IGBO THIRD TERM JS 1(BASIC 7)

 

THIRD TERM E-LEARNING NOTES

JSS 1 (BASIC 7)

SUBJECT:       IGBO LANGUAGE

SCHEME OF WORK

WEEK      TOPIC

  1. Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga

2-3.      Onuogugu site n’otu,ruo otu nde:onuogu site n’otu ruo otu nde,Ntinye onuogu   n’ahiriokwu,odide onuogu.

  1. Nzisaozi: (1) Uzo nzisa ozi:(i) keodinala di ka; okwuonu,ekwe,egbe dgz (ii)keugbua di  ka;ekwenti,redio,tiivii,nuzpepa,komputa dgz (2) Uru izisa ozi

5-6.        Ekwumekwu banyere ihe di iche umuaka na-eme: 1.ihe umuaka na-eme n’ulo n’ubochi nkiti, Satode 2.Nkowa ihe na-eme n’oge ezumike 3.Nkowa maka njem ha garala.

7-8.                  Edemede nduzi: Ezinulo:1.nkowa edemede 2.Nkebi edemede3.Okpurukpu okwu 4.Nhazi    edemede

9-10.    Akaraedemede:1.Nkowa akaraedemede2.Udi akaraedemede di iche iche3.Itinye akaraedemede n’ahiriokwu 4.uru akaraedemede bara.

  1. Mmeghari
  2. Ule
  3. Mmechi

 

IZUUKA NKE  MBU (WEEK 1)

MMEGHARI IHE NDI E LERE N’ULE

IZUUKA NKE ABUO (WEEK 2)

ISIOKWU- ONUOGUGU SITE N’OTU, RUE OTU NDE (1-1,000 000)

NDINISIOKWU-

  1. Onuogugu site n’otu ruo na puku nari ise(1–500,000)
  2. Onuogugu site na puku nari ise ruo na otu nde( 500,000–1000,000)

Onuogugu site n’otu ruo na puku nari ise (1- 500,000)

Ndinaya

0—–Zero

Otu—- one

Iri—-Ten

Nari—- Hundred

Puku—Thousand

Nde—million

0 ——- efu

4/5—ano n’ime ise

1——Otu

2——Abuo

3——Ato

4——Ano

5——Ise

6——Isii

7——Asaa

8——Asato

9——ITeghete/itoolu

10——Iri

11—–Iri na otu

12—-Iri na abuo

13—-Iri na ato

14—-Iri na ano.

15—-Iri na ise

16—-Iri na isii

17—-Iri na asaa

18—Iri na asato

19—-Iri na teghete

20—Iri abuo

30—iri ato

35—iri ato na ise

40—iri ano

50—iri ise

60—iri isii

70—iri asaa

80—iri asato

90—iri iteghete

100—nari/otu nari

200— nari abuo

300— nari ato

400— nari ano

500— nari ise

600— nari isii

700— nari asaa

800— nari asato

900— nari itoolu

999  —nari itoolu iri itoolu na itoolu na okara

1000—otu puku

2000—puku abuo

3000—puku ato

4000—puku ano

5000—puku ise

10,000—puku iri

20,000—puku iri abuo

20,001— iri abuo na otu

20,099— puku iri abuo, na iri itoolu na itoolu

30,000— puku iri ato

40,000— puku iri ano

50,000—puku iri ise

60,000—puku iri isii

70,000—puku iri asaa

80,000—puku iri asato

90,000—puku iri itoolu

99, 000—puku iri itoolu, na itoolu

100,000—otu puku nari

200,000—puku nari abuo

300,000— puku nari ato

400,000— puku nari ano

499,000—puku nari ano, na iri itoolu na itoolu

500,000—puku nari ise

Nwale

Deputa onuogugu ndi a n’igbo

  1. 25
  2. 88
  3. 444
  4. 70,055
  5. 489,000

NDINISIOKWU

Onuogugu site na puku nari ise na otu ruo na otu nde (501,000—1,000, 000)

