IGBO LANGUAGE JS2 ( BASIC 8) SECOND TERM
NAME:…………………………………………………………………………………..
CLASS:………………………………………
IGBO LANGUAGE: E-LEARNING NOTES
JS2 ( BASIC 8) SECOND TERM
WEEK TOPIC
- Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga
2-3. Ikwado na inye umunwaanyi ikike 1. Ebe di iche umunwaanyi nwere ike iputa n’ochichi 2. Ikwuputa uzo di iche iche e nwere ike isi nye umunwaanyi nkwado 3.ikwuputa ebe di icheiche e nwere ike inye nwaaanyi nnochiteanya.
4-5. Ahuike: mkparitauka banyere oria di iche iche 1. Ihe bu ahuike 2.oria di iche di ka HIV/AIDS, oria mmeko nwoke na nwaanyi 3. Ihe na-ebute oria di iche iche 4. Mgbochi oria di iche iche
- Ahirimfe: ahirimfe ziputara 1.ndi ugbuo 2. ndinaazu na 3. Ndiniihu
- Edemede Nduzi banyere idebe gburugburu ocha 1. Nkebi edemede 2. Nhazi edemede 3. Asusu nka
- Ogugu na aghotaaza banyere iji mmadu tu mgbere 1. Ogugu 2. Nkowa ihe bu iji mmadu tu mgbere 3. Uche umuakwukwo banyere ihe ha guru
- Omenaala: Omu na uru obara
- Oru ‘Na’ na- aru n’asusu Igbo.
11 Mmeghari
- Ule
- Mmechi
IZUUKA NKE MBU (WEEK 1)
Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga
IZUUKA NKE ABUO (WEEK 2)
ISIOKWU: IKWADO NA INYE UMUNWAANYI IKIKE
NDINISIOKWU: EBE DI ICHE ICHE UMUNWAANYI NWERE IKE IPUTA N’OCHICHI
Ikwado na Inye Umunwaanyi Ikike
NDINAYA
Onodu umunwaanyi na mgbe ochie,na mgbe uwa no n’ochichiri, o nweghi ihe e ji nwaanyi kporo. Naani nwoke nwere ugwu na nsopuru. Nwoke nwunye ya muru nwa nwaanyi na-ewe ya ka chi ojoo. Oru nwaanyi agwuchaala idi na-amu nwa, na- esiri di ya na umu ya nri. o naghi esonye n’itu alo. O nweghi ihe di ka nwoke na nwunye ya inoko na-akpari uka. ma nwaanyi putara bu ma akporo ya akpo. N’ihi na a na-arupuru ya ulo.
[mediator_tech]
Mgbe agumuakwokwo si n’aka ndi bekee bia, otutu mmmadu eweghi ya ka ihe umunwaanyi ga-eso mee. o bu n’ihi nghota e nwere mgbe ahu na guo akwukwo elu guo akwukwo ala ebe o jedebere bu n’usekwu. Echiche na nghota mmadu agbanwekwuola. Umunwaanyi sozi umunwoke agu akwukwo n’ebe o di elu.
NWALE
Gini mere na e jighi agumakwukwo nwaanyi kporo ihe n’oge mbu?
ORU ULO
Dee nkenke ihe banyere isiokwu a: Nwaanyi igu akwukwo o di mkpa?
NDINISIOKWU: Ebe Di Iche Iche Umunwaanyi Nwere Ike Iputa N’ochichi
NDINAYA
A na-ekwu okwu si na ihe o bula nwoke mere nwaanyi nwekwuaziri ike ime ya ma kponye aka. Ewezuga ibu igwe na-achi obodo, onweghi okwa ochichi ozo di umunwaanyi na nso.
