IGBO LANGUAGE  SS 2 THIRD TERM

Table of Contents

 

                         THIRD TERM: E-LEARNING NOTES

   SUBJECT                                                                            CLASS SS 2

   SCHEME OF WORK                                       

   WEEK   TOPIC         

  1. Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga
  2. Ekwumekwu. Nzikorita ozi nke tekinuzu: (1) Uzo nzisa ozi:(i) keodinala di ka; okwuonu,ekwe,egbe

dgz (ii)keugbua  di  ka;ekwenti,redio,tiivii,nuzpepa,komputa dgz (2) Uru na oghom di na  izisa ozi

  1. Agumagu Odinaala-udi agumagu odinaala di iche iche dika;akuko

ifo,ilu,jije,abu,agwugwa,dg.2.odidi ha3.uru ha4.okuko na ogugu agumagu odinaala 4. Agumagu Odinaala-udi agumagu odinaala di iche iche ,Uru na Oghom di n’agumagu odinaala.

  1. Njirimara ndi Igbo—-Nsoala na Ibenne 1Mputara nsoala Ibenne 2.Etu esi emezi nsoala3 uru

ibenne  baara ndi Igbo

  1. Udaasusu- Mkpurudasusu(fonim), Udidi ya di iche iche (B)Etu esi akpoputa ha.(c)Ebe mkpoputa

ha.(d)  Nkejiokwu (e)myiri dika nkejiokwu.

  1. Ezumike nke nta.
  2. Agumagu ederede- Akwukwo agumagu ahoputara: 1. Ogugu akwukwo a hoputara 2. Nkowa isi ihe o na-ekwu maka ya 3. Mkpuruokwu/ahiri ufodu di n’ihe aguru 4. Agwa ufodu di n’ihe a guru 5. Uche umuaka banyere isiokwu na agwa ufodu
  3. Otu ogbo—Nkowa ya usoro obuba ya .uru na oghom di n’otu ogbo
  4. Ahiriokwu A) mputara ahiriokwu B udidi ya na omumatu ha.Njirimara ya.
  5. Echiche ndi Igbo banyere Eluuwa—Ogbanje,Ilouwa, Akaraogoli/ofeke
  6. Mmeghari na ule
  7. Ule na mmechi

 

IHE OMUMU                       –  ASUSU IGBO

IZUUKA                  –      Mbu(week 1)

KLASI                                    –  SSII

 

ISIOKWU                      –           Mmeghari ihi ndi a muru na

taam gara aga

NDINAYA

                     Akuko ifo iji Kpalite mmuo umuaka:

Akuko ifo anyi ga – ako bu akuko nwata nwanyi a na-akpo Onwuero – Onwuero bu nwata nwanyi mara mma.  Ndi mmadu choro ilu ya ma o juru.  Otu ubochi, azu ato-okpo, igbenu na Asa tughariri n’udi mmadu.  Ha gaara be onwu ero, sina ha biara ilu onwuero.

Ozigbo, onwuero kwere ka o huru azu Asa.

Onwuero kwere na o ga-eso lawa ozigbo.  Nne na nna ya siri ya hapu ka ha bia oge ozo.  Onwero isi, mba, agam eso ha laa ozigbo.

O soro ha laba ozigbo ma ka ha ruru otu ebe ha agwa ya na ha bu azu.  Ha kwara ya lawa.  O zigbo ha gbanwekwara n’udi azu.  Ha bidoro guwara ya egwu si.

Onwero Lawa shamara

Onwuero lawa shamara

Anyi bi n’okpo shamara

Okpo di n’okpo shamara

Onye gwuo o laa

Onye egwughi o nwuo shamara.

Onye guoro ya egwu, o daba na mmiri wee ruona Asa.

Asa gusia nke ya daba na mmiri

Onwero amaghizi ihe o ga-eme

O lotana nne na nna ya gwara ya chere ka ha bia ubochi ozo.

Isiike adighi mma.

 

IZU UKA  ABUO (WEEK 2)                                                                                        UBOCHI (DATE)

IHE OMUMU—-ASUSU IGBO

KLASI———-   SS2    

ISIOKWU-NZISA OZI

NDINAYA

i   Mputara nzisaozi na udidi ya

ii Uru izisa ozi bara

MPUTARA NZISAOZI NA UDIDI YA

Nzisaozi bu igwa mmadu ihe i bu n’obi i choro igwa ya site n’okwu onu, nke e nwere ike ikwu site na-ekwe, ekwe nti ma o bu n’ozi ide n’akwukwo.

UdidiMputara nzisaozi

Nzisaozi kereonwe uzo abuo ;keodinaala na keugbua

(i) keodinaala:-Nke a bu nzisaozi nke oge ochie.Ha bu; okwuonu, ogene, egbe, igba, ekwe, omu, oja wdg.

EGBE(GUN)

IGBA OCHIE (Early Drum)

Oja (flute)

 

 

(ii)keugbu a: Nke a bu ihe eji ezisaozi n’oge ugbu a.Imaatu;ekwenti(phone), igwe na-ekwu okwu (Radio) Onyonyo(TV), Nuzpepa, komputa, teles wdg.

EKWENTI(Cell Phone)                                                         Igwe na-ekwu okwu (RADIO)

 

 

 

ONYONYO (TELEVISION)

 

NUZPEPA (Newspaper)

 

KOMPUTA (computer)                             Poolu Nziza ozi (cell                                             phone tower)  

NNWALE

  1. Gini bu nzisaozi
  2. Deputa uzo di iche iche e nwere ike isi zisa ozi.

NDINISIOKWU ABUO ;URU IZISA OZI BARA

1.O na- eme ka mmadu na-amata ihe na-eme n’uwa

2.O na-egbochi mmefu ego; ebe mmadu gaara eji ukwu gaa,jiri ugboala ma    o bu ugboelu gaa mata ihe na-emenu,o ga-anozi be ya mata ya.

3.Nzisa ozi meziri uwa o dizia ka otu obere obodo.

4.Onye na-ezi ozi na-enweta nzaghachi ya ozugbo

5.O na-akwalite azumahia

6.O na-enye ohere inwete oru.

NNWALE

  1. Deputa uzo ise e si ezisa ozi ugbua

2 .Deputa uru ise di na nzisa ozi.

NCHIKOTA NNWALE

  1. Otu n’ime ndi a bu ihe nzisa ozi a na-etinyekari na nti (a)Igwe okwu (b)ekwe nti (c)ogene (d)teles
  2. —–ka e ji ezi ndi ochi agha ozi (a)Egbe (b)ekwe (c)opi ike (d)ogele
  3. —– ka e ji ezi umu okorobia na-agba mgba ozi (a) ekwe (b)egbe (c)opi ike (d) oja

4.—-abughi ihe nzisa ozi ogbara ohuu (a)ekwe nti (b)Redio (c)leta (d)okwu onu

  1. E ji —- agwa oha na eze okwu (a)okwu onu (b)ogene(c)redio (d)ekwe

EDEMEDE NNWALE

  1. Deputa ihe nzisa ozi keodinala abuo, ma kowaa etu e si eji ya eziza ozi.
  2. Deputa ihe nzisa ozi ogbara ohuu ato, ma kowaa etu e si eji ya ezisa ozi.
  3. N’ime ihe nzisa ozi, kedu nke na-agakari osiiso? Maka gini ka o ji ka ndi ozo aga osiiso?