501,000— puku nari ise na otu

502, 000— puku nari ise na abuo

503,000— puku nari ise na abuo

504,000— puku nari ise na ano

505,000— puku nari ise na ise

506,000—puku nari ise na isii

507,000—puku nari ise na asaa

508,000—puku nari ise na asato

509,000—puku nari ise na itoolu

510,000—puku nari ise na iri

599,000—puku nari ise na iri itoolu na itoolu

600,000—puku nari isii

601,000—puku nari isii na otu

602,000—puku nari isii na abuo

603,000—puku nari isii na ato

604,000—puku nari isii na ano

605,000—puku nari isii na ise

699½   —– puku nari isii na iri itoolu na itoolu na okara

700,000— puku nari asaa

799,000— puku nari asaa, na iri itoolu, na itoolu

800,000— puku nari asato

900,000— puku nari itoolu

999,000— puku nari itoolu, na iri itoolu, na itoolu

1,000,000—otu nde

Nwale

Tugharia onuogugu bekee ndi a n’onugugu igbo

  1. 502,000
  2. 600,000
  • 803,000
  1. 700,000
  2. 901,000

Oru ulo

  1. 101 putara ——- (a) puku na otu(b)puku abuo (c)nari na otu (d)nari iri na otu
  2. 231 putara ——— (a) nari abuo na iri ato (b)nari abuo na iri na otu (c)nari abuo, na iri ato na otu (d)nari abuo iri ano na isii
  3. 99 years putara (a) Afo itoolu na asato (b) afo iri asato na itoolu (c)afo iri itoolu na itoolu (d) afo itoolu
  4. Ewepu puku iri asato n’ime puku iri itoolu, o ga- afo ole? (a) puku ise (b) puku iri (c) puku itoolu (d) nari iri
  5. Agbakoo puku ise na nari ise, gini ka o putara?  (a) 5,500 (b) 505 (c) 555 (d) 6500

Deputa onougugu ndi a n’asusu igbo

(i) 112 (ii) ¾ (iii) 2700

 

IZUUKA ATO (WEEK 3)

ISIOKWU- ONUOGUGU GAA N’IHU

NDINISIOKWU:

  1. Ntinye onuogugu n’ahiriokwu
  2. Mkpoaha n’onuogugu(numbers in noun)

NTINYE ONUOGUGU N’AHIRIOKWU

 NDINAYA:

  1. Ada nyere m udara ato; Nneka enye m abuo.
  2. Nne m nyere m puku naira abuo.
  3. Adi m afo iri na otu.
  4. O nwere nde naira ato.
  5. Azuru m ite ahu puku naira iri.
  6. Nwoke ahu di afo iri ise na isii.
  7. Ugwo onwa ya putara puku naira iri ise
  8. Nwata ahu maara onuogu bido n’otu ruo na puku iri na ise
  9. A gbakoo puku ato na nari ise, gini ka o putara?
  10. E wepu puku iri asato n’ime puku iri itoolu gini ka o putara
  11. O nyere m nari puku abuo
  12. O nyere m otu  puku naira, nari naira ise, na iri ise na ise , na kobo iri ise

(N1555.50k)

 

Nnwale

Were onuogugu ndi a mee ahiriokwu

(i) 15 (ii) 74 (iii) 120 (iv) N168 (v) N1500

NDINISIOKWU:

 MKPOAHA N’ONUOGUGU (NUMBERS IN NOUN)

NDINAYA

A na-ebu uzo ede onuogu tupu e dee mkpoaha. Mana o buru na onuogu ahu

di n’onodu ogu, o buru efu(0)na mkpoaha,a na-ebu uzo ede mkpoaha tupu e dee efu.omumaatu;

Otu ihe

Nari ihe

Puku ihe

Nde ihe

Ijeri ihe

Ihe efu

Onuogu ndi ozo adighi n’onodu ogu bu e dechaa mkpoaha e wee dee ha.

Omumaatu;

Ihe ise

Ihe iri na ano

Ihe iri ato na otu

Ihe iri asato na abuo

Lee etu mkpoaha na onuogu si akwudebe mgbe e nwere nari,puku,nde na ijeri.iji mkpuru ube a na-aracha aracha maa atu;

Ube di 105=otu nari ube na mkpuru ise

Ube di 213=nari ube abuo na iri na mkpuru ato

Ube di 3,472=puku ube ato,nari ano,iri asaa na mkpuru abuo

Ube di 243=otu puku ube,nari abuo,iri ano na mkpuru ato

Ube di 1000 000=otu nde ube

NWALE

Dee ihe ndi a putara

(i) Ube di 213 (ii)ube di 200 (iii)oroma di

500 (iv)udara di 1000

 

