SECOND TERM NOTES JS 1 (BASIC 7) IGBO LANGUAGE

NAME:………………………………………………………………CLASS:……………………………………

 

SECOND TERM: E-LEARNING NOTES

JS 1 (BASIC 7)

SUBJECT: IGBO LANGUAGE

SCHEME OF WORK

WEEK TOPIC

  1. Mmeghari ihe ndi e lere n’ule na taam gara aga
  2. Ikowa ufodu omenala Igbo: ufodu omenala gbasara umuakwukwo di ka (i)

ikele ekele(ii) iga ozi (iii) irube isi dgz

3 Ogugu na Aghotaazaa: Ihe ogugu si n’akwukwo.

4-5 Agumagu Odinala(i)ufodu akuko ifo(ii)Abu so ha na egwu ndi ozo(iii) Ejije

6-7. Udi oru nwoke na nwanyi na-aru ugbua (i) ufodu oru di iche iche(ii) oru naani nwoke na-aru (iii)oru naani nwanyi na-aru(iv)oru nwoke na nwanyi na-aru

  1. Ahuike ndi ntorobia (i) nkowa ndi ntorobia(ii)mgbanwe n’ahu ndi ntorobia (iii) oria ufodu na-emetuta ndi ntorobia (iv) uzo mgbochi oria ndia
  2. Njirimara na nkenudi Agumagu ugbua (1) nkenudi agumagu ugbua i.iduazi ii.ejije iii.abu
  3. Nkenuudi agumagu ugbu a gaa n’ihu: Abu, na njirimara agumagu ugbu a
  4. Mmeghari
  5. Ule
  6. Mmechi.

IZUUKA NKE MBU (WEEK 1)

Mmeghari ihe ndi e lere n’ule na taam gara aga

IZUUKA NKE ABUO (WEEK 2)

ISIOKWU: Ikowa Ufodu Omenaala Igbo

Ndinisiokwu: Ufodu omenala gbasara umuakwukwo di ka (i) ikele ekele(ii) iga ozi (iii) irube isi dgz.[mediator_tech]

Omenala bu uzo ndi obodo o bula di iche iche si ebi ndu ha ka e ji mara ha. Di ka udi uwe ha na-eyi, udi nri ha na-eri, ma obu nkwenye di iche iche ha kwenyere. Ndi Hausa na-eyi agbada oge niile, nri ha bu tuwo. Nri ndi Igbo na- eyi abada. Nri ha bu ji na akpu. Nke a bu omenala ha.

Nihi ya omenala igbo bu uzo ndi igbo si ebi ndu ha di iche iche. Anyi maara na ndi igbo bu ndi na-eri nri akpu na ji. Ha na-eme kwa emume di iche iche di ka ilu nwanyi, iwa oji ohuu, ikuputa nwa, iti mmonwu wdg.

NWALE:

  1. Gini bu omenala?
  2. Kpoputa omenala ndi igbo ato i maara

NDINISIOKWU: UFODU OMENAALA GBASARA UMUAKWUKWO

NDINAYA:

i. ikele ekele

ii. iga ozi

ii. irube isi

(i) Ikele ekele (Greeting)

Ekele bu uzo esi enye nsopuru. O bu uzo di iche iche mmadu na ibe ya si enwe mmeko. Ekele so n’ihe ndi e ji mara ndi Igbo. Onweghi onye a naghi acho ekele. Ma o bughi gi ka a na-ekele, o buru gi na-ekele mmadu. A na- ebido n’oge kuziwere nwata etu esi ekele ekele. Ndi Igbo nwere uzo di iche iche ha si ekele mmadu. Ekele ndi igbo e nwere bu:-

  1. Iboola chi- Goodmorming
  2. Ndeewo- weldone
  3. Jisieike- weldone
  4. ka chifo- Goodnight
  5. Kaemesia- Goodbye
  6. Daalu/imeela-Thank you
  7. Ije oma- safe journey. dgz

