IZU ỤKA  NKE  AB ỤỌ (WEEK 3)

IZU ỤKA  NKE  AB Ụ

(WEEK 3)

IHE OMUMU: Asusu Igbo

 

KLAASI: SS 1

 

 

 

ISIOKWU: Mkpuruedemede na nsoroedide ya (a) Ikpoputa udaume (b)mgbochiume( c )myiriudaume (d) udamkpi.

Akaraedemede.

 

NDISIOKWU: 1. Ikowa mkpuruedemede , na inye omumaatu

 

  1. Mkpuruedemede: (i) Mgbochiume (ii) Udaume (iii) Myiriudaume
  • Udamkpi

 

MKPURUEDEMEDE IGBO (IGBO ALPHABET)

 

Nke a bu abidii eji ede asusu Igbo. Mkpuru edemede e ji ede Igbo taa bu nke Onwu komiti weputere n’afo 1961. A na akpo ya Onwu otografi. Ha bu ndi a:

 

 

Mkpuru edemede nke nnukwu

 

A B CH D E F G GB GH
GW H I J K KP KW L
M N Ń NW NY O P R
S SH T U V W Y Z

 

Mkpuru edemede Igbo di iri ato na isii (36). O kere onwe ya uzo abuo; udaume na mgbochume.

Mkpụrụedemede nke obere

 

a b ch d e f g gb gh
gw h i j k kp kw l
m n ń nw ny o p r
s sh t u v w y z

 

 

 

NNWALE

 

  1. Guputa MkpuruedemedeIgbo
  2. Mkpuruedemede igbo o diole?

 

 

 

 

 

MKPU                                                                                         RUEDEMEDE:  (I)  UDAUME (II)  MGBOCHIUME (III) MYIRIUDAUME (IV) UDAMKPI

UDAUME(VOWELS)

 

Udaume Igbo di naani asato. Ha bu ndi a A E I Ị O Ọ U Ụ

Udaume kere onwe ya uzo abuo ;udamfe na udaaro

 

  1. Ụdamfe( lightvowels)
  2. Ụdaaro(heavyvowels)

 

 

 

 

 

 

 

 

Otu “A” (Udamfe) “Otu E” (Udaaro)
A E
I
O
U

 

 

Mkpọmụda((vocal cord) na-ama jiji oge a na-akpoputa udaume asato ndi a.

 

 

 

Ụdamfe( light vowels)

 

(otu A)-Ha bu ‘a’ na ndi nwere kpom n’ike.d.k a,ọ,ụ ,ị

 

Ụdaaro(heavy vowels)(otu E)-Ha bu ‘e’na ndi enweghi kpom n’ike dika e,o, u .i

 

 

Ụdamfe Ụdaaro

 

a-aka,anya, anụ e-eke,eze ,elu

 

  • ịgba,ịta, ịnya i-ite ,isi,  ije

 

ọ-ọnụ,ọcha,ọkụ o-oche, ose,oge

 

ụ-ụlọ,ụta,ụka u-ube,ute,ude

 

 

MGBOCHIUME (CONSONANTS)

 

E wepuchaa udaume n’ime abiidi ,ndi ozo bu mgbochiume. Ha di iri abuo na asato. Ha bu:

 

B, CH, D, F, G, GB, GH, GW, H,
J, K, KP, KW, L, M, N, N, NW
NY, P, R, S, SH, T, V, W, Y, Z.

 

 

Mgbochiume kere onwe ya uzo abuo;mgbochiume mkpi na mgbochiume nge Mgbochiume mkpi(diagraph) – CH, GB, GH, GW, KP,

KW, NW, NY, SH. Ha di itoolu(9)

 

 

Mgbochumenge(single) B, D, F, G,H, J, K, L, M, N, N

 

 

 

P, R, S, T, V, W, Y, Z. Ha di iri na itoolu(19)

 

 

 

 

 

 

MYIRIUDAUME (SEMI VOWEL)

 

Nke a bu oge ‘m’ na ‘n’ na-aru oru dika udaume.Nke a na-adi ire oge ‘m’ ma o bu ‘n’ nodebere mgbochiume n’okwu Igbo. Mkpọmụda((vocal cord) na-ama jiji oge a na-akpoputa M na N.

Omumaatu

 

Mmanu ( Palm oil) Ndo (Sorry)

 

Mma (Knife) Nri (Food)

 

Mmiri (Water) Nkita (Dog)

 

Mkp]Nnu (Salt)

 

 

EBE “M na N” NA ARU ORU DI KA MGBOCHIUME

 

Mgbochiume “M na N” na- egosiputa mgbe M na N anaghi enwe uda ma ha  kwuru onwe ha. M na N a naghi enwe uda, naani ma a agbakwunyere ha mkpuruedemede udaume.

Omumaatu

 

Maka  Nata  muta Naani Mere   Nari  Napuru Nara Metara Muo Muta Muru

UDAMKPI (Diphthong)

 

 

 

Udamkpi bu udaume abuo sokotara onwe ha na mkpuruokwu, ma nwee otu uda, ka a ga-asi na ha bu otu udaume. E nwere udamkpi ano n’asusu igbo. Ha bu: \a, ie, ịọ, io

Omumaatu

 

\a O piara ya utari n’isi Amaka gara ahia

ie Rie ji ahu dum

 

O naghi eme njem n’ehihie

 

ịọ Oke aririọ na-ebute oke mkpari Kwusinu uf] n’uloaku

io si ebe a piopu

 

Ewu ahu si na mpio gbapu

 

NNWALE

 

  1. Gosiputa uzo ole udaume kere onweya?
  2. Guputa mgbochiume nge enwere

 

NCHIKOTA NNWALE

 

  1. Otu n’ime ndi abu udaume (a)ny (b)p (c)u (d)m
  2. Okwu nwere myiriudaume n’ebea bu (a)maka (b)noro (c)nti (d)ube
  3. Akara edemede a na-etinye ebe a juruajuju bu? (a)kpom (b)akara

ntimkpu (c)rikom (d)akara ajuju

  1. Udaume Igbo di ole?——-(a)asato (b)iri (c)iri asato(d)abuo
  2. MyiriudaumeIgbo bu? (a)d na n (b)m na n (c)h na d (d)o na

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

 

 

  1. Gini bu ogugu na aghotaazaa?
  2. Kowaa ihe bu ahuike ndintorobia

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke Maazi Ngoesi M.C

IHE OMUME NKE OGUGU(Pre-reading Assignment)

 

Guo edemede na udi ya di iche iche n’ihe omumu asusu igbo di na laptop gi.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

See onye Eze n’ime akwukwo asusu igbo gi

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke Maazi Ngoesi M.C

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

Spread the word if you find this helpful! Click on any social media icon to share