ORU ULO

  1. A na-ebu uzo ede—tupu e dee mkpoaha (a) onuogu b)ego c)afo d)ite
  2. Ube di 243 putara (a)ube nari abuo,iri ano na ato (b)otu puku ube,nari abuo,iri ano na mkpuru ato (c)ube nari abuo na ato na ano (d)ube nari ano na ato
  3. Naira iri asaa na kobo iri asaa na abuo putara (a) N7.72 (b)N70.70 (c)70.02 (d)70.72
  4. 1,500 putara)Otu puku na nari ise (b)puku nari ise (c)puku ato na ise (d)puku iri na ise
  5. 2,000 000 bu—n’Igbo (a) nde ano (b)nde abuo (c)nde abuo na abuo (d)nde otu abuo

 

IZUUKA ANO (WEEK 4)

ISIOKWU-NZISA OZI

NDINISIOKWU

  1. Nzisaozi keodinaala
  2. Nzisaozi keugbua
  • Uru izisa ozi

NZISAOZI KEODINALA/KEUGBU A

Nzisaozi bu igwa mmadu ihe i bu n’obi i choro igwa ya site n’okwu onu, nke e nwere ike ikwu site na-ekwe, ekwe nti ma o bu n’ozi ide n’akwukwo.

Uzo di iche iche i nwere ike isi zisa ozi bu:-

(i) keodinaala:– okwuonu, ogene, egbe, igba, ekwe wdg.

EGBE(GUN)                                                                IGBA OCHIE (Early Drum)

 

(ii) keugbu a: Ekwenti(phone), igwe na-ekwu okwu (Radio) Onyonyo(TV),

Nuzpepa, komputa, teles wdg.

EKWENTI(Cell Phone)                                                   Igwe na-ekwu okwu (RADIO)

 

 

ONYONYO (TELEVISION)

 

 

NUZPEPA (Newspaper)

 

 

KOMPUTA (computer)                             Poolu Nziza ozi (cell                                             phone tower)  

Nnwale

  1. Gini bu nzisaozi
  2. Deputa uzo di iche iche e nwere ike isi zisa ozi.

URU IZISA OZI BARA

NDINAYA

  1. O na- eme ka mmadu na-amata ihe na-eme n’uwa
  2. O na-egbochi mmefu ego; ebe mmadu gaara eji ukwu gaa,jiri ugboala ma o bu ugboelu gaa mata ihe na-emenu,o ga-anozi be ya mata ya.
  3. Nzisa ozi meziri uwa o dizia ka otu obere obodo.
  4. Onye na-ezi ozi na-enweta nzaghachi ya ozugbo
  5. O na-akwalite azumahia
  6. O na-enye ohere inwete oru.

NNwale

  1. Deputa uzo ise e si ezisa ozi ugbua

2 .Deputa uru ise di na nzisa ozi.

ORU ULO

  1. Otu n’ime ndi a bu ihe nzisa ozi a na-etinyekari na nti (a)Igwe okwu (b)ekwe nti (c)ogene (d)teles
  2. —–ka e ji ezi ndi ochi agha ozi (a)Egbe (b)ekwe (c)opi ike (d)ogele
  3. —– ka e ji ezi umu okorobia na-agba mgba ozi (a) ekwe (b)egbe (c)opi ike (d) oja

4.—-abughi ihe nzisa ozi ogbara ohuu (a)ekwe nti (b)Redio (c)leta (d)okwu onu

  1. E ji —- agwa oha na eze okwu (a)okwu onu (b)ogene(c)redio (d)ekwe

Edemede

  1. Deputa ihe nzisa ozi keodinala abuo, ma kowaa etu e si eji ya eziza ozi.
  2. Deputa ihe nzisa ozi ogbara ohuu ato, ma kowaa etu e si eji ya ezisa ozi.
  3. N’ime ihe nzisa ozi, kedu nke na-agakari osiiso? Maka gini ka o ji ka ndi ozo aga osiiso?

 

 

 

IZUUKA ISE (WEEK 5)

 

ISIOKWU-EKWUMEKWU BANYERE IHE DI ICHE ICHE UMUAKA NA-EME.

NDINISIOKWU-

-IHE UMUAKA NA-EME N’ULO N’UBOCHI NKITI, SATODEE

-NKOWA IHE HA NA-EME N’OGE EZUMIKE

 

IHE BU EKWUMEKWU

NDINAYA.

Ekwumekwu bu okwu e ji onu ekwu. O bughi okwu e dere ede. A na-ekwu ekwumekwu n’uzo ndi a

  1. Oge mmadu abuo na- akpa nkata
  2. Oge otu onye na- akoro umu aka akuko ifo

iii.      Oge ndi ahia na-ekwe ihe onu

  1. Oge ukochukwu na-ekwu okwu chukwu
  2. Oge oha obodo na-eme nzuko

Ekwumekwu na-ebu edemede uzo n’asusu o  bula. Tupu anyi amalite debe asusu igbo a ga-ebugodu uzo kwuputa ya n’onu.