(ii) Iga ozi

Iga ozi bu oru nwata ketara n’ezinaulo. O bu ozi ka e ji azulite nwata. O nwere ike buru igara mmadu ibe gi ozi n’udi di iche iche. ozi diiiri nwata n’ezinaulo gunyere ndi a: iza ulo na ezi, ichu mmiri, ikpata nku, isachasi efere, isu akwa, iga gbute nri ewu, dgz

(iii) Irube isi

Irube isi bu njirimara nwata a zuru azu. Anyi elebala anya n’ikele ekele na iga ozi. Ihe ndi a bu onye na-erube isi nwere ike ime ha. Nwata anaghi erubere nne na nna ya, na ndi toro ya isi, o naghi erubere ndi nkuzi ya isi.

NWALE:

  1. Gini bu ekele ndi igbo?
  2. Deputa ekele di iche iche ndi igbo na-ekele.
  3. Kpoputa udi ozi ato i nwere ike I ga-n’ezinaulo
  4. Kedu njirimara nwata a zuru azu?

ORU ULO

Deputa ihe ndi a na-ekele ebe ndi a

i. Onye na-aru oru

ii. Onye na-eri nri……

iii. Onye na alakpu ura…..

iv. Onye na-aga nje m……

v. Onye obia………………

Ihe ogugu – Akwukwo maka junio sekondiri nta

IZUUKA NKE ATO (WEEK 3)

ISIOKWU: OGUGU NA AGHOTAAZAA

NDINISIOKWU: IHE OGUGU SI N’AKWUKWO

OGUGU NA AGHOTAAZAA

NDINAYA

Aghotaazaa bu ajuju na aziza na-eso akuko o bula. Oge onye nkuzi na-akuzi ihe, o bu aghotaazaa ka a na-eme. Oge mmadu abuo na-akparita uka, o bu aghotaazaa ka ha na-eme dgz. Na aka nke ozo, aghotaazaa bu ederede ahaziri nke oma dee ka aguo, ma zaa ajuju na-esote ya. Aghotaazaa abughi so naani ederede, nke e kwuru n’onu ma zaa ajuju na-estote ya bukwa aghotaazaa.

NDINISIOKWU: IHE OGUGU SI N’AKWUKWO

OGUGU NA AGHOTAAZA

Obi bu dinta, aha obodo ya bu Ihuoma. Aha nkita ya bu Bingo.Obi nwere egbe nma na ube.Ihe ndia na-enyere ya aka na-ichu nta.Obi huru nchi abua Bingo were malite chuwa ha.Otagburu otu mgbe o nwudere ya.

Zaa ajuju ndi a:

1.Kedu aha nwoke ahu (a) dinta (b) obi(c)nkita(d)bingo

  1. Aha nkita ya bu ——- (a) obi (b)dinta(c)nkita (d)bingo
  2. ——— na ——- na-enyere ya aka ichu nta (a) egbe,mma na ube(b)efere, ngaji na aziza(c)oche, ulo na eku(d)aguba,mkpisi na eku

4.——— Bu aha obodo ya (a) onicha(b)enugwu(c)ihuoma(d)obi

5.——-nwudere nchi? (a) obi (b) nchi(c)bingo (d)nkita.

NDINISIOKWU: OGUGU NA AGHOTAAZAA GA N’IHU: IHE OGUGU SI N’AKWUKWO

NDINAYA

Guo ederede a, ma zaa ajuju ndi na- esote ya

N’ezinaulo Udeozo, o nweghi onye na-ekwutekwa maka Afandu. O buladi nne ya na-abu oge o bula oto n’ariri, obi ya buzi okwute ugbu a. Udeozo n’onwe ya ekpebiela si: Afandu mara ebe o siri bia, ya laghachi, na ohi a dighi n’agburu ha, ka o na-adi be ndi ogo ya.[mediator_tech]

