba debe ngwa ngwa. Edemede nka di iche n’ihi na agaghi esi out esi ede akuko wee dee abu maobu si out e si ede akuko wee dee ejije. Edemede nka gunyere – abu, akuko na eiije.

 

EDEMEDE NKA N’UDI AKUKO

 

Akuko bu agumagu siri n’echiche puta nke na-eziputa ndu na obibi ya. Akuko a di n’udi n’udi. O nwere usoro a na-abaso mgbe a na – ede akuko. Agaghi esi out e si dee akuko wee dee abu maobu ejiye.

 

Edemede nka na-ewebuta atumatu mgbe a na-ede ya.

 

Eji ilu, akpaalaokwu, mburu, myiri nan di ozo mgbe a na-ede ya.

 

ABU: Abu bu edemede ozo eji nka ede. Ide abu nwere usoro na iwu na-achikwa ya. Ihe ndi ufodu eji ama abu bun di a:

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

  1. a) Abu na-enwe isiokwu.

 

  1. Asusu ya anaghi eto ogologo.

 

Ch)        O na-adi na nkebi na nkebi.

 

  1. Nghota ya na – adi omimi

 

  1. E nwere ike iji olu abughi Igbo izugbe wee dee abu.

 

Odide abu abughi ihe di mfe n’ihi ya o choro igbado anye.

 

EJIJE:

 

Ejije bu njije nke mmadu na-ejije ihe e kere eke. A na-eji nka ede ejije. Onye na-ede ejije ga – eso iwu e ji ede ejije.

 

  • na-enwe nkowa na mbido ya. A na-enwekwa aha ndi na-ejije ihe obula. A naenwekula obom ebe ndi a nwere usoro a na-agbaso wee ahazi ya.

 

URU EDEMEDE NKA BABA

 

 

38|Page

 

 

  1. O na-egosi ndiiche di n’etiti ya na edemede ndi ozo

 

  1. O na-eme ka otutu mmadu ghara idi na-ede udi edemede a.

 

  1. ch) O na-eweputa udo asusu anyi bu igbo.

 

  1. O na-eme ka onye na-agu agumagu chemi e echiche ime.

 

  1. O na-enye aka ikuziri umuakwukwu out e si ede ya.

 

NJIRIMARA EDEMEDE: NKA

 

  1. Edemede nka nwere usoro dabara adaba eji ede ya.

 

  1. Nghota ya anaghi adi mfe n’ihi ausu nka eji ede ya.

 

  1. Edemede nka na – akokuri maka ndu, ebimndu na akparamagwa.

 

  1. Odee nwere ike iko akuto ya n’uzo masiri ya.

 

  1. Udi edemede a na-arutu aka oge ihe mere.

 

 

 

NNWALE

 

  1. Edemede nka nwere udi ato kpoputa ha ato ma kowaa out.

 

 

  1. b) Kwuo ihe ato e ji ama edemede nka. ch) Abu, akuko na ejije. Oke nke na-adi na nkebi nkebi.

 

 

NCHIKOTA NNWALE 1.

 

Edemede Nka –

 

  1. abu, isiokwu na akuko

 

  1. b) abu, egije na okwuputa ch) akuko, abu na ejije.

 

  1. isiokwu, abu, akuko

 

  1. Edemede nka a na-ede na nkebi na nkebi bu –

 

  1. a) abu b) akuko             ch) Ejije na             d) isiokwu.

 

  1. Edemede nka a na-enwe ndi na-ejije ihe obula a na-eme nay a bu –

 

 

39|Page

 

 

  1. a) abu (b) ejije     (c) isiokwu           (d) akuko

 

  1. Otu n’ime ndi a abughi ejirimara edemede nka.

 

  1. O nwere usoro a na-agbaso na ya.

 

  1. O na-akokari maka akparamagwa na ebimundu udi mmadu.

 

  1. ch) O naghi enwe usoro a na-agbaso nay a.

 

  1. Odee nwere ike iko akuko ya n’uzo masiri ya. 5.

 

 

 

 

  1. Omenala Igbo

 

  1. b) Oja Dufuo Dike ch) Obidiya

 

  1. Nchikota ihe omumu nke asusu Igbo maka ule sinio sedondiri.

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  1. Kowaa na nkenke ihe bu edemede nka.

 

  1. Deputa ma kowaa udi edemede nka abuo

 

  1. Edemede nka bara uru. Deputa uru abuo edemede nka bara.

 

  1. O nwere ihe e ji ama edemede nka? Kpoputa abuo n’ime ha.

 

  1. Deputa usoro ato onye na-ede abu ga – agbaso.

 

 

 

 

ORU NGWUCHA IZUUKA.