  1. Oge mmadu abuo na-akpa nkata
  2. Oge otu onye na- akoro umuaka akuko ifo

 

 

iii. Oge ndi ahia na-ekwe ihe onu

 

 

  1. Oge Ukochukwu na-ekwu okwu Chukwu

 

  1. Oge oha obodo na-eme nzuko

IHE UMUAKA NA- EME N’UBOCHI NKITI.

NDINAYA

Umuaka na-eme otutu ihe n’ubochi nkiti. Ihe ndi ahu bu

  1. Ha na-azacha ezi
  2. Ha na aza ime ulo
  3. Ha na-esi nri oge ufodu
  4. Ha na-asa efere
  5. Ha na – edozi akwa
  6. Ha–na enye aka iga bute ihe n’ahia

 

Nwale

  1. Kwuputa ihe i na-eme n’ubochi uka
  2. Gosi ihe ano umuaka na-eme ubochi nkiti

IHE UMUAKA  NA- EME N’OGE EZUMIKE

NDINAYA

  1. Ha na –ehicha ulo
  2. Ha na-akpata nku
  • Ha na –asa ugboala
  1. Ha na- ede akwa
  2. Ha ji oge a aru oru ulo e nyere
  3. Ha n’ulo akwukwo
  • Ha na-asu akwa
  • Ha na-agu akwukwo
  1. Ha ji oge a agba boolu
  2. Ha ji ya aru oru ugbo
  3. Ha ji oge a agara nne na nna ha ahia
  • Ha ji ya ekpe ekpere
  • Ha ji ya aga mkpaghari

Umuaka na-aru oru ulo e nyere ha n’uloakwukwo

NWALE

  1. Deputa ihe ato na-amasi gi n’oge ezumike.
  2. Dee ihe ise umuaka na-eme n’oge ezumike.

ORU ULO

  1. Otu n’ime ndi a bu ekwumekwu kpomkwem (a) Ide leta (b)ide edemede maka ulo akwukwo (c) Mmadu abuo na-ako onu (d) Ode akwukwo na nzuko obodo
  2. Imuta ekwumekwu nke oma na-enye aka (aIde nani leta (b)Ide nani okuko ifo  (c)Ide ihe gbasara nani nne m (d)  Ide edemede o bula
  3. Otu n’ime ndi a bu ebe e ji ekwumekwu a aru oru (a)n’ubi (b)na-inya ugboala (c)inya ugboelu (d)n’uloakwukwo
  4. Otu n’ime ndi a bu ihe umuaka na-emekari n’ubochi satodee (a)ihichaulo (b)isa efere (c)ike nri (d)iza ulo
  5. Kedu nke nwata no n’ime obodo nwere ike ime n’oge ezumike (a)isi nri (b)iza ulo (c)iko ugbo (d)ikpa nkata.

 

IZUUKA ISII (WEEK 6)

ISIOKWU:

EKWUMEKWU BANYERE IHE DI ICHE UMUAKA NA-EME

NDINISIOKWU;

NKOWA NJEM ANYI GARA

NDINAYA

Usoro kwesiri ka a gbaso n’ikwu ekwumekwu ma o bu ide edemede gbasara njem anyi gara bu

  1. Ndi gara njem ahu
  2. Ubochi a gara nje ahu

iii.      Ebe e  siri zopu njem

  1. Ebe a gara ya bu njem
  2. Ihe anyi hugasiri n’uzo
  3. Nnabata e nyere anyi

vii.     Etu e siri dugharisi anyi

viii.    Etu anyi siri mechie njem ahu

  1. uru na oghom di na njem a
  2. Mmechi ekwumekwu

 

IMA ATU

Ebe anyi jiri mere ulo akwukwo ugbu a abighl ulo akwukwo anyi ka owa nke iri  na abuo di na mkpuru ubochi ato n’afo gara aga, anyi gara  njem nlete ulo akwukwo anyi ka o kuru elekere iri n’ubochi ahu a kuru mgbirimgba nke mereka umu akwukwo nille zukoo n’ebe ogbako anyi onye isianyi bu oriaku okoli ekwuru na umu akwukwo na ndi nkuzi ga-eje llefe abe a na-aru ulo akwukwo anyi ubochi ahu.  Anyi nwere nnukwu ainuri.  Ozigbo anyi banye ugboala abuo ndi uka bunyere anyi ka anyi na-aga, anyi.  Guru egwu na-aga.  Nke a mere ka otutu ndi mmadu puta ile anyi  ka anyi na-aga, anyi huru otutu ihe n’uzo.  Anyi huru akwa (bridge).  Anyi huru ebe a na-azulite ndi uwe ojii na ndi soja.  Anyi hukwara ebe a na-amu ka esi anya ugbo eluna ulo mgbasa ozi.