O gbajiri doro n’ogige ndi uwe ojii n’ogba ubochi Afo. Ndi jere afo ogba lotara na-ako na o nwere ndi ohi ano agbagburu dosa ha na nke ndi uwe ojii. A na-atamu si na ndi Obinagu so n’ime ha. Otutu mmadu wee gawa Ogba ka ha were anya ha hu. Tupu ha aloghachi, o bughizi ihe a na-ezo ezo na A fandu so na mmadu ano ahu. Udeozo, na nwunye ya, Erimma, anukwuola ya. Di ka ndi gara hu n’anya siri koo, naani Afandu bu onye Obinagu di ya. A maghi obodo ndi ozo si.

Zaa ajuju ndi a:

  1. Afandu bu: (a) onye uwe ojii (b) onye ohi (ch) onye oruugbo (d) onye ahia
  2. Ndi Obinagu a gbagburu di ole? (a) otu (b) abuo (ch) ato (d) ano
  3. Ebee ka ogige ndi uwe ojii di? (a) Obinagu (b) Afo Ogba (ch) Afo Obinagu (d) Ogba
  4. Erimma bu (a) Nwanne Afandu (b) Nne Afandu (ch) Enyi Afandu (d) Nwanne Udeozo
  5. Gini bu isiokwu akuko a? (a) ihe mere ubochi afo (b) Udeozo na n’ezinaulo ya (ch) ndi ohi e gburu n’Ogba (d) Etu Afandu si laa mmuo.

ORU ULO

Gugharia ederede a n’ulo

IZUUKA NKE ISE (WEEK 4)

ISIOKWU: Agumagu Odinala

NDINISIOKWU: (i) ufodu akuko ifo(ii) abu so ha na egwu ndi ozo(iii) ejije

NDINAYA:

Agumagu Odinaala

Agumagu odinaala bu ihe nna- nna anyi ha na-ekwuputa n’onu banyere echiche ha, ihe ha nuru nti ma o bu nke anya ha huru. okwu ndi a nwere ike buru: Akuko ifo, abu, ejije, ilu, agwugwa okwuntabiire, ukabuilu akukoneegwu.akuko

Ndi anyi ga-elebagodu anya n’ebe a bu akuko ifo,abu na ejije.

NDINISIOKWU: (i)ufodu akuko ifo(ii) abu so ha na egwu ndi ozo(iii) ejije

Akuko ifo(Folktales)

C:\Users\DLHS\AppData\Local\Microsoft\Windows\Temporary Internet Files\06a3d.bmp

NDINAYA

Akuko ifo bu akuko ndi gboo chikotara iji were na-enye nkuzi na nkowa banyere ndu anyi di, uwa anyi no n’ime ya, mmalite uwa na ihe di n’ime ya. Ndi Igbo na- ako akuko ifo iji mee onwe ha obi uto, nakwa ime ka mmadu nwee akonauche. iji maa atu, mgbe o bula mbe batara n’akuko ifo, ihe mmuta ga-adi nay a aghaghi ibu amamiihe n’ihi na Mbe nwekariri umuanumanu niile uche. ka anyi leba anya n’ufodu akuko ifo.

MBE NA EZI

C:\Users\DLHS\AppData\Local\Microsoft\Windows\Temporary Internet Files\t025393a.bmp C:\Users\DLHS\AppData\Local\Microsoft\Windows\Temporary Internet Files\t049816a.bmp

MBE EZI

 