Ndi a bu okwa ochochi obodo e nwere:
- kansulo na-anochite anya obodo ha n’ochichi ime obodo
- Onyeisi oche ochichi ime obodo
- Osota onyeisi oche ochichi ime obodo
- Onye ulo ogbako omebeiwu nke steeti
- Osota govano
- Onye omebeiwu nke ulo nnochiteanya
- Onye sineeti
- Osota onyeisi ala
NWALE
Deputa uzo ebe isii nwaanyi nwere ike iputa n’ochichi
ORU ULO
Gugharia ihe a kuziri taa
IZUUKA NKE ATO (WEEK 3)
ISIOKWU: IKWUPUTA UZO DI ICHE ICHE E NWERE IKE ISI NYE UMUNWAANYI NKWADO
INDINISIOKWU: IKWUPUTA EBE DI ICHE ICHE E NWERE IKE INYE NWAAANYI NNOCHITEANYA
Uzo Di Iche E nwere Ike Si Kwado Umunwaanyi
NDINAYA
Anyi ga-eleba nke a anya site n’uzo abuo
- N’ogo ezinaulo
- N’ogo mpuga ezinaulo
1. N’ogo ezinaulo
N’ufodu ezinaulo, otutu umunwoke ka na-echi nwunye ha onu n’ala. Ha anaghi acho ka anu olu nwunye ha. nke a wee tinyezie umunwaanyi ufodun’onudu ohu. Nwaanyi o bula huru onwe ya n’onodu a anaghi aro nro nkwado na inye ikike. ya bu a ga- amaalite n’ezinaulo nyewe umunwaanyi nkwado na ikike site n’ime ihe ndi a:
i. Umunwoke ga na-ahu ndi nwunye ha n’anya
ii. Aga enye ha nsopuru ruru ha
iii. Ha g-eso na-atuputa alo
iv. A ga na- eto mbo ha na-agba
v. Nwoke ga-eme ka nwunye ya nwee ntukwasa obi n’ebe o no dgz
2. N’ogo mpuga ezinaulo
A gbaala mbo di che iche iji hu na umunwaanyi welitere isi tumadi n’ebe ndorondoro ochichi di.
N’ afo 1995 umunwaayi mba uwa gbakoro na mba Chaina, n’obodo a na-akpo Beejin. Ha kpebiri n’ogbako a na a ga na-edobere ha opeka mpe okwa ato n’ime okwa irimo bula e keputara.
Uzo ndi ozo e nwere ike isi nye munwaanyi nkwado bu ndi a:
- A ga-ekeputa ministry ga na-ahu maka odimma umunwaanyi. e bidola nke a n’Naijiri
- Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi
- A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu
- Govment no n’ochichi ga-akpolite umunwaanyi tozuru etozu nye ha okwa di ka minista, komishona dgz
- Ulooro na-ahu maka nhoputa ga-akwusi i na umunwaanyi na- azo okwa ochichi ego iji gbata akwukwo.dgz
NWALE
- Kedu uzo e nwere ike isi kwdo nwaanyi?
- Kedu ebe umunwaanyi mba uwa no mee ogbako ha?
ORU ULO
Dee nkenke ihen maka isiokwu a: E kwesiri inye umunwaanyi okwa ochichi n’ime obodo?
INDINISIOKWU: EBE DI ICHE ICHE E NWERE IKE INYE NWAAANYI NNOCHITEANYA
NDINAYA
Kemgbe e jiri mechaa ogbako umunwaayi ahu na mba Chaina, o burula iwu na otutu mba di iche iche na-aga na- ekekpuru umunwaanyi opekata mpe okwa naato n’ime uzo iri. Ebe mba Naijiria so binye aka na mkpebi a, govmenti na- ahukwa na umunwaanyi nwere ndi nnochite anya n’okwa niile a na-eke n’ala anyi. A na-eme nke a n’ogo govment etiti, nke steeti nakwa nke ime obodo.