Ka anyi rutere ebe ulo akwukwo anyi, anyiridara n’ugboala.  Onye isi ndi oru nabatera anyi nke oma.  O dughariri anyi ma  kowaara anyi ihe ulo o bula putara.  O gosiri anyi ulo obibi umu akwukwo ndi nwoke na ndi nwanyi.  O gosiri ulo obibi ndi nkuzi, onye isi.  Anyi na ulo nri anyi.  Anyi hukwara ebe ogbako anyi na ebe a na-edobe akwukwo.

Ka o gosichara anyi ihe ndia, anyi jere taa achicha na mmanya anyi tinyere n’ugboala.  Anyi zuru obere ike were lagachi ebe anyi na-agu akwukwo ugbu a.

N’ eziokwu, njem a mere ka ndi mmadu   mata na ulo akwukwo anyi ebidola.

NNWALE.

II        Kwuputa usoro ato a ga-agbaso oge a na ekwuputa njem nile anyi gara?

  1. Kowaa njem nile I gara oge ezumike?

IHE OGUGU IGBO MAKA JUNIOR SECONDARY  1

Ihu nke  otu nari na iri na abuo

ORU ULO

1.Nke putara njem na Bekee bu

a)paint b)month c)home d)journey

2.Otu n’ime ndi a bu ihe e ji aga njem

a)Ugboala b)aja c)aka d)onweghi

3.Ndi njem na-amasikari bu

a)Nne na Nna b)ikwu na ibe c)enyi na enyi d)umuaka

4.Otu n’ime ndi a bu ebe a na-agakari njem nlepu anya

a)Biichi b)ulo ogwu c)ahia d)uloakwukwo

5.Otu n’ime ndi a bu ihe na-ebutekari obi uto mgbe a na-eme ya

a)isa akwa b)iga uloakwukwo c)iga njem d)iga ahia

TIORI

1.Dee ahiriokwu ato iji gosi ebe umu akwukwo ji ekwumekwu aru oru (a)………… (b) ………… (c)…………..

  1. Kwuo ka isi enyere nne gi aka oge o na-esi nri abali

iii.      Kwuputa ihe ise I na-eme n’oge njem …………  ……………. ………… ………..

 

 

IZUUKA ASAA (WEEK 7)                                        UBOCHI

ISIOKWU-EDEMEDE NDUZI EZINAULO

NDINISIOKWU:

-NKOWA EDEMEDE

-NKEBI EDEMEDE

NKOWA EDEMEDE

NDINAYA

Edemede bu ihe mmadu cheputara ma detuo n’akwukwo maka igu ya agu.

Edemede nwere udi di iche iche.

1.Akomako(narrative)

2.Nkowasi(descriptive)

3.Ilu(expansion of proverb)

4.Edemede nkowami(Expository essay)

5.Edemede arumaruuka(Argumentative essay)

6.Mkparitauka(dialogue)

7.Ekwumekwu(address)

8.Nruritauka(Debate)

9.Edemede leta(Letter writting)

NNWALE

1.Kowaa ihe bu edemede

2.Deputa udi edemede isii i maara

NKEBI EDEMEDE

NDINAYA

Isiokwu-edemede o bula na-enwe isiokwu.Isiokwu bu ihe a na-ede maka ya

Usoro na nhazi edemede:

i)Mmalite-Nke a bu nkeke okwu na-eduba n’ihe a na-eme

ii)Etiti-O bu ebe a ka a na-agbari okpurukpu okwu di n’isiokwu na nkebi nkebi.

Ndi a bu okpurukpu okwu a ga-ede na nkebi na nkebi gbasara isiokwu “obodo m”

a)Aha obodo m na ogbe ole di n’ime ya

b)Steti na okpuru ochichi o no n’ime ya

c)Obodo ndi ya na ha gbara agbataobi

d)Ihe e jiri mara obodo m

e)Oru mmepe di iche iche na aga na- aga n’ihu n’obodo m

iii)Mmechi-N’ebe a ka a na-eji nkenke okwu ekpokota ihe nile e kwuru n’edemede ahu  onu.

