IZU ỤKA  NKE  AB ỤỌ(WEEK 2)

IZU ỤKA  NKE  AB ỤỌ(WEEK 2)

IHE OMUMU: Asusu Igbo

 

KLAASI: SS 1

 

ISIOKWU: Ọgugu na Aghotaazaa – Ahuike ndi ntorobia (i) nkowa ndi ntorobia (ii)mgbanwe n’ahu ndi ntorobia

(iii)ọria ufodu na-emetuta ndi ntorobia (iv)uzo mgbochi oria ndi a

 

NDINAYA: 1.Ọgugu na Aghotaazaa: Ahuike ndi ntorobia, nkowa ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia.

  1. Ọria ufodu na-emetuta ndi ntorobia, na uzo mgbochi oria ndi a.

 

Ọgugu na aghotaazaa: Ahuike ndi ntorobia, nkowa ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia.

NKOWA IHE BU OGUGU NA AGHOTAAZAA

 

Ogugu na aghotazaa putara a guchaa, ghota, a zaa ajuju na esote ihe a guru.

 

AHUIKE: Ahuike putara mgbe mmadu na-anaghi aria oria. Mmadu na-enwe ahuike mgbe o nweghị ntụpọ n’ahụ dika ọrịa n’ime ahụ ya, na-eri erimeri nke

 

 

 

oma, ma dikwa ike oru. Ndị kwuru okwu sị na onye nwere ahụike nwere ndụ: na ahụike bụ okpueze.Ọ bụ ya kpatara ndị ntorobịa ji agba mbọ ịhụ na ahụ ha zuru oke mgbe ọbụla.

AHUIKE NDI NTOROBIA: Ahuike ndi ntorobia bu onodu umuokorobia na umuagboghobia (ntorobia) ga-ano na-enweghi oria.

NKOWA NDI NTOROBIA

 

 

 

 

Ndi Ntorobia

 

Ndi ntorobia bu ndi gbara bido n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato. A na- akpo nwaanyi zonyere ukwu n’afo ndi a nwa agboghobia, ma na-akpo onye nwoke nwa okorobia. Ma na ha zukota onu a kpoo ha ndi ntorobia.

 

 

MGBANWE N’AHU NDI NTOROBIA

 

  • Mgbanwe n’ahuumunwoke

 

Mgbe umunwoke si na ibu nwata puo wee banye na ibu ntorobia, ha ga-enwe mgbanwe di iche iche n’ahu ha. Mgbanwe ndi a gunyere:

  1. Igba aji n’abu ha.
  2. Igba aji n’ihe ha jiri burunwoke

 

 

 

  • Igba afuonu na igba ajin’obi
  1. Olu ha ga na-adasi uda ike ma ha na-ekwu
  2. Ha ga na-etokwa ka ome ji n’ihi na ha na- eri oke nri.
  3. Ha na-ebido nwewe mmasi n’ebe umunwaanyi no.

Ya mere, ha ga na-adi ocha, na-akpachapuru uwe ha na-eyi anya.

 

(ii) Mgbanwe n’ahu umunwaanyi

 

  1. Mgbanwe umunwaanyi na-enwe n’oge a gunyere ndia:
  2. Ha na-agba aji n’abu
  • Ha na-agba aji n’ihe ha jiri buru
  1. Ha ga-ebido ikpu
  2. Ha ga-ebidokwa ihu nso ha n’onwa o bula.
  3. Ike ha na apata ukwu ha ga-ebido buwe ibu.
  • Akpupko ahu ya ga- na- akwo

iix. Ha ga na- etokwa oso oso.

 

Mgbe nke a na-eme onye ahu kwesiri ka akowara ya ihe mgbanwe ndi a putara na ndu ya di ka nwaanyi. O ga na-akpachapu anya wee na-eke ekike ka o wee na- adi mma ile anya.

 

 

NNWALE

 

  1. kedu ndi bu ndintorobia

 

  1. Deputa mgbanwe opeka mpe ise a na-enwe n’ahuumunwoke

 

  1. Deputa mgbanwe ise a na-enwe n’ahuumunwaanyi

 

MGBANWE N’OMUME NDỊ NTOROBỊA NJIRIMARA HA

 

Otu nwoke onyeọcha aha ya bụ Peteson (1966) chọpụtara ụzọ

akparamagwa abụọ n’ebe ndị ntorobia nọ. Agwa ndị ahụ gụnyere:

 

  • Agwaọjọọ ha (b) omume ha (pesọnaliti ha)

AGWA ỌJỌỌ HA

 

 

 

Mgbe ndi ntorobia na-amalite ndụ ha, ha na-enwe ọtụtụ agwa ọjọọ ha na-eme iji megide ndi mmadụ ma ọ bụ okirikiri ebe ha nọ. Agwa ndị ahụ gụnyere:

  1. Nnupuisi (disobedience).
  2. Ịlụ ọgụ(fighting).
  3. E nweghi ndidi (impatience).
  4. Ime ngaghari iwe wee na-emebi ọtụtụ ụlọakwụkwọ ha di iche iche (destructiverioting).
  5. Igbu mmadụ(killing).
  6. Izu ohi (stealing).
  7. Ịgba akwụna (prostitution).
  8. Ịba n’otu nzuzo(occultism).
  9. Iti ụmụaka ndi obere ihe aghara aghara (bullying). 10.Ibi ndụ nnwere onwe (free life).
  1. Ibi ndụ okomoko na ndị achọghi ima (luxiriouslife).
  2. Ọ bụ mgbe ụmụnwaanyi n’ime ha ji atụrụ ime ọkwa (unwanted pregnancy).
  3. Ọ bụ mgbe ime mpụ ule ji amalite (examinationmalpractice).