 

GUO AKWUKWO AKUKO OJA DUFUO DIKE NKE MAZI RAY C. ANENE. ISI ASATO NA ITEOLU

 

 

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

 

Gue maka udi edemede ndi ozo

 

NCHIOKOTA IHE OMUMU NKE ASUSU IGBO MAKA ULE SINIO SEKONDIRI PEJI 115 – 117.

 

40|Page

 

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZU UKA

 

Deere enyi gin woke no n’ulo akwukwo ozo gwa ya ka obia emume asompi ulo na ulo ulo akwukwo o unu ga – eme ma onwa Maachi gbaa mkpuru abali iri n’out nafo 2014.

 

 

 

AKWUKWO NLERE ANYA

 

  • NCHIKO TA IHE OMUU NKE ASUSU IGBO MAKA ULE SINIO SEKONDIRI BY MAAZI M. C. NGOESI

 

  • NTUZIAKA MAKA UDAASUSU, UTOASUSU NA OMENALA IGBO NKE NDI SEKONDIRI UKWU NKE ABUO.

 

 

 

 

IZUUKA IRI NA OTU (WEEK 11) UBOCHI———
IHE OMUMU ASUSU IGBO  
KLASI SS 3  
ISIOKWU -NTUGHARI  
NDINISIOKWU      

 

I.NKOWA IHE BU NTUGHARI

 

  1. UDIDI NTUGHARI E NWERE

 

  • IHE MGBAKWASIUKWU N’USORO NTUGHARI

 

  1. NTUGHARI IGBO

 

 

 

 

 

 

NKOWA IHE BU TUGHARI

 

Ntughari bu iji out asusu we sugharia ihe di n’asusu ozo ka nghota ha abuo buru out. O bu onye mara asusu abuo ndi ahu nke oma ga-enwe ike tugharia ihe e kwuru ma obu ihe e dere.

 

E nwere udiri ntughari uzo ato:

 

  • Ntughari ahiriokwu naani (Translation of sentence)

 

 

41|Page

 

 

  • Ntughari odiniigha (Translation of prose passage).

 

  • Ntughari odinoogbara (Translation of verse).

 

Ntughari ga-enweriri out echiche, out nghota na out mputara ka ihe aaaana-atughari na ntughari wee buru out.

 

Usoro esi eme ntughari:

 

IHE MGBAKWASA UKWU MAKA NTUGHARI BU USORO NDIA:

 

  1. Buru uzo gugbado ihe e nyere ka a tugharia iji m ata echiche di nay a. Nke a ga-eme ka I new ike iji echiche ndi Igbo nke ya na echiche bekee ahu ga-abu out wee tugharia ya.s

 

  1. Imalite tughariwa ya di ka ha si di na nkeji ederede ahu diiche iche. Nkeji ole a gaenwe na ntughari gig a-abukwa nkeji ole e nwere n’ederede ahu e nyere.

 

  1. ch) Choputa okpurukpu okwu digasi nay a ma were asusu Igbo dabara nkeoma tugharia ha.

 

  1. Ebe ilu maobu akpaalaokwu bekee batara, were ilu maobu akpaalaokwu Igbo nke ya na nke ahu yiri n’echiche wee tugharia ha.

 

  1. Were okwuihu ma o bu okwu si mmadu n’onu puta were tugharia okwuihu.

 

  1. E nwee ahaaka dekwa ya out e si de ya na bekee maobu dee nsupe ya n’Igbo.

 

  1. Ebe e tinyere nzere n’aha mmadu dika Mr. Mrs. Dr. Wee gawazia, tinye ya nzere n’Igbo dika Maazi, Mzz; Odoziaku, Odz; Oriaku, Ork; Miss, Ada, Dr. Dkt dgz.

 

  1. gb) E nwee aha ego obodo ozo, deputa ya out ndi, obodo ahu si akpo ya ma kwue aha obodo

 

ahu. gh) Were nsupe Igbo wee dee oge digasi n’afo, aha onwa ma o bu aha iziuka. gw) Gu

 

gharia ntughari gi, nkeoma ka I dezie ihe ndi, idetachaghi out ha kwesiri.

 

Nnwale:

 

  1. Koaa ihe bu ntughari?

 

  1. Deputa usoro ano esi eme ntughari?

 

NTUGHARI N’IGBO

 

  1. Ntughari ahiriokwu naani: (Translation of sentence) Omumatu?

 

Horo nke bu ezi ntughari maka ahiriokwu ndia: “The cow has taken in”. E nwere ike inye osisa ndia:

 

  • Ehi ahu eburula ya baa n’ulo.

 

42|Page

 

 

  • Ehi ahu elomiela ya.

 

(CH)      Ehi ahu adidla ime.

 

  • E webaala ewu ahu n’ulo.

 

 

 

 

Ntughari nke dabakarisiri n’ime ndi a bu (CH) Ehi ahu adila ime.