NNWALE

1.Deputa uzo ato e nwere ike isi hazie edemede

2.Dee otu edemede gbasara ezinaulo gi

ORU ULO

1.Edemede e ji eziputa ebe mmadu abuo na-ekwurita okwu bu

a)nkowasi b)akomako c)mkparita uka d)nkowami

2.Ihe a na-ebu uzo ede tupu e debezie ihe ndi ozo n’edemede ka a na-akpo—

a)mmalite b)isiokwu c)adreesi d)nkowa edemede

3.ka edemede wee nwee ezi nhazi o ga-enwe

a)ilu na asusu nka b)atumatuokwu c)ahiriokwu na nchikota d)mmalite,etiti na mmechi

4.Otu njirimara edemede leta bu na o na-ebu

a)etiti b)ngwucha c)ubochi d)adreesi

5.Nke bu omumaatu edemede Arumaru uka bu

a)uru osisi bara b)izu nwoke n’akwukwo bara uru karia nwanyi c)ihe m ga-eme ma e mee m onyeisiala naijiria

TIORI

1.Dika onye isi uloakwukwo,deputa ihe iga-agwa ndi ga-abata uloakwukwo ohuru.

2.Dee leta degara Komishona ndi uweojii na steeti gi gwa ya ka ndi bidowere unu si akpa agwa edochaghi mmadu anya.

 

 

 

IZUUKA ASATO (WEEK 8)                                                          UBOCHI

ISIOKWU-EDEMEDE NDUZI EZINAULO

NDINISIOKWU

-OKPURUKPU OKWU

-NHAZI EDEMEDE

Okpurukpu okwu na Nhazi edemede ga-esi n’ezinaulo.

Okpurukpu okwu ndi a ka a ga-eji ede ya:

NKOWA EZINAULO

UDI EZINAULO E NWERE

ORU NNE NA NNA N’EZINAULO

NDINAYA

Ezinaulo bu  ndi mmadu sitere n’otu agburu ma o bu obara.Ikwunaibe bu ndi metutara ezinaulo.Enwere udidi ezinaulo abuo.Ha bu ezinaulo mkpuke na ezinaulo ubara.

Ezinaulo mkpuke; Nke a bu nani nne, nna,na umu ha mebere ya.

 

 

 

                  

                  EZINAULO MKPUKE (NUCLEAR FAMILY)

 

 

 

 

 

 

EZINAULO UBARA (POLYGAMOUS FAMILY)

 

 

 

 

           

          EZINAULO MBASA (EXTENDED FAMILY)

 

Ndi mebere ya bu; nne, nna, umuaka ha, umunna na ndi ozo. N’ala Igbo o bu ezinaulo ubara putara ihe. mata na o bu umunna na ndi ozo bu ikwunaibe.

NWALE       

(i)Gini bu ezinaulo?

(ii)kedu ndi mebere ezinaulo ubara?

 

NDI MEBERE EZINAULO NA ORU HA

NDINAYA

Ndi mebere ezinaulo bu nna, nne ,umuaka,na ikwunaibe

Oru ha

 

Nna

O bu ya bu onye isi n’ezinaulo

O bu ya na ato ntoala n’ ihe ndi a; irusi oru ike,Ikwu ezi okwu, Ikwuba aka oto, irubere iwu obodo isi, i gbaraagwa ojoo oso.

 

Nne

  1. Irubere di ya isi
  2. Ikpa ezi agwa
  • Isi nri site ya nke oma
  1. Iga ahia zuta ihe oriri
  2. isa umuaka ahu

 

Umuaka

  1. Ihu na mmiri di n’ulo
  2. izacha ulo
  • Isu akwa
  1. irubere nne na nna isi
  2. isopuru ndi okenye
  3. I gara okenye ozi
  • Idobe iwu obodo
  • Isopuru omenaala obodo
  1. izacha ama egwuregu
  2. izachasi uzo e nwere n’obodo.

 

Umuna, ndi ogo, ikwu na ibe

  1. Ichikota ndi ntorobia na akuziri ha omenaala obodo
  2. Iduzi ha n’ezi omume.
  • Ha na-enyekwa aka oge ufodu i kwuru umuaka ugwo akwukwo

URU EZINAULO BARA

Uru ezinaulo bara bu ndi a:

  1. Ha na-echekwaba umuaka
  2. Ha na-enye aka imepe obodo.
  • Ha na-azulite umuaka.
  1. Ha na-akuzi otutu ihe.
  2. Ha na-eme ka ihunaya bawanye.