Ufodu okwa ndi a gunyere:
[mediator_tech]
i. Okwa minista
ii. Okwa komishona
iii. Odeakwukwo okputorokpu na ministry
iv. Odeakwukwo na-ahu maka mmuta
v. Ndi isi n’ulooru mgbakwasi govmenti
vi. Ndi isioche komitii n’ulo okpako omebeiwu
vii. Ndi isioche otu bood
viii. Ndi nlekota ochichin ime obodo e mebeghi nhoputa
NWALE
Deputa ebe niile e nwere ike inye umunwaanyi ikike nnochiteanya
ORU ULO
- Otu n’ime ndi a esoghi uzo e si enye umunwaanyi nkwado umunwaanyi (a) Aga enye ha nsopuru ruru ha (b) Ndi omebe iwu ga na- emebe iwu ga na- akwalite onodu umunwaanyi (c) A ga-enye umunwaayi ohere agumakwukwo n’efu (d) Ha agaghi-eso na-atuputa alo
- Umunwaayi mba uwa gbakoro na mba Chaina n’afo —— (a) 1996 (b) 1995 (c) 1991 (d) 1985
- Kedu nke na agunyeghi n’ebe e nwere ike inye nwaaanyi nnochiteanya (a) ibu igwe na-achi obodo onye isi (b) okwa minista (c) Okwa komishona (d)Odeakwukwo na-ahu maka mmuta
- E mere ogbako umunwaanyi na mba ——— (a) chile (b) kwara (c) Chaina (d)Legoosi
- Umunwaanyi kpebiri n’ogbako ha nwere na-aga na-edobere ha opeka mpe okwa ——– n’ime okwa iri o bula e keputara (a) ano (b) ato (c) ise (d) abuo
IZUUKA NKE ANO (WEEK 4)
ISIOKWU: AHUIKE: MKPARITAUKA BANYERE ORIA DI ICHE ICHE
NDINISIOKWU: ORIA DI ICHE ICHE DI KA HIV/AIDS, ORIA MMEKO NWOKE NA NWAANYI
Ahuike
Ahuike putara mgbe mmadu anaghi aria ahu, na-eri erimeri nke oma, na-enwe aguu iri ya, ma di ike oru.
Mkparitauka Banyere Oria Di Iche Iche
A na-esi na mkparitauka ama ihe mmadu bu n’uche maka na asi na okwu e kwuru ekwu bu uche ahuru anya. ka anyi huzie mkparitauka di n’etiti ndi enyi abuo bu umuakwukwo, banyere oria di iche iche. Aha ndi ahu bu Ikenna na Chike.
Ikenna Afo niile a na- agba ogwu mgbochi. Kedu ihe a ga-akpo nke a?
Chike Nnaa o dikwa egwu
Ikenna Echeghi m na o bu naani n’ala anyi ka a na-agba ya n’ihi na o nweghi ebe o bula mmadu no oria adighi. kama oria ga-ekpochapu mmadu si gbara gawa
Chike O buru na ha ga-enwe ike ichoputa ogwu nke e ji egbochi oria iba kpamkpam, ga- aga amagbu onwe ya n’ihi na o bu
Ikenna Nke a na-akpo HIV/AIDS di ka onyila nwa Bekee ogwugwu.
[mediator_tech]
Chike Nnaa a siri na nke ahu e nweghi ogwu ma oli
Ikenna I makwa na an-ana- esi ebe a na-akpu isi bute ya
Chike Ugbu a ka I gwara m nke bu eziokwu. Aga m agwa nna m ka o zut, ara m klipa, n’ihi na mgbochi oria ka ogwugwo.
NWALE
- Gini bu ahuike?
- Deputa oria abuo a ruturu aka na mkparitauka a
ORU ULO
Deputa oria ise I maara na-emekpa ndi mmadu ahu
NDINISIOKWU: Oria Di Iche Iche Di ka HIV/AIDS, Oria Mmeko Nwoke na Nwaanyi
NDINAYA
O di otutu oria na-emekpa ndi mmadu ahu ugbu a. Kemgbe oria ndi a jiri puta, ndi be anyi abaala ha aha di iche iche.Ufodu oria a na-ebute site na mmeko nwoke na nwaanyi bu ndi a:
i. Gonoria
ii. Sifilis
iii. HIV/AIDS
Oria ndi ozo bu:
i. Iba
ii.Taifoid fiva
IZUUKA NKE ISE (WEEK 5)
ISIOKWU: Ihe Na-ebute Oria Di Iche Iche
Gonoria: Gonoria bu oria mmeko nwoke na nwaanyi. o bu nje a na- akpo gonokokus na-ebute ya. o na- aga mee onya n’ohere e si anyuputa maamiri. nke a na-emekwa ka inyu maamiri na-afu ufu.