 

MGBANWE N’OMUME HA (Pesọnaliti ha)

  1. Ime ihere.
  2. Ịtụ egwu na iweda onwe ha ala.
  3. Ha anaghi enwe ntụkwasiobi n’onwe
  4. Agụụ ịkwa iko.

 

 

NDINISIOKWU 2: ORIA UFODU NA-EMETUTA NDI NTOROBIA, NA UZO MGBOCHI ORIA NDI A.

Oria ndi na- echere ndi ntorobia aka di otutu. Mana nke ha na-adabakari n’ime ya mgbe o bula bu oria mmeko nwoke na nwaanyi. ufodu oria a na-ebute site na mmeko nwoke na nwaanyi bu ndi a:

  1. Gonoria

 

 

 

  1. Sifilis

 

  • Oria obirinajaocha (HIV/AIDS)

 

  1. stafirụs

 

Onye oria obirinajaocha (HIV Patient)

 

 

 

Oria ndi ozo bu:

 

  1. Iba

 

  1. Taifoidfiva,

 

  • Afoosisa(Diarrhea)

 

  • Lung cancer( A na-ebute oria ojoo site n’inusiga)

 

Uzo Mgbochi Oria Ndi a

 

Uzo di iche iche e nwere ike isi gbochie oria ndi a bu nke a

 

  1. Gonoria: kwusi mmeko nwoke nanwaanyi

 

  1. Sifilis: kwusi mmeko nwoke nanwaanyi

 

  1. Oriaobirinajaocha (HIV/AIDS): Gbaara mmeko nwoke na nwaanyi oso tutu i luo nwaanyi ma o bu
  2. Oria iba: E kwela ka mmiri na-ado aghara aghara n’okirikiri ebe ibi, kawa ahu na-ekpuchi mmiri i dowara n’ulo ekpuchi ka anwuta ghara ino n’imeya

 

 

 

mubaa, na-arahu n’ime neet, tupu i lakpo were aziza ulo piagbuo anwuta febatara n’ime ulo, ma o bu igbaa ha ogwu anwu.

  1. Taifoid fiva : A na-esite n’inu mmiri adighi mma ma o bu ocha ebute oria taifod fiva

Uzo ndi a ka e si egbochi oria taifoid bu na a ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a nuo.

  1. Afo osisa A na-esite n’inu mmiri adighi mma ma o bu ocha ebute oria afo osisa. Uzo  aga- esi egbochi oria afo osisa bu na a ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a
  2. Lung cancer: A na-ebute oria a site n’inu siga. Iji gbochie     oria, i ga-akwusi     ise ma o bu inu
  3. Oria akpukpa: Mmadu iru unyi na-akpata oria a. Gbaa mbo na-asa ahu, ma na- edebe uwe gi na-ebe obibi gi

NNWALE

 

  1. Deputa oria ndi nwere ike i metuta ndintorobia

 

  1. Deputa uzo niile e nwere ike isi gbochie oria ndiahu

 

NCHIKOTA NNWALE (GENERAL EVALUATION)

 

  1. Ndi gbara site n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato ka a na-akpo———

— (a) ndi okenye (b) ndi ntorobia (c) umuaka (d) ikwu na ibe

  1. Ana- ebute otu n’ime oria ndi a site na mmeko nwoke na nwaanyi (a) iba (b) taifoid fiva (c) obirinajaocha (d) afo osisa
  2. Otun’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na-ahu na ahu umunwaanyi (a) igba aji n’abu (b) ihu nso n’onwa (c) ikpu ara (d) igba afuonu
  3. Anughi ezigbo mmiri na-ebute otu oria n’ime ndi a  (a) Oria taifod (b)  oria mkpobiukwu (c) anya mgbu (d) aka mgbu
  4. Kedu oria e si n’anwuta ebute? (a) afo osisa (b) iba (c) gonoria (d) taifod fiva

 

 

 

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

  1. Kowaa ihe buahuike
  2. Depụta agwa ọjọọ ndi ntorobia ise i maara.
  • Kedu ndi bu ndintorobia?,
  1. Deputa oria ise na-emekpa ndi ntorobia ahu

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo ntuziaka udaasusu nke ogechukwu leti okeye,isi nke nari na iri asato na ano (Page 184)

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO (Pre-reading Assignment)

 

Guo mkpuruedemede na nsoroedide ya

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

Deputa ihe ato ozo nwere ike ime ka ndi ntorobia ghara inwe ahuike.

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Ntuziaka Maka Udaasusu, Utoasusu, na Omenaala Igbo Nke Ndi Sekondiri Ukwu Nke Mbu (ss 1) NkeOgechukwu Leti Okoye.InnogeTrading Company Limited.

Spread the word if you find this helpful! Click on any social media icon to share
Use the search box to search for any topics or subjects that you want
Use the search box to search for any topics or subjects that you want