 

NWALE

  1. Kedu ndi o diri ilekota umuaka.
  2. Deputa uru ato ezinaulo bara.

 

IHE OGUGU: Igbo maka junio sekondiri 1, Ihu akwukwo nke iri isii na otu ruo na nke iri isii na itoolu.

 

ORU ULO

  • Onye bu onye isi n’ezinaulo bu—–(a)nne (b)nna (c)umuaka (d)ikwunaibe.
  • Ezinaulo kere onwe ya uzo—-(a)ato (b)otu(c)ano(d)abuo
  • Otu n’ime ndi a anaghi enye aka izulite umuaka n’ala Igbo———(a)ndi okenye (b)Ndi toro eto (c) ndi ofogeri (d) ndi ikwu na ibe
  • Otu n’ime ndi a bu oru umuaka (a) izu ahia (b) inye onwe ha nri (c)isa efere (d) itu asi
  • kedu ndi mebere ezinaulo na ndi a (a)nne ,nna,umu (b)nwanne na nne (c)umu na nna (d)umu na ikwu na ibe

 

Edemede

  • Deputa oru ise umuaka na-oru n’ezinaulo.
  • Gosi uru ato ezinaulo bara n’obodo

 

 

IZUUKA TEGHETE(WEEK 9)                                                                  UBOCHI

ISIOKWU: AKARAEDEMEDE

 

NDINISIOKWU

-NKOWA AKARAEDEMEDE

-UDI AKARAEDEMEDE DI ICHE ICHE

Akara edemede bu akara ndi ahu na-enye aka ime ka ogugu asusu igbo gaa were-were, ma nwekwaa nghota zuru oke.

Akara edemede e nwere bu:

Akara         Igbo                           Bekee

.              kpom                         fullstop

,              Rikom                        comma

‘              Rikomelu                   Apostrophe

?             Akara ajuju               Question mark

!            Akara ntimkpu          Exclamation

:             Kpomkpom                Colon

–          Akarauhie                   Hyphen

()             Akarangudo                bracket

“ ‘’         akarangwu                 qoatation mark.

Nwale

  1. Gini bu Akara edemede
  2. Deputa akara edemede ise e nwere, ma tugharia ha na bekee.

ORU ULO

  1. —— na-eme ka agugu gaa were were (a)kpom  (b)akaraedemede  (c)ajuju (d)rikom
  2. ”Bracket” Putara ———– na bekee (a)akara ngudo b)akara ajuju c)rikom mgwu d)kpom
  3. Quotation mark putara————-n’Igbo (a)rikom (b)akara uhie (c)kpom rikom (d)akaramkpu
  4. Akara uhie putara gini na bekee (a)hyphen (b)full-stop (c) comma (d) colon
  5. Kpom kpom ka a na-akpo ———-na bekee (a)semi-colon (b)hyphen (c)colon (d)exclamation mark

Edemede

  1. Deputa akara edemde ise i maara ma tuhgaria ha na Bekee
  2. Gini bu akara edemede? Kowaa na mkpuruokwu ole na ole.

 

 

IZUUKA IRI (WEEK 10)                                                                                       UBOCHI

ISIOKWU-AKARAEDEMEDE

NDINISIOKWU-

-Itinye Akara edemede n’ahiriokwu,mgbe/ebe a na-etinye ya.

-URU AKARAEDEMEDE BARA

(a)kpom (.)

Kpom bu otun ime akara edemede di ezigbo mkpa. A na-eji ya egosi nkwusi ahiriokwu o buru na kpom adighi n!ahiriokwu, o na-egosi n!ahiriokwu ahu ka na aga n!ihu.

Omumaatu

(i)Nne, m gara uka.

(ii)Ha ,gbara oso.

(iii)Ada, na-ede ihe.

(iv)Anyi, nwere ego.

(v)Nnam, toro ogologo.

A na-etinyekwa kpom mgbe a na-edebiri aha mmadu edebiri dika- B.A. Akunne

M.N. Ike

G.C.E=General certificate of education

W.d.z.g=were dirizie gaba

Fr.z father

(b)Rikom (,)

Akara edemede a na-enye aka iku ume mgbe a na –agu edemede o bula

Omumaatu

(i)Ndi gbara oso bu:uzoka,uche,obinna na Ngozi

(ii)o zutara akwa, akpukpoukwu,ichapu na oche

(iii)Anyi maara out esi eme ncha, ude,ogwu na ude

(iv)umunne m bu uche,oluchi,oyinye,chiba,Nkechi na chinenye.