Sifilis: Nke a bu oria ozo e si na mmeko nwoke na nwaanyi ebute. nje na-ebute ya ka a na-akpo Triponima palidum.
HIV/AIDS: Nke a bu oria obirinajaocha. HIV putara human imunodifishensi vairos. vairos bu nje a naghi e ji anya nkiti ahu. o na-epekari mkpuru aja hinne
NJE OBIRINAJAOCHA
ONYE NA-ARIA ORIA OBIRINAJAOCHA
AIDS putara akukwayaad imuno difishensi sindrom. A na-ebute oria site na mmeko nwoke na nwaanyi.[mediator_tech]
Oria iba: I ba bu oria nke otutu mmadu na- aria. Nje na-ebute ya ka a na-akpo plasmodium. A bu anwuta a na-akpo anofiles na-ekesa ya. O taa onye bu nje a, o miri obara ya gaa minyere onye ozo o ga- ata.
Taifoid fiva: O bu nje a na- akpo salmonella taifosus na-ebute oria a. ijiji bu isi sekpun nti na-n ikesa ajo oria a. onye o bula riri nri ijiji ahu bekwasiri na ya ebutela oria a.
NWALE
Kedu ihe na-ebute oria ndi a:
- Gonoria
- Sifilis
- HIV/AIDS
- Oria iba
- Taifoid fiva
ORU ULO
Deputa oria ise na-emekpa ndi mmadu ahu
NDINISIOKWU: Mgbochi Oria Di Iche Iche
Uzo di iche iche e nwere ike isi gbochie oria ndi a bu nke a:
Gonoria: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi
Sifilis: kwusi mmeko nwoke na nwaanyi
HIV/AIDS: Gbara mmeko nwoke na nwaanyi oso tutu i luo nwaanyi ma o bu di.
Oria iba: E kwela ka mmiri na-ado aghara aghara n’okirikiri ebe ibi, kawa ahu na-ekpuchi mmiri i dowara n’ulo ekpuchi ka anwuta ghara ino n’ime ya mubaa, na-arahu n’ime neet, tupu i lakpuo gbaa ogwu anwu.
Taifoid fiva: A ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a nuo. A ga- achoputa ndi bu nje taifoid gwoo ha, tupu o fee ndi ozo. dgz
NWALE
- Deputa oria ndi e nwere ike ibute site na mmekorita nwoke na nwaanyi
- Deputa uzo niile e nwere ike isi gbochie oria ndi ahu
ORU ULO
- Ahuike putara ———– (a) inwe ahu siri ike (b) mgbe mmadu anaghi aria ahu (c) iriju afo (d) ahu kporo nku
- HIV putara ————- (a) human ifishensi vairos (b) homen imunodefensiv vairos (c) human imunodifishensi vairos (d) human imudifishensi vairos
- Nje na-ekesa oria gonoria ka a na-akpo ——— (a) gonokokus (b)Triponima palidum (c) difishensi sindrom (d) plasmodium
- O bu nje a na- akpo ———— na-ebute oria taifoid five (a) plasmodium (b) gonokokus (c) Triponima palidum (d) salmonella taifosu
- Aha ozo a na-akpo oria HIV/AIDS bu ———— (a) ocha n’anya (b) otoro (c) obirinajaocha (d) ajaocha
IZUUKA NKE ISII (WEEK 6)
ISIOKWU: Ahirimfe
NDINISIOKWU: – Ndiugbua -Ndinaazu – Ndiniihu
Ahirimfe (Simple Sentence)
NDINAYA
Ahirimfe bu ahiriokwu nwere otu ngwaa, ma na- eziputakwa otu echiche. Otu n’ime njirimara ahirimfe bu na o na-anaghi eto ogologo.