Mbe na ezi gara oru otu oge.Ha ruchara oru ha nke oma.Onye kporo ha oru kwuru

a ugwo.Ka ha ruru ulo,Mbe kere ego ha were nke ya ma nyekwa Ezi nke ya.Mbe gara n’ihu biri Ezi ego nke ya.Ezi nyere ya ego ahu di ka enyi ga – emere enyi ya.Ka abali ano ruru,Ezi gara n’ulo Mbe maka ego ahu.Ma o hughi Mbe.O jiri iwe laa ubochi ahu.N’abali ano ozo Ezi gakwara n’ulo Mbe ,nani nwunye ya ka o huru.O huru okwute nwunye Mbe ji esu esu ogwu mana o maghi na okwute ahu bu Mbe.Ezi jiri iwe tufuo okwute ahu.O teghi aka,Mbe esi n’ohia lobata hu enyi ya Ezi.Ezi nara Mbe ego ya ma Mbe siri ya buru uzo chota obere okwute ahu o tufuru n’ohia. Ezi were baa n’obere ohia di n’azu ulo Mbe na na-acho obere okwute ahu. O chogidere okwute ahu, o hughi yanozo wee ruo taa. O ka na-achogari okwute Mbe, nke gaeme ka Mbe kwughachi ya ego ya nke Mbe naara ya. Omuma ato bu

NWALE

i. Kedu ndi a na-akoro akuko ifo?

ii. N’akuko mbe na ezi, kedu onye bu onye aghugo?

IZUUKA NKE ISE (WEEK 5)

ISIOKWU: ABU

NDINISIOKWU: EGWUREGWU/ EJIJE

Abu (poem)

NDINAYA

Abu so n’agumagu odinaala kacha enye mmadu obiuto. A na- akpo ya egwu ma o bu uri n’olumba ufodu. ka anyi leba anya n’udi abu di iche iche.

Abu Ifo

Udara m daa ………………………………………….. nda

Udara m daa ………………………………………….. nda

Daa daa daa …………………………………………… nda

Nwunye nna muo ……………………………………. nda

Gota udara n’ahia …………………………………… nda

Rachawoo nwa enwe nne …………………………. nda

Rachawoo nwa enwe nna …………………………. nda

Elu uwa bu oriri ………………………………………. nda[mediator_tech]

Onye nocha o lawa ………………………………… nda

ii. Nwa nnunu nwa nnunu nta …………………. turuzamzam turu nza

Nwa nnuu nwa nnunu nta ……………………. turuzamzam turu nza

Ana m aturu nne m ose ………………………… turuzamzam turu nza

Tukene ka isi atu …………………………………. turuzamzam turu nza

Tutu riri tutu ri ……………………………………. turuzamzam turu nza

 

Abu Nwa

Onye muru nwa nwa na- ebe akwa?

Egbe muru nwa na-ebe akwa

Weta uziza weta ose

weta amalaogologo ofe

ka umunnunu rachaa aka

ka okpofufu kpogbuo ha

ugbu a oo egwu ero.

Abu Agha

onye akpala nwa agu aka n’odu

ma o di ndu ma o nwuru anwu

onye akpala nwa agu aka n’odu

Abu akwamozu

Dibe dibe ndidi ka mma, onye mere ya dibe

na ndidi ka mma

Dibe dibe ndidi ka mma, onye mere ya dibe

na ndidi ka mma

NWALE

Guo otu abu nwa i maara

ORU ULO

Deputa otu abu agha i maara

NDINISIOKWU: EGWUREGWU/ EJIJE

NDINAYA

Egwuruegwu, nke e jikwa ejije mara, bu ngosi akparamagwa n’udi ga-ato ochi. o nwere ike buru mmeghari ihe onye ma o bu ndi ozo merela.

Iti mmanwu bu otu udi egwuruegwu, ebe ndi di du na-egosi agwa ndi mmuo. Egwu onwa sokwa na-egwuruegwu.

Omumaatu

Onye na onye jere be enyi ya oma?……………………merere mme

Onye na onye jere be enyi ya oma?……………………merere mme

Okeke jere be enyi ya oma ?…………………………. merere mme

Buru isi ji n’aka n’aka

Buru isi ede n’aka n’aka

Akwa okuko mpia mpia

Osisi kporo nku n’ohia

Nwata ji amu elu

O ridata o rigoro kwee ya

Merere mme e e merere mme

NWALE

  1. Gugharia egwu onwa a kuziri
  2. Guputa otu egwu onwa i maara

ORU ULO

Seputa ngwa egwu ise I hurula.