 

“I            should have come there”. E nwere ike inye osisa ndia:

 

  • Aga m abia ebe ahu..

 

  • Agaara m abia ebe ahu.

 

(CH)      Aka m ga-abia ebe ahu.

 

  • Abiabula m ebe ahu.

 

 

 

 

Ntughari nke dabakarisiri n’ime ndi a bu

 

  • AGAARA M ABIA EBE AHU.

 

  • Ntughari Odiniigha (Translation of prose passage)

 

Nke a bu ederede nke ahiriokwu di naya anaghi ebidocha n’out ebe. Ha na-adigharisi

 

adighari; nke o bula ebido ebe nke ozo jidewere.

 

Omumatu:

 

Saul set off accompanied by three thousand soldiers chosen from Israel to search for David in the wilderness of Ziph. In the dark, David and Abishai made their way towards the force, where they found Saul lying asleep inside the camp, his spear stuck in the ground beside his head with Abner and the troops lying round him.

 

Lezie ntughari ederede a:

 

Soolu malitere ije duru ndi agha puku ato esi n’Izreeli hota iga n’oma agu Ziif icho Deviidi. N’ochichiri Deviidi na Abishai tuuru uzo gaa ebe ndi agha Soolu gbakoro, ebe ha huru Soolu ka o dina ehi ura n’ulo ndi agha, ube ya tumoro n’ala n’agiga isi ya, Abna nan di agha ndi ozo dinahube ya gburugburu.

 

  • Ntughari odinoogbara (Translation of Verse)

 

 

 

 

 

43|Page

 

 

  • bu ederede na-adi n’udi abu, nke a na-ede ka o di n’ogbara n’ogbaraa. Ogbara obula ga-ebido ebe ibe ya bi doro.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

Olee ebe     i. hapuru m aga?

 

Olee ndi    ii.    gi?

 

Nnwale:

 

 

 

 

  • “There is often student unrest in Nigeria”.

 

Nchikota Nnwale: Tumbo Tumbo

 

Horo nani out edeziri edezi.

 

  1. “Uche is the son of the soil” (A) Uche bu nwa nwoke ala mutara

 

(B)         Uche bu okpara nke ala ahu.

 

  • Uche bu nwa dara n’ala.

 

  1. Igbo language has many dialects

 

  • Asusu Igbo nwere otutu olumba.

 

  • Asusu Igbo nwere imirikiti mkpurumkpi.

 

(CH)     Asusu Igbo nwere otutu mkpuruedemede.

 

  • Ndi na-asu Igbo bara uba.

 

  1. It is easier said than done.

 

  • Okwukwu abughi omume

 

 

 

44|Page

 

 

  • Omume ka mfe karia okwukwu. (CH) O di mfe mgbe ana-ekwu, sie ike mgbe a na-eme

 

  • O ka mfe ikwu ekwu karia ime eme.

 

  1. You cannot correct evil with evil.

 

  • I gaghi edozinwu ihe ojoo.

 

  • A ghaghi oto achu onye ara.

 

(CH)     Ihe ojoo siri ike iji ihe ojoo we dozie.

 

  • O nwegh.

 

  1. Heaven is real, hell is real.

 

  • Eligwe no, okummuo anoghi

 

  • Eligwe di ire, okummuo di ire.

 

(CH)     Eluigwe na okummuo bu out.

 

  • O nweghi.

 

 

 

 

Edemede Nnwale:

 

Tugharia ederede bekee ndi a n’Igbo

 

  1. She took after her mother.

 

  1. A patient dog eats the fattest bon.

 

  1. A stitch in time saves nin

 

  1. Make hay while the sun shines.

 

  1. She took after her mother

 

Oru ngwucha izuuka.

 

Guo Nchikota Ihe Omumu nke Asusu Igbo

 

Maka ule sinio Sekondiri nke si n’aka

 

Maazi M. C. Ngoesi, ihu akwukwu out nari rue na out nari na iri na ato.

 

 

45|Page

 

 

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka ozo;

 

Tugharia abu a n’Igbo:

 

David,  the  Psalmist  said

 

The fool says in hhis heart

 

There is no God.

 

O Lord, how majestic is your nam in all the earth.

 

 

 

Ihe omume nke ngwucha izuuka

 

Deputa udiri ntughari ato enwere ma tugharikwa ederede ndi a;

 

  • God is good.

 

  • You should vote the right person.

 

(ch)       Leave everything to God.

 

 

 

Akwukwo nlere anya.

 

  1. Nchikota ihe omumu nke asusu Igbo maka ule Sinio Sekondiri nke si n’aka Maazi M. C.

 

Ngoesi Optimal Press Ltd.

 

 

 

  1. MMGHARI NA ULE

 

  1. ULE NA MMECHI

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

46|Page