Omumaatu
- kwuo okwu
- Oriri nri
- Chi zoba anyi
- Ha abiala
- Okeke bin’Aba
- Obi ziri m ozi
- Ekwuchaala m
- Onwere ego dgz
[mediator_tech]
Tensi
Ahiriokwu o bula nwere ike idi na eziputa ihe merela eme, nke na- eme ugbu a,
ma o bu nke ga-eme n’odinaihu. O bu site na tensi e jiri dee ya ka e si ama nke o na-eziputa.
Tensi ndi anyi ga-eleba n’ebe a bu ndi a:
- Ndiugbua
- Ndinaazu
- Ndiniihu
NWALE
- Gini bu ahirimfe?
- Nye omumaatu tensi ato
ORU ULO
Deputa omumaatu ahirimfe ise
NDINISIOKWU:
- Ndiugbua (present tense)
-Ndinaazu (past tense)
- Ndiniihu (future tense)
Ndiugbua (Present tense)
NDINAYA
Tensi ndiugbua na-eziputa ihe na-eme ugbua akwusibeghi. O bu nnyemakangwa ka e ji eziputa ndi ugbuo
O bu Nnyemaka ngwaa ‘na’ ka e ji eziputa ndiugbua.
Omumaatu
- O na- asa akwa
- Ngozi na-eri nri
- O na-abia ebe a
- Nkechi na-agu akwukwo
- Ha na-echu mmiri
- O na-agba egwu dgz
Ndinaazu (Past tense)
Nke a na-eziputa ihe garala aga
Omumaatu
- Eze riri nri
- O biara ebe a
- O sara efere
- Chinedu luru ogu
- O gara ahia
- Emeka gbara bool dgz
Ndiniihu (Future tense)
Tensi nke a na-egosiputa ihe ga-eme n’odiniihu. O bu Nnyemaaka ngwaa ‘ga’ ka e ji eziputa ya.
Omumaatu
- Ha ga-aga ahia n’ehihe
- O ga-agu akwukwo
- Nneka ga-aza ulo
- Chidi ga-asa efere na mgbede
- Ha ga-abia echi
- Aga m ede leta dgz
NWALE
Kowaa tensi ndi a, ma nye omumaatu abuo na nke o bula
i. Ndiugbua
ii. Ndinaazu
iii. Ndiniihu
ORU ULO
Mee ahirimfe ndi a ka ha buru tensi ndinaazu
- Ngozi ga-aga ahia
- Chike na-eri nri
- O na-asa ahu
- Ha ga-abia be m
- O na-ekwu okwu
IZUUKA NKE ASAA (WEEK 7)
ISIOKWU: EDEMEDE NDUZI BANYERE IDEBE GBURUGBURU OCHA
- NKEBI EDEMEDE
- NHAZI EDEMEDE
[mediator_tech]
- ASUSU NKA
NDINISIOKWU: Edemede Banyere Idebe Gburugburu Ocha
Edemede
NDINAYA
Edemede bu ihemmadu cheputara ma detuo n’akwukwo maka igu ya agu. edemede o bula nwere usoro e si ede ya.
Nhazi Edemede
Edemede ahaziri nke oma kwesiri inwe mmalite, eteiti, na mmechi. Mmalite edemede bu ikwu okwu ole ole na-akowa ihe a na-ede maka ya. o bu nankebi nke mbu ka a n-akowaputa nke a.
Etiti edemede bu ebe a na-ekwucha ihe niile e nwere ikwu gbasra isiokwu. e be a ka nkebi niile di n’edemede ahu ga-aputa.
Mmechi bu ebe a na-achikota ihe niile e kwuru. O bukwa ebe a ka onye dere edemede ahu nwere ohere ikwu echiche ya gbasara isiokwu ahu.
Asusu Nka
Edemede o bula bu igbo izugbe ka e kwesiri iji dee ya. o bu ka onye o bula wee nwee ike igu ya ma ghotakwa ya. a ga-ehikwa aka n’anya hu na ahubere iwu utoasusu isi. Atumatuokwu di iche iche dabara adaba ga-adikwa ya, dimka ilu, ukabuilu, akpaalaokwu, ndika, mburu, mmemmmadu dgz.
NWALE
- Gini bu edemede?