IZUUKA NKE ISII NA ASAA (WEEK 6)

ISIOKWU: UDI ORU NWOKE NA NWANYI NA-ARU UGBU A

NDINISIOKWU: (I) UFODU ORU DI ICHE ICHE (II) ORU NAANI NWOKE NA-ARU (III) ORU NAANI NWANYI NA-ARU (IV) ORU NWOKE NA NWANYI NA-ARU

Udi Oru Nwoke na Nwanyi na-aru Ugbu a

NDINAYA

Gini bu oru?

Oru bu ihe o bula mmadu na-eme wee na-enweta ego. e nwer ezigbo oru na ajo oru. Ajo oru bu oru nwere ike iwetere agbataobi anyi ma o bu obodo nsogbu. iji maa atu, izu ohi bu ajo oru.

Ufodu Oru Di iche iche Bu Ndi a:

(i) Nkuzi (ii) Dibia Bekee (iii) Noos (iv) kapinta (iv) mesin (v) oruugbo (vi) ikwa akwa (vii) inya ugboala (ix)inya ugboelu (x) azumahia (xi) Oru oyibo (xii) Ise foto (xiii)

Oru njinia (xiv) Ntaakuko (xv) Ikpe (xvi) Oru ulo aku (xvii) Police (xviii) Ami (xix)Igu egwu (xx) Ejije

NWALE

  1. Gini bu oru?
  2. Deputa udi oru ise e nwere

IHE OMOME

Deputa udi oru ise i maara.

NDINISIOKWU: Oru naani nwoke na-aru (iii) oru naani nwanyi na-aru (iv) oru nwoke na nwanyi na-aru:

Oru Naani Nwoke Na-Aru

Etu ihe siri kwuru ugbu a, naani oru ole na ole ka a ga-asi na o buzi nke umu nwoke. Chi nna na-abo, ihe a na-agbanwe. ka o sila di, oru ndi e nwere ike si na nwaanyi a anoghi ya maoli, ma o bu na ha npo ya ntakiri bu:

(i) kapinta,

(ii)mesin

(iii) Inya ugboala/ugbooloko/ katapila/ugbommiri/ ugboelu

(iv)Njinia

Oru Naani Nwaanyi Na-Aru

E wepu oru igho nwa a muru ohuru,ya bu oru midwaif, o nweghi oru ozo a ga- asi na o bu naani nwaanyi nwe ya. o nwere mgb e oru noos bu naani maka umunwaanyi. mana ugbu aumunwoke ji nwayoo na-abaghachi na ya di ka o di na mbu.

Oru ma nwoke ma nwaanyi na-aru

i. Nkuzi

ii. Dibia bekee

iii. Noos

iv. Oruugbo

v. Ikwa akwa

vi. Azumahia

vii. Oru oyibo

viii. Ise foto

ix. Ntaakuko

x. Ikpe

xi. Oru ulo aku

xii. Police na oru ndi yiri ya[mediator_tech]

NWALE

  1. Deputa oru ano naani nwoke na-aru
  2. Deputa oru asato ma nwoke ma nwanyi na-aru
  3. Gini bu aha nne gi? ……………….
  4. kedu aha oru nne gi na- aru? …………….
  5. Gini bu aha nna gi? ………………..
  6. kedu aha oru nna gi na- aru? ……………….
  7. kedu udi oru i choro iru na ndu gi? ……………

IZUUKA NKE ASATO (WEEK 8)

ISIOKWU: Ahuike ndi ntorobia -Nkowa maka ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia

NDINISIOKWU: Oria ufodu na-emetuta ndi ntorobia

Nkowa Maka Ndi Ntorobia

NDINAYA

Ndi ntorobia bu ndi gbara bido n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato. A na- akpo nwaanyi zonyere ukwu n’afo ndi a nwa agboghobia, ma na- akpo onye nwoke nwa okorobia. Ma na ha zukota onu a kpoo ha ndi ntorobia.