4-Deputa uru ato di na nzisa ozi

5.Depute uzo abuo aga eji omu zisia ozi

ORU NGWUCHA IZUUKA –

Guo akwukwoIgbo maka junio sekondiri

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZOGuo mputara agumagu odinaala na udidi ya

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

Depute aha a na-akpo ihe nzisaozi ndia n’asusu bekee

AKWUKWO NLERE ANYA

1 EXAM FOCUS (IGBO MAKA WASSCE/JME )NKE NOLUE EMENANJO NA NDI OTU YA DERE2 NCHIKOTA AKWUKWO MAKA ULE NKE NZE A.I DERE

 

 

IZUUKA  Ato (WEEK 3 )                                                                                        UBOCHI (DATE)

IHE OMUMU—-ASUSU IGBO

KLASI———-   SS2                 

(ISIOKWU        Agumagu Odinaala

NDISIOKWU:

(A)Mputara na njirimara agumagu odinaala.

(B) udi agumagu odinaala  di iche iche .

(C).odidi ha

(D).uru ha

(E).Okuko na ogugu agumagu odinaala

 

 

MPUTARA  AGUMAGU ODINAALA

Agumagu odinaala bu agumagu na-enye nkowa banyere Igbo,ndi Igbo na ndu ndi Igbo.Malite mgbe e kere uwa a were ruo taa, ndi Igbo bu ndi nwere udiri akuko di iche iche banyere uwa ha.N’ihi nke a, a ga-asi na agumagu odinaala bu usoro akuko banyere mmalite ndu ndi Igbo,mmalite uwa ha,usoro obibi ndu ha,ka ha si ahuta uwa,echichi ha banyere uwa ha no n’ime ya,mmasi ha na nghota ha banyere uwa,ndu ha na kwa onwu ha n’ime uwa ha huru onwe ha na ya.Agumagu odinaala bu agumagu a guru n’oge ochie.E deghi ya n’akwukwo .O siri n’aka nna nna anyi ha were ruo anyi aka. E jighi akwukwo aguputa ya. O na adi n’udidi akuko,abu ma o bu ejije.

 

NJIRIMARA AGUMAGU ODINAALA

(i)E deghi ya ede n’oge ochie

(II)A maghi onye bidoro ya

( iii)A na ako ya n’onu

  1. iv) Amaghi afo o bidoro

v)O nweghi onye ma ebe o siri malite

  1. vi) A na akokari ya n’oge abali.

vii) O na adi mfe na nghota

.viii)O na abukari ihe gbasara ndi mmuo ,anumanu na mmadu.

ix)O na –enwe usoro

 

NNWALE

1 Gini bu agumagu odinaala?

2 Depute njirimara agumagu odinaala ato?

UDI AGUMAGU ODINAALA

E nwere udidi agumagu odinaala ato. Ha bu akuko, abu na ejije

AKUKO-Udidi  akuko e nwere n’agumagu  odinaala bu akuko ifo.

O bu akuko  a na – akoro umuaka n’oge ochie iji kuziere ha ihe.N’udidi akuko a umu anumanu na-ekwu okwu,na echi eze na aga ahia,na,eme nzuko,na-alu nwanyi.Ndi mmuo na ndi mmadu na enwekwa mmekorita.Ima atu

 MBE NA UMU EGBE

Chakpii woo!!

O ruru otu oge  , oke unwu  dara n’ala umu anumanu.Nke a mere ka umu anumanu were oso na-agbaje obodo nri di .Anu ndi na-efe efe na-efegaqa ebe ahu.Mbe enweghi ukwu isi nke o na-enwe nku.Mgbe o na-aga ije ya dika anu ndi ozo,] huru egbe abuo ka ha na-agafe.O rioro ha ka ha buru ya jee.Ha mere di ka o rioro ha.Mbe wee wete otu osisi siri ike si”otu onye jide n’akuku nke a,onye ozo n’akuku nke ozo”.Ha wee kwere.Mbe tagidere eze n’osisi ahu.Ha were buru ya felie ije n’obodo ukwu ahu nri di.Ha zutere otutu umu anumanu n’uzo.Mgbe ha huru Mbe n’elu,o gbara ha gharii ka ihe ebube nke a siri mee,na Mbe na-efe efe.Ha malitere juba onwe ha ajujusi “o bu Mbe n’eziokwu? Egbe unu nwere uche o unu tuputara aro nke a”Mgbe Mbe nuru nke a,iwe were ya na e bunyere Egbe otito karia ya onwe ya tuputara aro ahu.O wee saa ]n[ ya n’iwe ka o si ha na o bu ya tuputara aro ahu .O wee dapu daa tipiasia.

Ka Ahuhu na aga ije ya o huru Mbe ebe o dara.Mbe rioro ya ka o dukota ya.Ahuhu wee were ogwu ya dukota ya. Ka ahuhu gwara ya ka o nye ya ego ha kwekoritara,Mbe aju were anu dobie abuo were mkpuru aziza dukota ya si ya na ugwo na ugwo alaala,na ya adukotala ya otu o si dukota ya, bilie gaba ije ya.Nke a mere ahuhu ji adi ka e ji mkpuru aziza dukota ya.

(2). ABU

Abu bu usoro odinaala ndi gboo si egosiputa out obi di ha n’ihe ha no n’ime ya.N’ihi nke a,a ga-akowa abu di ka egwu di iche iche ndi Igbo chikobara iji were na akowa ma obu na egosiputa onodu di iche iche ha huru onwe ha na ya.Abu so n’otu udidi agumagu odinaala. E nwere  udi abu di iche iche n’agumagu odinaala dika:Abu nwa,Abu onwu,Abu Agha,Abu otuto,Abu Ikpe,Abu Akwamozu,Abu Nkocha,Abu Ejije.Ima atu

  1. ABU NGUGU NWA:

Onye tiri nwa na-ebe akwa

Egbe tiri nwa na-ebe akwa

Wete uziza,wete ose

Wete amara ngororo ofe

Ka umu nnunu racha aka

Ka okpotiti kpogbuo ya

O O egwu anyi

  1. ii. ABU ONWU:

Onwu bu onye ohi ——–ewo

Onwu bu onye ohi ozuru ogbalaba…..wdg.

iii.ABU AGHA:

Nzogbu nzogbu nzogbu………..enyi mba enyi

Nzogbu nwoke ……………………enyi mba  enyi

Nwoke ajoka………………………..enyi mba enyi

iv.ABU EJIJE:

Onye elere anya n’azu………..mmanwu anyi na-aga n’ilo

Onye elere anya n’azu…………mmanwu  anyi na-ilo.

 

(3). EJIJE

Aha ozo a na-akpo ya bu egwuregwu.Omumatu ya bu egwuregwu umuaka n’oge egwu onwa.Ima atu:

Okereke okereke———–dum dum yaya

Okoroafo okoroafo——- dum dum yaya

Kwenu o gana aga ———O gana aga nje m

O gana aga ———O gana aga nje m

Iwu anyi tiri——onye achina n’abuo

NNWALE

1 koo otu akuko ifo i maara?

.2 Depute otu abu odinaala

NCHIKOTA NWALE

1.Agumagu odinaala kere onwe  ya uzo ole?———–(a)ato (b)ano (c)ato (d)ise

2.N’akuko Mbe na Ezi,kedu ihe Ezi na acho ruo taa——-(a)ose (b)ube (c)okwute (d)ego

3.Otu n’ime ndi a bu  maka agumagu odinaala——-(a) e dere ya ede (b)a ma onye  dere ya (c)a na –agu ya oge o bula{d) A maghi onye bidoro ya .