- Deputa usoro a na-agbaso n’edemede o bula
ORU ULO
Gugharia ihe a kuziri
NDINISIOKWU: Edemede Banyere Idebe Gburugburu Ocha
NDINAYA
Nke a bu okpurukpu ihe anyi ga-ede gbasara isokwu a
(a) Ihe bu gburugburu na idebe ya ocha
(b) Ndi idebe gburugbiuru ocha gbasara
(c) Mkpa idebe gburuburu ocha di
(d) Uru ma o bu oghom din a idebe gburugburu ocha
Gburugburu bu ebe mmadu bi, nakwa ebe di mmadu nso nke anya nwere ike ihuta. gburugburu gunyere ulo mmadu bi na ebe gbara ya okirikiri. Idebe gburugburu ocha bu site n’ime ulo diri ocha wee ruo ebe anya ledebere.
Idebe gburugburu ocha e nweghi onye o na-aso nso, ma okenye, ma nwata. Mbe nwta na-asauchasi efere na ite, na-azachasi ihu ezi, na mgbe nwoke weere mma na asuchasi ohia din a ngwuru be ya, ha na- edebe gburugburu ocha. ya bu idebe gburugburu ocha bu egwu anaghi aho mmadu.
Idebe gburugburu ocha di mkpa n’ihi na o na-akwalite ahuike. Nke a mere Govmenti ji ama okwa ka ndi mmadu na-edebe gburugburu ha ocha. Govmenti weputakwara ndi ga-aga n’ulo n’ulo achoputa ndi be ha ruru unyi maka ita ha ahuhu.
E nweghi ghom di na idebe gburugburu ocha. Ebe o bu na unyi na-ebutere mmadu oria, isi mmadu debe gburugburu ya ocha a bughi mmegbu. O bu mkpa o di mere Govmenti nke steeti ufodu n’ala Naijiria jiri weputa satodee ikpeazu n’onwa o bula iji debe gburugburu ocha.
NWALE
- Gini bu gburugburu?
- Kedu ihe o ji di mkpa idebe gburugburu ocha?
ORU ULO
Dee edemede nke isiokwu ya ga-abu: Ubochi idebe gburugburu ocha.
IZUUKA NKE ASATO (WEEK 8)
ISIOKWU: OGUGU NA AGHOTAAZA BANYERE IJI MMADU TU MGBERE
INDINISIOKWU: 1. OGUGU 2. NKOWA IHE BU IJI MMADU TU MGBERE 3. UCHE UMUAKWUKWO BANYERE IHE HA GURU
[mediator_tech]
Ogugu na Aghotaaza Banyere Iji Mmadu Tu Mgbere
Ndinaya
Aghotaazaa bu ederede ahaziri nke oma dee ka aguo, ma zaa ajuju na- esote ya. Aghotaazaa abughi so naani ederede. Oge onyenkuzi na- akuzi ihe o bu aghotaazaa ka a na- eme. Oge mmadu abuo na- akparita uka, o bu aghotaazaa ka ha na- eme.
Usoro a na- Agbaso Iza Aghotaazaa
- A ga- agu ahgotaazaa osiiso iji mata isiokwu di n’ime ya
- Gugharia ya nke ugboro abuo, ma tinye anya n’osisa ajuju ndi ajuru.
- Detuo osisa ha ka i na- agu ya nke ugboro ato.
- Naani ihe a juru ka a ga- enye osisa ya n’uzo di nkenke.
- I gaghi ewebata echiche nke gi.
NWALE
- Gini bu aghotaazaa?
- Deputa usoro ato a na- agbaso n’iza aghotaazaa
ORU ULO
Gugharia ihe a kuzirI
INDINISIOKWU: 1. OGUGU 2. NKOWA IHE BU IJI MMADU TU MGBERE 3. UCHE UMUAKWUKWO BANYERE IHE HA GU
IJI MMADU TU MGBERE
NDINAYA
Guo ederede a ma zaa ajuju so ya.