Mgbanwe N’ahu Ndi Ntorobia

(i) Mgbanwe n’ahu umunwoke

Mgbe nwoke si na nwata puo wee banye na ntorobia, a ga-enwe mgbanwe di iche iche n’ahu ya, di ka: igba aji n’abu, igba aji n’ihe o jiri buru nwoke, igba afuonu na

igba aji n’obi. Olu ya ga na-adasi uda ike ma okwuo okwu. o ga na-etokwa ka ome ji n’ihi na o na- eri oke nri. o ga-ebido nwewe mmasi n’ebe umunwaanyi no. o ga na-adi ocha na-akpachapuru uwe o na-eyi anya.

(ii) Mgbanwe n’ahu umunwaanyi

O buru nwaanyi, oga-agbakwa aji n’abu, nakwa n’ihe o jiri buru nwaanyi. o ga-ebido ikpu ara. o ga-ebidokwa ihu nso ya n’onwa o bula. mgbe nke a na-eme onye ahu kwesiri ka akowara ya ihe mgbanwe ndi a putara na ndu ya di ka nwaanyi.

mgbanwe ndi ozo a ga-ahu n’ahu onye di etu a bu na ike ya na apata ukwu ya ga-ebido buwe ibu. akpupko ahu ya ga- na- akwo murumuru. o ga na-akpachapu anya wee na-eke ekike ka o wee na- adi mma ile anya. o ga na- etokwa oso oso.

NWALE

  1. kedu ndi bu ndi ntorobia
  2. Deputa mgbanwe opeka mpe ato a na-enwe n’ahu umunwoke
  3. Deputa mgbanwe ato a na-enwe n’ahu umunwaanyi

ORU ULO

Deputa mgbanye ise i nwerela n’ahu gi di ka nwa ntorobia

NDINISIOKWU: Oria Ufodu Na-emetuta Ndi Ntorobia

NDINAYA

Oria ndi na- echere ndi ntorobia aka di otutu. Mana nke ha na-adabakari n’ime ya mgbe o bula bu oria mmeko nwoke na nwaanyi. ufodu oria a na-ebute site na mmeko nwoke na nwaanyi bu ndi a:

i. Gonoria

ii. Sifilis

iii. HIV/AIDS

Oria ndi ozo bu:

i. Iba

ii. Taifoid fiva

Uzo Mgbochi Oria Ndi a

Uzo di iche iche e nwere ike isi gbochie oria ndi a bu nke a

  1. Gonoria: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi
  2. Sifilis: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi
  3. HIV/AIDS: Gbara mmeko nwoke na nwaanyi oso tutu i luo nwaanyi ma o bu di.
  4. Oria iba: E kwela ka mmiri na-ado aghara aghara n’okirikiri ebe ibi, kawa ahu na-ekpuchi mmiri I dowara n’ulo ekpuchi ka anwuta ghara ino n’ime ya mubaa, na-arahu n’ime neet, tupu i lakpo were aziza ulo piagbuo anwuta febatara n’ime ulo, ma o bu igbaa ha ogwu anwu.[mediator_tech]
  5. Taifoid fiva: O bu ijiji na- ekesa nje na-ebute oria a. O buru na ijiji ebee na nsi ma o bu maamiri onye bu nje a wee bee na nri, onye riri nri ahu aghaghi ibute oria taifoid. Uzo ndi a ka e si egbochi oria taifoid:

i. A ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a nuo.

ii. A ga- achoputa ndi bu nje taifoid gwoo ha, ka ha ghara ibufe ya ndi ozo

iii. Ikwo aka nke oma mgbe o bula mmadu meturu onye na-aria taifoid aka

iv. Onye bu oria a na onye ebughi ya ekwesighi iji out iko na- anu mmiri.

v. Ha agaghi ejikwa otu ngaji na out efere na-eri nri.