(ch)Rikom elu (`)

A na-ede ya mgbe (na) na-eso udaume iji mechie okwu.

Omumaatu

(i)onye nkuzi ya kporo ya ‘itiboribo`

(ii)o si ya’ bia ebe a`

(iii)o no n`elu osisi

(iv)o ga-abia n`ubochi taa

(v)Anyi gara n`oge ututu

(d)Akara ajuju (?)

A na-eji akara a[?] eziputa ahiriokwu bu ajuju

Omumaatu

(i)kedu aha obodo gi?

(ii)ole ka unu di?

(iii)o kwuru gini?

(iv)igbara afo ole?

(v)onye kwuru okwu?

(e)Akara ntimkpu(!)

Nke a bu akara e ji egosi mgbe ihe mere n`ike ma o bu mgbe e tiri mkpu

Omumaatu

(i)chimu oo!

(ii)chai!

(iii)oo!

(iv)efuolam oo!

(f)kpomkpom(:)

  1. na-eji akara edemede a agudo otu ihe siri mee

Dika  (i)o gara ahia zutasia ihe ndia:iko,efere,ngaji na ite

(ii)Anyi na ndi gbara agbataobi bu ndia a: idoma,edo,tivi,igala,Ibibio na Efik

(g)Akara uhie(-)

A na-ahukari akara uhie n`ahiriokwu mgbe ‘na, ga ‘na-aru oru dika enyemakangwaa

Omumaatu

(i)Anyi ga-esi ofe taa

(ii)Ha na-eri akpu na onuugbo

(iii)uche na-agu akwukwo ya

(iv)onye nkuzi anyi na-ede ihe

A.na-enwekwa akara uhie n`okwu ndi nwere akara udaelu na udansuda dika:-

(i)ime (to do)

(ii)ita (to chew)

(iii)iza (to sweep)

(iv)ibe (to cry)

(v)iru (to work) wdz.g

Nnwale

(1)mee ahiriokwu ato ma tinye akara edemede rikom etu kwesiri

(2)Dee ahiriokwu ise gosiri akara mkpu

(3)mee ahiriokwu abuo ma tinye akara edemede a  (.) (!) (,)

URU AKARAEDEMEDE BARA

NDINAYA

1.O na-eme ka edemede di nma n’anya

2.O na-eme ka edemede di uto n’ogugu

3.O na-eme ka akpoputa okwu Igbo nke oma

4.O na-eme ka e nweta nghota zuru oke  n’edemede.

5.E ji ya akpoputa okwu Igbo;o bu n’ihi na otutu okwu Igbo nwere otu nsupe kpomkwem mana mkpoputa ha abughi otu.Omumaatu

Akwa(cry)Akwa(bed)Akwa(cloth)Akwa(egg)

Isi(head)Isi(smell)Isi(leader)Isi(to cook)

Eke(market)Eke(gizzard)Eke(to tie)Eke(python).

NNWALE

1.Deputa uru ato di n’akaraedemede

2.Dee okwu uzo abuo nwere otu nsupe ma nghota ha ma o bu mkpoputa ha abughi otu.

Oru ulo

1.Akara e ji egosi nkwusi na ngwucha ahiriokwu bu?

a)-   b)’ c), d).

2.Otu n’ime ndia abughi uru di n’akraedemede

A.O na-eme ka edemede di nma n’anya

B.O na-eme ka edemede di uto n’ogugu

C.O na-eme ka akpoputa okwu Igbo nke oma

D.O na-egbu anya

3.kedu nke abughi okwu na-enwe otu nsupe ma nwee mkpoputa di iche

a)akwa b)elu c)isi d)eke

4.A na-etinye akara uhie(-) n’otu n’ime okwu ndia

a)ya b)uru c)ga d)mu

5.Otu n’ime ndi a bu akara e ji egosi ihe mmadu kwuru

a). B): c)() d)”

TIORI

1.Deputa akara  edemede nile e nwere

2.Mee ahiriokwu iri ma tinye akara edemede na ha.

IHE OGUGU

Igbo maka junio sekondiri  ihu (121-123)

 

 

 

 

 

Spread the word if you find this helpful! Click on any social media icon to share