Iji mmadu tu mgbere ma o bu mgbere ohu bu iji mmadu mere ngwaahia. Nke a buzighi na mmadu ji nwaahia atu mgbere, kama o buzi mmadu ibe ya bu ngwaahia. O di egwu. O mee n’ahu onye ozo di ka o mere n’osisi. Mmadu nwere ike juo si olee ndi na-epu ezu elu a nakwa ebe ha si enweta ngwa ahia ha? O bu ndi ocha na ahappu ndi be ha gbaa agu naasaa fee iyi naasaa bia n’ala ndi isi oji bu Afrika izuru ohu.
Iji mmadu atu mgbere malitere n’uwa na senchuri iri na asaaa, digide wee bata na senchuri nke iri na itoolu. Ihe nke a putara bu na iji mmadu tu mgbere
noro n’elu uwa ihe di ka nari afo abuo. Ndi bu ya n’isi bu ufodu mba ndi ocha di ka Briten, Denmak, U.S.A, Fransi, Potugal dgz.
N’afo 1807 ka nkwusi iji mmadu tu mgbere malitere. O bu mgbe ahu ka Briten sepuru aka na ya. Ha nyere aka na-amajakwa mba ndi ozo ka ha kwusi ya.
NWALE
- Gini bu iji mmadu tu mgbere?
- Kedu mgbe iji mmadu tu mgbere malitere?
- Olee n’afo nkwusi iji mmadu tu mgbere malitere?
ORU ULO
- Oge mmadu abuo na-akparita uka o bu ————- ka ha na-eme (a) ahoroazaa (b) aghotaazaa (c) ilu (d) ochi
- Otu n’ime ndi a esoghi n’usoro a na-agbaso n’iza aghotaazaa (a)A ga- agu ahgotaazaa osiiso iji mata isiokwu di n’ime ya (b) Gugharia ya nke ugboro abuo (c) i ga- ewebata echiche nke gi (d) Naani ihe a juru ka a ga- enye osisa ya n’uzo di nkenke.
- Iji mmadu tu mgbere putara ———- (a) alumdi (b) iji mmadu mere ngwaahia (c) iji mmadu nara ego (d) iji mmadu chuo aja
- Iji mmadu atu mgbere malitere n’uwa na ———– (a) senchuri iri na asaaa (b) senchuri iri na asato (c) senchuri iri (d) senchuri ise
- Nkwusi iji mmadu tu mgbere malitere n’afo ———- (a) 1807 (b) 1808 (c) 1907 (d) 1908
IZUUKA NKE ITOOLU (WEEK 9)
ISIOKWU: OMENAALA NA OMENAALA DI ICHE ICHE
INDINISIOKWU: OMU NA URU OBARA
Omenaala (Culture)
NDINAYA
Omenala bu uzo ndi obodo o bula di iche iche si ebi ndu ha ka e ji mara ha. Di ka udi uwe ha na-eyi, udi nri ha na-eri, ma o bu nkwenye di iche iche ha kwenyere. Ndi Hausa na-eyi agbada oge niile, nri ha bu tuwo. Nri ndi Igbo na- eyi abada. Nri ha bu ji na akpu. Nke a bu omenala ha.
Nihi ya omenala igbo bu uzo ndi igbo si ebi ndu ha di iche iche. Anyi maara na ndi igbo bu ndi na-eri nri akpu na ji. Ha na-eme kwa emume di iche iche di ka ilu nwanyi, iwa oji ohuu, ikuputa nwa wdg.
OMENAALA DI ICHE ICHE
- Omu nkwu
- Iri ji ohuu
- Ilu nwaanyi
- Iwa oji
- Ikwa ozu
- Iga omugwo
- Ikuputa nwa
- Ejiji ndi igbo dgz
Ilu Nwanyi
EJIJI NDI IGBO
NWALE
- Gini bu omenaala?
- Deputa omenaala ise I maara
ORU ULO
Dee nkenke edemede maka otu omenaala a na-eme n’obodo unu
INDINISIOKWU: Omu na Uru Obara
NDINAYA
Omu bu igu nkwu nke na-asahebeghi nke oma, na- acha edo-edo. omu na-egosiputa otutu ihe n’ala igbo.