4.Udidi akuko e nwere n’oge ochie ka a na –akpo———(a)Ugomma (b)utara (c)ifo (d)mbe

5.Nke bu abu agumagu odinaala bu—-(a)abu agha (b)abu uta (c)abu okoro (d)abu agboghobia

EDEMEDE NNWALE

1Depute agumagu odinaala kere onwe ya

2Kedu oge a na-akokari akuko Ifo

3kedu ndi a na-akoro akuko ifo

4Depute ihe I mutara n’akuko Mbe na Egbe

ORU NGWUCHA IZUUKA

Exam focus (igbo maka wassce/jme )nke nolue emenanjo na ndi otu ya DERE ihu akwukwo nke otu nari na iri na itolu (pg119)

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

Guo ma choputa uru e nwere n’agumagu odinaala

AKWUKWO NLERE ANYA

1 EXAM FOCUS (IGBO MAKA WASSCE/JME )NKE NOLUE EMENANJO NA NDI OTU YA DERE

2 NCHIKOTA AKWUKWO MAKA ULE NKE NZE A.I DERE

 

 

IZU  ANO  (WEEK 4)                                                  UBOCHI

IHE OMUMU—–ASUSU IGBO                  

KLASI——SS2

ISIOKWU AGUMAGU ODINAALA.

NDINISIOKWU:

 (A).ODIDI HA

(B).URU  NA OGHOM  DI N’AGUMAGU ODINAALA

 (C).OKUKO AGUMAGU ODINAALA.

 ODIDI AGUMAGU ODINAALA

Anyi ekwuola  na agumagu odinaala kere onwe ya uzo ato;akuko,abu na ejije . Ndi a  bu odidi ha;

A bia na Akuko,e nwere,

(i)akuko ifo,

(ii)Akuko iduu na oba

(ii)Akuko mmalite                                                                                                                                                          (iv)Ukabuilu

(v)Gwa m gwa m gwa m

(vi)Akuko ihe mere eme

ABU

(i)Abu otito

(ii)Abummemme /odinaala

(iii)Abu ifo

(iv)Abu mmekorita

(v)Abu ikpe okwu

(vi)Abu nwa ji arahu ura

(vii)Abu akwa ariri

(viii)Okwu mgbawa onu

(ix)Abu akwamuozu

(x)Ima mbem

(xi)Abu ofufe

 

Ejije/egwuregwu

(i)Egwuregwu mmemme

(ii)Egwuregwu metutara umuaka

(iii)Nkupute nwa

(iv)Egwu mmanwu

(v)Egwu onwa/egwu ilu nwanyi

(vi)Igo oji na egwu oru

NNWALE

1depute aha abu odinaala ato i maara

2Gosi ejije odinaala ato i maara

URU  DI N’ AGUMAGU ODINAALA

(1)  O na- enye ma ndi  na-ako ya,ndi na-ede ya na kwa ndi na-edere ya ma o bu ndi na-agu ya obi uto.

(2)  A na-esi na ya were mata maka agba ochie na oge gboo.

(3) O na-enye aka imata ihe gbasara omenaala na odinaala ndi.

(4) O na-eme ka umuaka muta ka esi ahazi akuko,ka esi ako akuko,ka esi ede akuko,na kwa ka e si agu akuko.

(5)  O na-enye aka imata ihe banyere obodo,mba na kwa otu ndu ndi,siri were di.

 

OGHOM DI N’AGUMAGU ODINAALA

 

(1) O na-eme I ka mmadu meruo ahu

(2) A na-ebute ikpo azi

(3) O na eme ka egwu tuo umuaka

(4) O na-ebute igwo igwo ogwu

 

NNWALE

(1) Gosi uru ato a na-enwete n’agumagu  odinaala?

(2) Depute oghom ato di n’agumagu odinaala?

OKUKO  AGUMAGU ODINAALA

AGWUGWA.

Agwugwa bu okwu ndi igbo ji enye onwe ha ozuzu. O bu okwu a na- echemiri echiche ime tupu a zaa ya, ma a juo ya. Agwugwa bu ihe a naghi aza n’otu ahu e siri juo ya. Onye ajuru ya ga-aru uche ya uka nke oma tupu o zaa ya. Aha ozo a na akpo ya bu gwam gwam gwam .

Omumaatu

GWA M GWAM GWA M                                           AZIZA

  1. Gwa m okuko ocha di n’obi eze Arusi
  2. Gwa onwere uru enweghi okpukpu ji
  3. Gwa m ono n’elu na- abara n’ala mba Egbe eluigwe
  4. Gwa m agboghobia ubi ji Nte
  5. Gwa m o no na mba agwa mba okwu Egbe (Gun)
  6. Gwa m ihe no na mmiri, ji osisi asa ahu Eze (Teeth)
  7. Gwa m oku din a mba na- eghere mba nri Asusu
  8. Gwa m ogaranya ukwu aja Awo
  9. Gwa m agbogho otu ntu ime Unere (Jioko)

ILU (PROVERB)

Ilu bu okwu a na- echemiri echiche ime tupu a ghota ihe o putara. O bu otu ahu onye nuru ya sisri nu ya, ma o bu out onye kwuru ya siri kwuo ya ka nghota ya siri

  1. N’ihi nke a ilu na- abu okwu miriemi na- acho nkowa miriemi.

Omumaatu

ILU                                                                                     NKOWA YA

  1. O bu otu aka ha nwaanyi ka o o bu otu ike mmadu ha ka

na- atukwasa di ya.                                     o na- emeru ihe.

  1. Isi kote ebu o gbaa ya ihe onye choro ka o na- ahu
  2. Agbusi gbaa otule o muru ako ihe mee mmadu omara ihe

Agadi nwaanyi anaghi aka nka na- egwu      mmadu anaghi echefu ihe    o maara agba.                                                                o maara eme nke oma echefu

NNWALE

1Deputa ilu ato i maara ?

2 Gwam ihe mere eze jiri rachaa ntu?

3 Ihe kuru mmiri rigoo elu?

NCHIKOTA NNWALE

1Olee nke abughi agumagu  odinaala (a)ejije (b)akuko (c)imu nwa (d)abu.

2Gwam otigbu nwata n’ihu nne ya?—- ?——-(a)ube (b)eze (c)aguu (d)utari

3Nnu na mmanu ndi Igbo ji eri okwu bu——–(okwu (b)anu (c)ilu (d)mmanu.

4Oghom di n’agumagu  odinaala bu na o na-ebute?———-(a)igwo ogwu (b)amamihe (c)obi uto (d)inwe ego

5Gwam ihe buru okwute lagoo elu———-(a)okwuru bekee(b)aja (c)ngwere(d)mbe

EDEMEDE NNWALE

1.Gini bu agwugwa

2.Kowaa mputara ilu ato

3.Depute udidi akuko odinaala ato

4.Aha ozo a na-akpo ejije bu gini

5.Isi kote Ebu,kedu ihe ga eme ya

ORU NGWUCHA IZUUKA

Exam focus (igbo maka wassce/jme )nke nolue emenanjo na ndi otu ya DERE ihu akwukwo nke otu nari na iri na itolu (pg119)

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

Kedu ndi bu ndi Igbo

AKWUKWO NLERE ANYA

1 EXAM FOCUS (IGBO MAKA WASSCE/JME )NKE NOLUE EMENANJO NA NDI OTU YA DERE

2 NCHIKOTA AKWUKWO MAKA ULE NKE NZE A.I DERE

 

 

 

IZUUKA NKE ISE (5)

IHE OMUMU   ASUSU IGBO

KLASI   –           S S 2

ISIOKWU         NJIRIMARA NDI IGBO

NDISIOKWU: 1. Nkowa Nsoala, Ibenne

  1. Otu Esi Emezi Nsoala

NDINISIOKWU MBU—NSOALA

Nsoala bu mmadu ime ihe ndi igbo na-aso aso.  Mmadu ime ihe ndi Igbo na-agbaru ihu ma ha nu ya.  N’ala igbo ufodu ihe ndi bu nsoala maobu aru n’ala igbo bu ndi a

  1. Nwanyi di ya nwuru Ino na mkpe turu ime
  2. Mmadu izu ohi ji.
  3. Nwata nwa agboghobia ituru ime mkpuke.
  4. Nwa ohuu ibu uzo puo ezeelu.
  5. Okuko ikwa akwa n’abali.
  6. Ewu ibata ebe a kwara dike
  7. Nwanyi iwa akwa n’ala igbo, iwa akwa na-eme mmadu ka onye puru odu.
  8. Mmadu igbu mmadu.
  9. Nwanyi imu ejima bu nsoala.
  10. Mmadu ikwu udo/igbu onwe ya.
  11. Mmadu ikpudo ihu n’ala nwuo.
  12. Nwanyi Iri elu nkwu maobu oji.
  13. Nwanyi itutu oji n’ala.
  14. Nwanyi igo oji.
  15. Nwa iji ukwu puta.
  16. Mmadu igbu ihe dika eke, enwe dgz.