NWALE

  1. Deputa oria ndi nwere ike i metuta ndi ntorobia
  2. Deputa uzo niile e nwere ike isi gbochie oria ndi ahu

 

ORU ULO

  1. Ndi ntorobia bu ndi ————- (a) gbara afo iri na abuo (b) gbara site n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato (c) gbara site n’afo iri ruo n’afo iri na asato (d) gbara afo iri na asato
  2. Otu n’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na- enwe n’ahu umunwoke (a) igba aji n’obi (b) igba afuonu (c) ikpu ara (d) igba aji n’abu
  3. O bu ———— na-ekesa nje na- ebute oria taifoid fiva (a) ijiji (b) awuta (c) mmeko nwoke na nwaanyi (d) anwu
  4. A na- ebute otu n’ime oria ndi a site na mmeko nwoke na nwaanyi (a) iba (b) taifoid fiva (c) HIV/AIDS (d) igbo agbo
  5. Otu n’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na-ahu na ahu umunwaanyi (a) igba aji n’abu (b) ihu nso n’onwa (c) ikpu ara (d) igba afuonu

IZUUKA NKE ITOOLU (WEEK 9)

ISIOKWU: NKENUDI AGUMAGU UGBU A

INDINISIOKWU: NGALABA AGUMAGU UGBU A

NDINAYA

Agumagu ugbu a bu echiche ndi gboo na ndi ugbua, ma obu ihe ha huru anya nke e deputara n’akwukwo. Aha ozo a na-akpo agumagu ugbua bu agumagu edeerede.Na mbu anaghi ede echiche ndi mbu n’akwukwo,ma n’oge ugbu a, a na- edezi ya n’akwukwo. N’oge mbu a na- akpo ya agumagu odinaala, mana n’oge ugbu a igu na ide akwukwo dizi, ya mere ana- edetuzi ya edetu n’akwukwo, ma na- akpo ya agumagu ederede. Akwukwo mbu e biputara n’asusu igbo bu omenuko, n’afo1933. Aha onye dere akwukwo a bu Pita Nwana. Kemgbe e dechara Omenuko, e deela otutu akwukwo n’asusu igbo.

NWALE

  1. Kowaa agumagu ugbu a
  2. Gini bu aha akwukwo mbu e dere n’asusu igbo?
  3. Gini bu aha onye dere akwukwo mbu n’asusu igbo?

ORU ULO

Gugharia ihe a muru taa

NDINISIOKWU: NGALABA AGUMAGU UGBU A

Agumagu ugbua nwere ngalaba ato. Ha bu:

  1. Iduazi
  2. Egwuruegwu/ Ejije
  3. Abu

Iduazi

Iduazi bu akwukwo akuko. O na- abukari otu onye na-ede iduuazi. iduuazi e nwere n’igbo taa bu agutaonu n’ihe na e nweela otutu ndi ode aka ha na-agho nko.

Akwukwo ndi a bu ufodu iduazi e nwere:

  1. Obiefuna nke F.C Ogbalu
  2. Chinagorom nke nke Julie Onwuchekwa
  3. Okpa aku Eri Eri nke Ude Odilora
  4. Oja Dufuo Dike nke Ray C.Anene
  5. Anu gbaa Ajo Oso nke Chinedum Ofomata
  6. Uwa Mgbede nke S.N Okafo
  7. Juo Obinna nke Tony Ubesie

(viii) Isi Akwu Dara N’ala nke Tony Ubesie

Egwuruegwu/Ejije

A kowaala ihe ejije bu n’isi nke asato. Di ka n’iduuazi e nweela otutu akwukwo n’ejije. Aga-edeputakwara gi ufodu n’ime ha, na ndi ode ha.