 

IBENNE:-  Ibenne bu anu di iche iche nke ndi mmadu na – asopuru kika chi ha.  Obodo di iche iche nwere Ibeene ha di iche iche.  Ibenne bu anu obodo na-ehi Obodo ufodu na ibeene ha maobu anu ha na-asopuru/ehi.

(1) UMUOMUMU MBIERI-EWI.

Ndi umu omu Mbieri anaghi eri Ewi.  Ha na-asopuru ya maka ha kwere na o bu ibeene ha.  Aga-achoputa n’obodo na-ehi anu ndia.

UMUEMI NGO:- Ndi Ngo nke di n’Imo Steti anaghi egbu maobu eri Agu.

UMUCHU di na Aguata –: Ndi Umuchu nke di n’Aguata anaghi egbu maobu eri eke.  Eke bata n’ulo gi agaghi egbu ya.

IHETENANSA di na Njaba – Eke Ndi Ihetenansa di n’Olu anaghi kwa egbu eke.  Ha na – asopuru anu ndi a.  Onye gburu anu ndi a ga-eme ihe di egwu di ka ili ya iji nwere onwe ya.

 

AWKA – Anambra Steti.

Ndi Oka di na Anambra Steti anaghi eri maobu egbu enwe.  Ndi biara abia n’oka anaghikwa egbu ya iji wezuga onwe ha na nsogbu ndi obodo.

 

OTU ESI EMEZI NSOALA

E nwere otu esi emezi nso ala n’ala igbo.  N’ala igbo o na-abu:

(1)IGBU MMADU MAOBU IGBU OCHU – Onye gburu mmadu ga-agba oso ochu.  Onye ahu ga-esi n’obodo pup ihe dika afo ato maobu ise  dika ha siri mee ya.  O dikwa otu n’ebe umu  Israel no. O nwereike luo nwanyi iji kwuo ugwo onye o gburu.  Onwere ike kponye mmadu.

2.IZU OHI:  Onye zuru o hi n’ala Igbo ga-emecha ahu ‘Imecha ahu’ bu ikwu nha a ga-ada ya.  Ndi di iche iche ga-ada ya nha tupu ahapu ya.

Ndi umunna, ndi otu ogbo, na ndi otu nile ono na-ada ya nha.  O buru onye ozo ndi ozo ga-ada ya nha nke ha.

3.IPU EZEELU – Nwata puru ezeelu, a na-egbu ya egbu.

4.IMU EJIMA: A na-egbu umu ejima ndi ahu egbu.  N’ala anyi otutu ndi muru umu ejima mgbe, gboo egbusiri ha tupu nwanyi ocha akporo Mary Sleso abia were kwusi igbu umu ejima.

5.OKUKO IKWA AKWA:  O buru na okuko akwa akwa n’abali, a ga-egbu ya egbu dgz.

NNWALE

  1. Olee aha nwanyi ala Bekee kwusiri igbu umu ejima n’ala anyi?
  2. Deputa ufodu nsoala e nwere n’ala igbo.
  3. Dee otu e si emezi nsoala onye gburu mmadu n’ala igbo?

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Obodo na-akpo, anu ha na asopuru (a) Agu  (b) Ibeene    (ch) Ibena   (d) eke.
  2. Ibeene ndi Awka di n’Anambra Steti bu –(a) agu (b) eke   (c) Ngwere  (d) enwe.
  3. Nwata ibu uzo pup Ezeelu bu – (a) Ibeene (b) Nsoala   (c) oso ochu   (d) osonne.
  4. Nwanyi mere ka a kwusi igbu umu ejima bu – (a) Florence Koma (b) Mery Joh   (ch) Magi Sleso   (d) Mary Sleso.
  5. Ibeene ndi Umuchu nke di n’Aguta bu – (a) eke (b) Agwo   (ch) agu   (d) ele.

 

EDEMEDE NWALE

  1. Gini bu igbu ochu?
  2. Dee ihe abuo ga-eme ka udo di n’etiti onye gburu mmadu na ezinulo o gburu nwanne ha?
  3. Gini by nsoala?
  4. Deputa aru ise metutara madu maobu mmadu na-eme.

5.Kowaa ihe bu mmadu ipu eze elu.

ORU NGWUCHA IZUUKA

Guo akwukwo Exam Focus

IGBO maka WASSCE and JME nke Nolue Emenanjo et al page 150 – 152.

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OHURU

Choputa ihe bu nsoala na ibeene ndi obodo gi.

AKWUKWO NLERE ANYA

Exam Focus

IGBO MAKA WASSCE

Na JME nke Nolue Emenanjo et al.

 

 

IZU  ISII  (WEEK 6)                                                  UBOCHI

IHE OMUMU—–ASUSU IGBO                  

KLASI——SS2                               

ISIOKWU—-NKOWA IHE BU UDAASUSU

NDISIOKWU

  1. Nkowa ihe bu udaasusu na udidi ya,ogan okwu na udaume
  2. Ndakorita udaume na udidi ya.

3.Mputara mgbochiume.

4.Njirimara mgbochiume

5.Myiriudaume.

6.Iwu ndagba myiriudaume

Nkowa ihe bu udaasusu,ogan okwu na udaume

Udaasusu bu mputara mkpoputa mkpuru edemede asusu o bula dika asusu igbo mgbe anyi na-ekwu maka mkpuru edemede, ihe anyi na-ekiri bu mkpuru abidii mkpuru edemede (abidii) enwere n’asusu igbo izugbe bu ndia.

 

 

A       B        CH     D       E        F     G      GB     GH    GW 

H        I       I    J         K       KP    KW    L        M       N

Ñ       NW    NY     O       O       P       R       S       SH     T      

U       U       V       W       Y       Z   (iri atona isii) Anyi ga-ahuta na asusu igbo enweghi (x, q) O idighi ka mkpuru edemede nke asusu Bekee.

OGAN OKWU:

Ogan okwu bu akuku ahu ndi ahu na-enyere anyi aka ikpoputa  uda okwu obula.  Akuku ahu ndi a bu –eze, ire, imi, egbugbere onu, akpo akpa ikuku na oghere akpiri.  E nwere ike ikpokwa ogan okwu njiakpo.  E kere njiakpo uzo abuo:-  Njiakpoike na njiakpojuu.

  • Njiakpo ike – bu njiakpo/akuku ahu ndi na-emeghari ahu mgbe a na-akpoputa okwu igbo. Njiakpo ndi ahu-eze ala, egbugbere onu ala, ire na odu akpo.

 

Njiakpo ndi anaghi emeghari ahu mgbe a na-akpoputa uda.  Ndi bu njiakpojuu bu ndi a – egbugbereonu, elu, eze elu, anyuru na akpo nnoko njiakpo. O bu mgbe njiakpo abuo ndi a biakotara onu wee meputa uda nwere nnoko mkpachi.

Nnoko mkpaghe na –abu mgbe ha abuo emetughi onwe ha.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

OGANOKWU/NJIAKPO

The Organs of Speech

1-nasal cavity
2-lips
3-teeth
4-aveolar ridge
5-hard palate
6-velum (soft palate)
7-uvula
8-apex (tip) of tongue
9-blade (front) of tongue
10-dorsum (back) of tongue
11-oral cavity
12-pharynx
13-epiglottis
14-larynx
15-vocal cords
16-trachea
17-esophagus

 

UDAUME IGBO

Udaume bu mkpuruedemede na-amalite okwu igbo.  O bu mkpuruudasusu eji nkupute ume akpoputa n’enweghi mgbochi n’oghere onu.  Udaume di asato.  Ha bu a  e i  \ o ]  u [.

Ihe osise chaati udaume

NWALE –

  • Gini ka udaasusu putara?
  • Ole ka mkpuruedemede /abidii Igbo di?
  • Aha ozo a ga –akpo ogan okwu bu-
  • Njiakpo ole ka e nwere?
  • Kpoputa akuku ahu abuo mebere njiakpo ike.

 

NDAKORITA UDAUME NA UDIDI YA

Ndakorita udaume bu iwu na-egosi na udaume na-agako onu n’okwu dika ha siri noro  na otu A na out E.  Udaume Igbo  bu A E  I  IOO  U U

Udaume ndi a ka e kere n’otu A na otu E.

Otu A – Ha bu mkpuru edemede ndi nwere ntupo n’okpuru na A.  – A I O U

Otu E’ – Ha bu mkpuruedemede ndi ahu enweghi kipom n’okpuru ha na E _ EIO U.

Ndarita udaume na-egosi na o buru na anyi na –ede okwu igbo ,mkpuruedemde bidoro okwu ahu si n’otu A, mata na mkpuru-edemede ndi ozo ga-eso na ha ga –abukwa n otu ahu

di ka – Otu A – aka

aki

anya

 

Out A ‘}’ –    {o}

 

okpa

ocha

otu A ‘{‘   – {u}

ugbo

ulo

Otu A (i)      igba

Ichaka

Ikpa

 

Otu ‘E’ EIOU

Otu O di n’otu ‘A’ ka o ga-adikwa na nke ‘E’

Dika Otu ‘E’ E – eze

ego

‘i’ – Iko

  • Igbe
  • Ite
  • Ire
  • Igbo

O – Ozu

  • Obe
  • Olu
  • Okwu

 

U –  uze

  • ube
  • ule
  • ukwe

 

 

MPUTARA MGBOCHIUME.

Mgbochiume bu mikpuru udaasusu na-enwe mgbochi ikuku mgbe a na – akpoputa ya. Mgbo chiume igbo di iri abuo na asato Ha bu ndia – b ch d f gb gh gw h j l k kp kw l m n n nw ny p r sh t v w, y z.  E wepu udaume asato nime mkpuru edemede iri ato na isii nke fodurumi buzi mgbochiume.  Mgbochiume di abuo

  • MGBOCHIUME MKPI ch gbo gh gw kp kw nw ny sh

Ha di iteolu/iteghete n’omu ogugu

  • MGBOCHIUME NGE: Mgbochiume nge bun di a – b d f g h j k l m n n p r s t v w y z. mgbochume nge id irina iteolu (19)Cha ati mgbochiume

 

 

 

A na-emeputa uda mgbochi-ume mgbe eji onu meputa uda site na mmetuta njiakpo ike na njiakpojuu ihe eji akpoputa mgbochiume bu nnoko nkpachi.

 

NJIRIMARA MGBOCHIUME IGBO

 

  • Ha di iri abuo na asato.
  • Mgbochiume anaghi ebu akara udaolu
  • Eji nnoko mkpachi akpoputa mgbochiume nice.
  • O naghi enwe uda aka ya.
  • O naghi esorita onwe ya n’ahiri-okwu

MYIRIUDAUME IGBO

Myiriudaume bu mkpuru udaasusu ‘m’ na ’n’ mgbe ha kpara agwa dika udaume. Myiriudanme na-enwe udaaka ya.  A na-emeputa myiriudaume igb site n’isi n’imi kuru ume. Myiriudaume na-ebukwa akaraudaolu.  Aga m asi na myiriudaume igbo na-eme ihe obula udaume na-eme.

IWU NDAGBA MYIRIUDAUME

Iwu a na-egosimgbochiume ndi nwere ike iso myiriudaume ‘m’.

(ii) O na-egosikwa mgbochiume ndi nwere ike iso myirudaume ‘n’ Mgbochiume ndi nwere ike iso myirudume ‘m’ bu – b, gb, m, kp, p, f, v, w, y.  mgbochiume ndi na-eso mgiriudaume ‘m’ di iteolu.

Omuma atu- muo, mgba, mmadu mpu, mfepu, Mgbochinwe ndi na-eso mgbochiume ‘n’. Ha bun di a – ch, g, gh, gw, h, l, k, kw, l, n, n nw ny, r, s, sh t z.

Omuma atu mgbochiume ndi nwere nyiriudaume ‘n’.

Ncha, nganga, njiko, ngosi, ngwere, nche, ndo dgz.

NKEJIOKWU Nkejiokwu na-egosiputa nkebi ole mkpuruokwu obula di.  Nkejiokwu na-enye aka imata uda olu ole okwu nwere ike ibu. Myiriudaume na udaume na-egosiputa akaraudaolu ga-adi n’okwu.  Nkejiokwu na nkume na-adakorita.

Usoro nkejiokwu  na-adi out maobu agbaso usoro ndi a

CV = ri, go, pu

vcv=ala,aka, ike, ele

cvcv=qere, bete ,

cvcvcv=cheqube,kpok]ta, welata.

NCVCVCV =NCHEQUBE,nzuk]ta,

1 oqu Igbo ndi nwere otu nkeji —di,gi,ha,ma,de

2  oqu Igbo ndi nwere  nkeji ab[]–aka,anya,ele igbe

3oqu Igbo ndi nwere  nkeji at]–at[ru,ekike,[b]chi

oqu Igbo ndi nwere  nkeji an]–ncheqube,njerita

NJIRIMARA NKEJIOKWU

1Ona-egosipute myiri[daume ma o bu udaume ole di n’okwu

2} na-egosi akara udaolu ole oqu ga-enwe

nchik]ta nnwale

1.Myiriudaume Igbo na-enwe —–a,nn]k] mkpachi b,nn]k] mkpaghe c,nn]k] mgbochi d,nn]k] mgbochiume

2 Otu na ndi a bu mgbochiume mkpi——-a,gb  b,tu,c fv d sz

3–bu udaike ndaputa——-a,p gb b,p b c,f v d,sz

4 –na-egosipute nkebi ole oqu Igbo di—–a,nkejioqu b,ahirioqu c,nkebioqu d,nkebiahirioqu.

Mgbochiume mkpi di———-a,iri ab[] b,iri na otu c,itoolu d,iri na itoolu.

 

EDEMEDE NNWALE

1.Gini bu mgbochiume?

2.Depute mgbochiume mkpi e nwere?

3’Kowaa ihe bu nkejiokwu?

4.Depute mkpuruoqu an] nwere nkejiokwu abuo?

5’Kpoputa oqu abuo eji eze na egbugbereonu a kpoputa?

OKWU E NWEGHI NDAKORITA UDAUME.