i. Okwe Agbaala nke Inno Nwadike

ii. Nwa Ngwii Puo Eze nke B.I.N Osuagwu

iii. Udo Ka Mma nke Anaelechi B. Chuklwuezi

iv. Nwata Rie Awo nke Goddy Onyekaonwu

v. Ojaadili nke Odunke

Vi. Obi Nwenne nke kalu okpi

Vii. Otu Mkpisiaka nke J.C Maduekwe

viii. Obidiya nke s. akoma

ix. Nwata Bulie Nna ya Elu nke Inno nwadike

x. Omume Onye Na-Edu ya nke Inno nwadike

NWALE

  1. Uzo ole ka ekewara agumagu ugbu a?
  2. Deputa akwukwo ato bu (a) iduuazi (b) ejije

ORU ULO

Dee otu akwukwo Igbo ima site n’igbaso ihe ndi a:

  1. Aha akwukwo
  2. Aha ode
  3. Afo ebiputara ya
  4. Ulo oru biputara ya
  5. O bu abu? Ejije? Ka o bu Iduazi

IZUUKA NKE IRI (WEEK 10)

ISIOKWU: ABU (POEM), NA NJIRIMARA AGUMAGU UGBU A[mediator_tech]

INDINISIOKWU: NJIRIMARA AGUMAGU UGBU A

Abu (Poem)

NDINAYA

E nwere otutu abu di iche iche. Mmemme o bula a na-eme n’ala igbo nwere abu e ji eme ya. Di ka anyi huru n’isi nke asato, e nwere abu akwamozu, igugu nwa, agha, nke e ji echi echichi dgz.

Lee akwukwo abu ufodu na ndi dere ha

  1. Ekpe Nna nke A.k Obierozie
  2. Echiche nke R.O Ezeuko na J.I Anowai
  3. Ako Bu Ndu nke Anaelechi B. Chukwuezi
  4. Mbem Igbo nke J.C Obienyem
  5. Utara Nti nke Nolue Emenanjo
  6. Nka Okwu nke J.C Maduekwe
  7. Eke Une nke E.Obike
  8. Akpa Uche nke R.M. Ekechukwu
  9. Nkemakolam nke Nuluo Emenanjo
  10. Obiageli nke O.L Oruruo

NWALE

Deputa abu ato i maara

ORU ULO

Deputa otu abu nwa I maara

NDINISIOKWU: Njirimara Agumagu Ugbu a

Ndinaya

E nwere otutu ihe e jiri mara agumagu ugbu a. ha bu ndi a

  1. A na-ede agumagu ugbua n’akwukwo.
  2. A maara onye cheputara ma detuo ya n’akwukwo.
  3. Agumagu ugbu a na-eto ogologo.
  4. Agumagu ugbua e nweghi mgbanwe n’ihi na e dere ya ede. o buru agumagu odinala o nwere ike igbanwe n’ihi na o bu naani n’onu ka a na-ako ya.
  5. A maara mgbe agumagu ugbu a bidoro n’ihi na a na-ede afo e biri ya n’akwukwo.
  6. O na- ano okputorokpu o buladi na onye dere ya anwuola.

NWALE

  1. Kpoputa akwukwo Abu ise
  2. Kpoputa njirimara agumagu ugbu a ato 1

ORU ULO

Dee otu akwukwo Igbo ima site n’igbaso ihe ndi a:

  1. Aha akwukwo
  2. Aha ode[mediator_tech]
  3. Afo ebiputara ya
  4. Ulo oru biputara ya
  5. O bu abu? Ejije? ka o bu Iduuazi?

IZUUKA NKE IRI (WEEK 10) – Mmeghari ihe ndi a muru

IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 11) – Ule

IZUUKA NKE IRINA ABUO (WEEK 12) – Mmechi

 

Spread the word if you find this helpful! Click on any social media icon to share