Ufodu okwu a naghi enwe ndakorita udaume bu – soja, wago, ashawo, agidi, agboro okwu ndi a nile bu okwu ndi ebitere ebite.  Ha bu okun mbibi.  Ha si ‘n’ asusu ozo bia buru okun Igbo.

(ii) Ndi ozo bu okwu abuo di iche iche a na-edeko onu di ka otun okwu.  Omuma atu –

We + Pu                wepu

Di  + nta            dinta

Zu  + koo           zukoo

(iii) okwu utodu sitere n’olumba dk. Akupe, olomo, ase dgz.

 

UDAOLU

Nasusu Igbo,e nwere udi akara udaolu ato eji ezipute udi uda ato eji akpoputa mkpuruokwu Igbo.Ha bu ndi a

AKARA UDAELU /

AKARA UDAALA  \

AKARA NSUDA  —

O bu nani udaume  na myiriudaume na –ebu akara udaolun’asusu igbo

A na etinye akara udaolu na nkejiokwu na nkejiokwu

Udansuda anaghi esote udaolu

Imaatu—

Udaelu na udaelu

Aka—–hand              //

Egwu —–dance         //

Akpu——cassava      //

Udaala na udaala

Akpa —–bag       \     \

ala ——-land      \      \

enwe—— monkey  \    \

Udaelu na udansuda

Mma——beauty           /   ——-

Ego———money          / ——

Oche——-chair           /  ——-

Udaelu na udaala

Akwa—-cloth      /  \

Ncha —–soap     /     \

Oge  ——-time              /      \

Udaala naudaelu

Aqa —egg           \   /

Ncha—-nothing        \ /

Ude—–cream\  /

 

NNWALE:

1.Gini bu ndakorita udaume

2.Depute okwu agbasoghi iwu ndakorita udaume

3.Nye omumaatu okwu nwere udaelu,udaala na udansuda.

 

NCHIKOTA NNWALE

Njiakpo bu  –  (a) Nkejiasusu Igbo

(b) Udaume Igbo

(ch) Akuku ahu eji akpoputa igbo

(d) Akuku ahu eji ede igbo.

(2) Udaume Igbo di  – (a) iri ato na isii

(b) iri ano ni ise (ch) iri abuo na asato  (ch) Asato.

(3) Njiakpoike bu  –  (a) Ezeala, ire, oduakpo, egbugbereonu ala.

(b)Eze ala, ire, anyuru, egbugbere onu ala  (ch) egbugbereonue elu, oduakpo, ire na eze.  (d) ire, eze, oduakpo na anyuru

(4) Okwu dakoro omi bu – (a) akamu, (b) akwukwo, isi, ego.  (ch) imi, ego, eze, ele (d) agboro, akamu, ede na egbe.

(5) Mkpuruedemede Igbo di-

(a) Iri abuo na asato (b) iri ato na ise  (ch) iri anon a ise (d) iri ato na isii.

 

IHE OMUME NGWUSI IZUUKA

Guo Nchukota Akwukwo Maka Ule sinio sekondiri (correct steps) by A.I. Nze Pages 2 and 3

PRE-Reading assignment Read up Mgbochiume na myiriudaume.

 

IHE ORURU IZU UKA

Deputa mkpuru okwu ano ano na- ego siputa ndakorita udaume.  Dee ha otu a – AOIUE I O U

 

AKWUKWO NLERE ANYA

Nchikota akwukwo maka ule sinio sekondiri (correct steps)

Exam focus IGBO maka WASSCE & JME by NOlue emenanjo etal.

 

 

 

 

 

IZU  ASAto (WEEK 8)                                                  UBOCHI

IHE OMUMU: ASUSU IGBO                      

KLAASI: SS 2

ISIOKWU: AKWUKWO AGUMAGU AHOPUTARA”OKA MGBA”

 

NDISIOKWU

  1. Usoro a na-agbaso mgbe a na-enyocha akwukwo
  2. Nkowa agumagu edereede

 

USORO A NA-AGBASO MGBE  A NA-ENYOCHA AKWUKWO.

Ihe mgbakwasi ukwu:

1.Aha Akwukwo:

Aha akwukwo bu ihe izizi onye na-atule akwukwo ga-akowaputa.O ga-akpo aha  akwukwo.

2.Aha ode akwukwo:

Oga-akpotukwa aha onye dere akwukwo,ma kowakwaa nkenke akuko banyere ndu onye ahu ma buru na o maara ya.

3.Afo mbiputa na ndi biri ya:

Onye nyocha  ga-akowaputa afo e jiri wee biputa ya,ulooru biputara ya.

  1. Ntoala akwukwo:

Mgbe a na-akowaputa ihe gbasara ntoala akwukwo,ihe ndi di mkpa bu:(i) Ebe (ii) Oge.(iii) Ndi e bu n’ uche dee ya.

5.Isiokwu:

Olee ihe akwukwo na ekwu maka ya,kedu out ihe maobu ihe ndi bu okpurukpuokwu akuko ya ?

6.Nchikota akuko:

N’uzo mkpirisi.e dee ihe akwukwo na-ako maka ya?

7.Nhazi di n’akuko:

Olee otu ode akwukwo siri hazie akuko ya?O haziri ha n’isi? Kedu otu isi obula na ibe ya siri jikota?Kedu ka akuko siri noo n’isi n’isi? (plot)

8.Akparamaagwa:

Olee ndi a kpoo aha n’agumagu?Kedu otu agwa ha siri diri? Ihe ode kwuru maka onye ahu,ihe onye ahu kwuuru onwe ya,ihe ndi ozo no n’akuko ahu kwuru maka ya,na ihe onye nnyocha kpebiri n’echiche nke aka ya.

9.Omenaala na nkwenye ndi putara ihe:

Ana-arutu aka n’omenaala;nkwenye di iche iche na ofufe ndu.

10.Ihe ojoo di iche iche:

Ana-arutukwa aka ihe ndi oha na eze na-agbaruru ihu.(Ihe ojoo di iche iche).O nwere echiche na-ezighi ezi odeakwukwo gosiputara?

11.Asusu nka:

N’ebe a,a na-enyocha otu ode si webatasia atumatu okwu di iche iche dika: ilu,akpaalaokwu,ukabuilu,mburu,odika,ntakwu w.d.g.Kedu ka odeakwukwo siri dee ya?

12.Ihe mmuta:

Olee ihe ode choro ka si n’agumagu ya muta?

NNWALE

  1. Kpoputa ihe izizi a na-ahu na-inyocha akwukwo
  2. Ole afo akwukwo a putara
  3. Olee mgbe ebighariri ya?

 

 

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Otu ihe a na-atule mgbe a na-enyocha akwukwo bu…… (a)ego (b)mmad[(ch) ntoala (d) obi ojoo
  2. Omenaala p[tara ihe n’akwukwo a.

(a) iyi (b) iwa akwa (ch) igba alukwaghi m (d) iru mgbede

  1. Aha obodo putara ihe nay a bu——-(a) }ka (b) nteje (ch) }niche (d) awusa

 

EDEMEDE NNWALE

  1. Deputa ihe ato a na-atule mgbe a na-enyocha akwukwo agumagu
  2. Dee nke nke edemede maka agwa abuo din a akwukwo a.

IHE OMUME NGWUCHA IZUUKA

Kowaa agwa kachara puta ihe.

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA

Guo akwukwo a ma were omuwaatu enyere gi mee nyocha di dabara adaba.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

Guo  akwukwo NKE M JIKA Isi nke abuo

AKWUKWO NLERE ANYA

NKE M JIKA WAEC edition nke Nwaozuzu G.I

 

 

 

 

                                                                                                      

 

IZUUKA ITOOLU

IHE OMUMU                           –           ASUSU IGBO

KLASI                                       –           SS2

ISIOKWU         – OTU OGBO/EBIRI

NDISIOKWU

(i)         Nkowa, usoro obuba ya

(ii)        Uru na oghom di na ya.

NKOWA IHE BU  OUT OGBO/EBIRI.

Otu ogbo bu otu ndi amuru n’otu afo ma obu afo abuo maobu ato.Obodo ufodu na-achiko ndi amuru site n’otu afo ruo afo ato maobu ano onu.

Ebe ufodu, ndi umu nwoke na ndi umunwanyi na-emeko otu ogbo onu.  Ufodu na-emekwa nke ha iche iche.Otu ogbo obula na-enwe iwu na-achi ha.

Otu ogbo na-enye aka na nchikota na mmepe obodo ha.  Otu ogbo di iche iche enwere n’ala Igbo.

Otu Awuriso, otu igwebuke, otu Iruka otu Ifeadigo dgz.

 

USORO E SI ABA OTU  OGBO

E nwere usoro esi aba otu ogbo.Onye obula na-aba otu a, ga-agbaso usoro ahu.

  1. Onye ahu ga-akwu ego ole a gwara ya.
  2. O ga-elute mmanya ndi otu ogbo ha ga-ax[.
  3. Di ya ga-edute ya n’ogbak][b]chi ahu iji ngosi ndonye ukwu.
  4. Nwanyi ahu ga–aburiri onye lurula di maka nwa agbogho anaghi eso n’otu ogbo.
  5. O ga-ekweta idebe iwu otu nke a ga-aguru ya.

 

NNWALE

  1. Gini bu otu ogbo?
  2. Kpoputa aha otu ogbo e nwere n’ala gi.
  3. Olee ihe mere di nwanyi na-abata ohuru ga-eji soro nwunye ya bia ubochi ahu?

 

NDINISIOKWU ABUO

Otu ogbo di ka anyi koro na mbu bu otu ndi amuru n’ihe dika afo abuo ruo na ato nke jikoro onwe ha onu iso nye aka maka mmepe obodo ha. Otu ogbo  nwere uru o na-abara ndi obodo.

URU OTU OGBO BARA

  1. Otu ogbo na-enye aka na mmepe obodo.
  2. Ha na-edozi okwu n’obodo.
  3. Ha na-eli onye otu ha nwuru anwu.
  4. Ha na-enyere onye out aka.
  5. Ha na-enyeere umu onye otu nwuru anwu aka.
  6. Ha na-eweta ogaanihu n’obodo.
  7. Ha na-enyere ibe ha aka n’oru ugbo.

 

OGHOM OTU OGBO

  1. O na-ebute esemokwu na ilu ogu.
  2. O na-eweta iji ugwo maka onye enweghi ego itu utu ga-eje biri ego.
  3. O na-ebute onwu oge erughi eru.
  4. O na-eweta oke mmefu ego.
  5. Ndi anya ukwu nwere ike iri ego ndi mmadu tukotara.
  6. O na-eweta kwa iko nsi.

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Ogbako/otu jikoro ndi amuru site n’otu afo ruo afo abuo maobu ato bu – (a) otu ogbo   (b) otu inyom di   (ch) otu inyom   (d) otu inyom uka.
  2. Oghom otu ogbo ebe a bu – (a) ihunanya ndi otu (b) Enyemaka ndi otu   (ch) Nchekwa ndi otu   (d) Onwu onye otu
  3. Otu uru out ogbo ebe a bu – (a) Iweta ntisa (b) iweta mmepe    (ch) Iweta mmegbu   (d) Iweta esemokwu.
  4. Aha otu otu ogbo a kporo n’akwukwo a bu – (a) otu iruka    (b) otu igba   (c) otu ogene   (d) otu ndi ahia.
  5. Otu ogbo na – akwalite – n’obodo (a) ego  (b) ike   (c) udo   (d) aguu.

 

EDEMEDE NNWALE

  1. Gini bu otu ogbo?
  2. Kpoputa otu ogbo di iche iche ndi obodo gi nwere.
  3. Dee uru ato otu ogbo na-abara anyi.
  4. Dee ihe oghom e nwere ike isi n’otu ogbo nweta.
  5. Olee otu ha si eweta mmepe obodo.

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

Guo akwukwo Nchikota Akwukwo maka Ule Sinio Sekondiri(Correct Steps).Nke A. I. Nze dere onye biputara ya bu Mis-Fav-publishers. Ihu iri isii na asato

WASSCE.

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZU

UKA OZO

Guo maka otu ndi ozo e nwere n’ala Igbo dika otu umuokpu na inyom di.

IHE OMUMU NKE NGWUCHA IZU UKA

Dee edemede gbasara umuokpu na onodo ha ebe a muru ha.

AKWUKWO NLERE ANYA

AKWUKWO Omenala Igbo nke F. chidozie ogbalu.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

IZUUKA NKE IRI         UBOCHI———-

IHE }M{M{: AS{S{  IGBO

KLAASI: SS 2

ISIOKWU: AHIRIOKWU

NDINISIOKWU

1.MPUTARA AHIRIOKWU

2.UDIDI YA NA OMUMAATU HA

MPUTARA AHIRIOKWU

Ahiriokwubumkpuruokwuolenaolegaran’ezigbousoronweengwaa,echiche na nghota zuru oke.Kaahiriokwu wee zuooke o ga-enweririihemaobuonye]na- ekwumakaya.onye a na-ekwumakayaka a na-akpoisiahiri(subject) ebeiheekwurubuokwuputa(predicate)

OMUMAATU:

ISIAHIRI                                        OKWUPUTA

  1. Obi gburuehi
  2. Mmirizorounyaahu
  3. Ndioruugbokoroiheoririn’uju

……………………..                puo

…………………                    ndeewoo

………………                      ebee

………………..                   ndo

Ndienweghi isiahirika a na-akpoahirimkpuruokwu. O buonye e bun’obibuisiahiri.

NNWALE

1.Ginibuahiriokwu?

2.Deputaomumaatuahiriokwuise site na-ideputa ha n’isiahirinaokwuputa.

 

 

UDIDI YA NA OMUMAATU HA

  1. UDIDI AHIRIOKWU:
  2. Ahirimfe simple sentence
  3. Ahirinha Compound “
  4. Ahiriukwu Complex “
  5. Ahirimgbagwo Compound complex sentence

 

  1. NKOWA AHIRIOKWU NA OMUMAATU :

AHIRIMFE:

Nke a bu ahiriokwu nwere naani otu ngwaa. imaatu:-

  1. Ndudizara ulo
  2. Nneka gbara oso
  3. Ude tere ofe

AHIRINHA  (COMPOUND SENTENCE):

Nke a bu, ahiriokwu abuo nwere ike i noro onwe ha iche iche. Ma, e jikotara ha onu ka ha buruzia otu ahiriokwu.

Omumaatu:

  1. O gara ahia zuta ji.
  2. Ada suru nnri ma o teghi ofe.
  3. Mmiri ruru ma o zoghi

 

AHIRIUKWU (COMPLEX SENTENCE):

Nke a bu ahiriokwu kariri abuo e jikotara onu ka ha buruzie otu.

Omumaatu:

1.O ji ukwu, si Aba, gaa owere, loghachi

2.N’ubochi oriri ahu, ha na-esi, na-eri, na-anu,  na-adaghari

3.Adaugo kwuru  na onye ga-alu ya , ga-ama mma, too ogologo,nwee ego ma norokwa na nnukwu okwa.

AHIRIMGBAGWO(COMPOUND COMPLEX SENTENCE):

Nke a bu ahiriokwu nwere echiche abuo ma o bu karia ndi na-adabere n’onwe ha.

Omumaatu:

  1. O kwuru na ya ga-eje ahia ma a kwuo ugwo.
  2. Nkita a zuru nke oma na-echekwa ulo.
  3. Ihe o kwuru bu eziokwu.

NWALE

i.Depute udidi ahiriokwu ato i maara..

ii.Mebe ahiriokwu ato.

NCHIKOTA NNWALE:

1.Ahiriokwu putara………..

A.Okwu nokoro onu B.okwu e kwukuru onu CH.okwu gakoro n’ezigbo usoro ma nwee ngwaa D. Akuko gara n’ezigbo usoro mara mma.

2.Nne m siri utara ji. Mkpuruokwu bu ngwaa n’ahiriokwu a bu……

  1. Nne B. Siri CH. utara D. Ji

3.hota nke bu ahirinha na ndi a.

  1. Nke ahu di njo B. Mu na gi di na mma CH. o biara mgbe a turu anya D. M hughi ya ma o huru m.
  2. Otu n’ime ndi a abughi ahirimfe.
  3. Bia rie nri B. Biko kutere m mmiri CH. Nne m oma D. Adaeze tere ofe
  4. Otu n’ime ndi a abughi odidi ahiriokwu.
  5. Ahirinqe B. Ahirinha CH. Ahiriukwu   D. Ahirimgbagwo

EDEMEDE NNWALE:

1.Gini bu ahirinha? Kowaa ma nye omumaatu ato.

2.Deputa udidi ahiriokwu e nwere

3.Mee ahirimfe ise

  1. Mebe ahiriokwu mgbagwo ato
  2. Mee ahiriokwu ukwu ato

ORU NGWUCHA IZUUKA:

Guo akwukwo ‘Nchikota  ihe omumu asusu Igbo maka ule sinio sekondiri’ nke maazi M.C. Ngoesi dere Onye mbiputa ya bu OPTIMAL PRESS.Ihu akwukwo nke iri asato na ise.

IHE OGUGU MAKA NKWADO  IZUUKA

Guo maka alumdi na nwunye na omenala so ya.

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

Mee ahiriokwu iri di iche iche .

AKWUKWO NLERE ANYA:

1.NchikOta  ihe omumu asusu Igbo maka ule sinio sekondiri’ nke maazi M.C. Ngoesi dere Onye mbiputa ya bu OPTIMAL PRESS.

2.Exam Focus nke NulueEmenanj] dere. Onyembiputa bu University press.

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

IZUUKA NKE  IRI NA OUT    (11th WEEK)                         

IHE OMUMU                           –           ASURU IGBO

KLASI                                       –           SSIII

ISIOKWU                                 –           Echiche ndi Igbo banyere

Eluuwa.

NDISIOKWU

(i) Nkowa ihe bu Ogbanje na nkwenye

ndi Igbo gbasara ilo uwa.

(ii) Akanagholi/ofeke.

 

NKOWA IHE BU OGBANJE.

Ogbanje:  Ogbanje bu nkwenye ndi Igbo nwere na mmadu nwere ike bia uwa ugboro ugboro.  Ha na-ekwenye na ogbanje bu mmuo na-eme ka, onwutumadi na-adi.  Ndi Igbo kwenyere na onye bu ogbanje na-agwa ndi otu ya na ya agaghi ano odu n’uwa.  Ufodu kwere na ndi a, a na-akpo ogbanje bu umu mmuo biara n’uwa n’udi mmadu.  Ndi ozo kwere na ha bu ogbanje.

Nkwenye a mere ndi igboji ebepu nwa nwuru mkpuru aka maobu mkpuru ukwu ka e were mara mgbe o biara ozo.

Aha a, bu ogbanje bu aha e nwetara site na-Igba nje nke putara ugboro ugboro.

IYI UWA

Ha kwenyere na ogbanje na-enwe ihe o na-eli n’ala a na-akpo iyi uwa.  Ha kwenyere na nwa bu ogbanje nwere ike ili iyi uwa ya na mmiri, n’ ukwu osisi na n’ebe ndi ozo di iche iche.  Ha kwenyere na mgbe obula a choro ka nwata  ahu puta na – aga egwuputa iyi uwa ya suo ya oku.

ILO UWA –ILO uwa bu nKwenye ndi Igbo nwere naonye nwuru anwu nwere ike iloghachi azu n’udi nwatakiri.  Ha kwenyere na mmadu na–aloro onye o huru n’anya uwa.  Ha na – ekwenyekwa na nne na nna nwere ike ilogha chiri nwa ya o huru n’anya uwa.

Nkwenye a mere ndi Igbo ji abu mgbe ihe anaghi agaara ha nke oma, n’uwa, ha asi n’uwa m ozo aga m enwe ego.  Nwanyi di ya anaghi eme nke oma ga–asi n’uwa m ozo aga m aluta ezigbo di.Ndi Igbo kwere na o bu onye biri ezi ndu na – alo uwa.

 

NNWALE

  1. Gini bu ilo uwa?
  2. Gini bu ogbanje.
  3. Onye bu ogbanje nwere ihe o na-eli n’ala. Gini k a a na-akpo ihe ahu?
  4. Kedu ebe a na-elikari iyi uwa.

 

NDINISIOKWU ABUO

Akanagholi bu aha ndi Igbo na–akpo onye oxu mmanya, onye ume ngwu na onye ji otutu akpari amu.  Ndi Igbo kwenyere na nwoke xujuru mmiri ara af] kwesiri Idi na-agba mbo. Ndi Igbo na-akpo onye umengwu maobu onye aririo ahu gbasiri ike akanagholi maobu ofeke.

Mgbe mmadu bu onye umengwu o ga na-eme ka onye nzuzu.

Akanagholi mgbe ufodu n’ihi na ochoghi oru o na-erefu ihe ndi nke nna ya na nne ya kpatara iji wee na-eri nri.  Mgbe ufodu ndi mmadu na-abia na–anaraya ala nna ya.Ogaghi eme ihe obula n’ihi enweghi ego.

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Nwata inwu amukwa ya ozo ka a na-akpo – (a) ilo uwa  (b) imu nwa   (c) ile nwa   (d) ogbanje.
  2. O bu soso ndi biri – ndu na-alo uwa. (a) ajo   (b) ezi  (ch) mkpomkpo  (d) nkirinka.
  3. N’ilo uwa, okenye bichara ndu nwere ike iloghachi azu dika – nwa. (a) obere  (b) agadi   (ch) nnukwu   (d) nwa ohuru
  4. Onye ogbanje na-enwe – o na-eli na ala. (a) ngozi  (b) mmanu   (ch) iyi uwa   (d) iyi ocha.
  5. Akanagholi bu onye – (a) nzuzu (b) ntisa   (ch) nchikota   (d) onye udo.

EDEMEDE NNWALE

  1. Gini ka mmadu ilo uwa putara?
  2. Olee udi ndi na – alo uwa?
  3. Onye bu ofeke?
  4. Maka gini ka onye ihe adirighi mma n’uwa ji asi na uwa n’ ozo ihe ga – adiri ya mma?

 

ORU NGWUCHA  IZUUKA

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

Guo akwukwo Omenala Igbo nke F. Chidozi Ogbalu dere ma iwado maka Omenala na nkwenye adi Igbo abuo ozo.

IHE  IHE OMUME NGWUCHA IZUUKA

Dee maka Omugwo n’omenala Igbo.

AKWUKWO NLERE ANYA

(i)         Omenala Igbo nke F. Chidozie Ogbalu

(ii)        Nchikola Akwukwo maka Ule Sinio Sekondiri by A.I. Nze.

Nchikota Akwukwo Maka ike Sinio sekondiri

(Correct step)WASSCE