[mediator_tech]
Uru Omu Bara
- A na-eji omu ebu ozu
- E ji omu achu aja
- E ji omu eke ngwugwu
- A na-eji omu edozi esemokwu
- A na-eji omu egosi oke ala mmadu na ibe ya
- E ji ya amata odu ahia onye nwuru anwu
- A na-eji omu egosi ebe ihe egwu di
- A na-eji omu eti mmonwu
- A na-eji omu akpa akupe
- E ji omu egosi ebe ulo arusu di dgz
NWALE
- Gini bu omu?
- Kpoputa uru ise omu nkwu bara
ORU ULO
- Omenala bu uzo ndi obodo o bula di iche iche si ebi ——— ha (a) n’ulo (b) ndu (c) nduzi (d) n’ezinaulo
- Omenaala gunyere ihe ndi a, e wezuga ————- (a) ilu nwaanyi (b) iwa oji (c) imu nwa (d) I ga- omugwo
- A na-enweta omu site n’otu n’ime osisi ndi a (a) nkwu (b) Aki (c) Ube (d) Ukwa
- Kedu ka omu si acha? (a) oji (b) ocha (c) edo- edo (d) akwukwo ndu- akwukwo ndu
- Otu n’ime ndi a esoghi n’uru omu nkwu bara (a) A na-eji omu ebu ozu (b) E ji omu achu aja (c) E ji omu eke ngwugwu (c) A na-eji omu edozi esemokwu (d) E ji omu e si nri
IZUUKA NKE IRI (WEEK 10)
ISIOKWU: ORU ‘NA’ NA- ARU N’ASUSU IGBO.
INDINISIOKWU: ORU ‘NA’ NA-ARU GAA N’IHU: NA DI KA NJIKO, ‘NA’ DI KA NNYEMAKANGWA
Oru ‘Na’ na- aru N’asusu Igbo
NDINAYA
‘Na’ na- aru oru n’asusu igbo n’uzo ndi a:
- ‘Na’ di ka mbuuzo
- ‘Na’ di ka njiko
- ‘Na’ di ka Nnyemakanwaa
‘Na’ di ka mbuuzo
A na- eji nke a egosiputa onodu ihe. o buru okwu ‘Na’ na esote bidoro na udaume, a ga-ewepu ‘a’ tinye rikom elu (’) di ka n’
Omumaatu
- Azu di na ngiga
- Mmiri di n’ite
- Akwukwo m di n’elu oche
- Chioma no na klaasi
- Ego di n’akpa
NWALE
Mee ahiriokwu ato na-egosi ebe ‘na’ na-aru oru di ka mbuuzo
ORU ULO
Deputa omumaatu ise ebe ‘na’ na-aru oru di ka mbuuzo
NDINISIOKWU: ORU ‘NA’ NA-ARU GAA N’IHU: NA DI KA NJIKO, ‘NA’ DI KA NNYEMAKANGWAA
‘Na’ di ka njiko
NDINAYA
E ji ‘Na’ejikota mkuruokwu na mkpuruokwu, aha na aha, nnochiaha na nnochinaha, nkebiokwu na nkebiokwu, nkebiahiriokwu na nkebiahiriokwu.
Omumaatu
- Ji na ede bu ihe oriri
- Ifeoma na Ugochukwu bu nwanne
- Azuru m azu na osikapa
- Mu na ya bu nwanne
- Aki na ukwa bu enyi eze
- Nwaanyi ahu na nwa ya na-ese okwu.
‘Na’ di ka Nnyemakangwaa
‘Na’ di ka Nnyemakangwaa na-enyere ngwaa aka ikowaputa nke oma ebumnuche ya bu ngwaa n’ahiriokwu o no nay a. A na- eji akara uhie
uhie (-) edesa ya na ngwaa ahu o na-enyere aka.
Omumaatu
- Anyi na- aga uloakwukwo
- Chinedu na-eri nri
- Anyi na- ele ule
- Umunwaanyi ahu na-aga ahia
- Nne m na-esi nri
NWALE
- Deputa uzo ato na na- aru oru n’asusu igbo[mediator_tech]
- Nye omumuatu abuo ebe ‘Na’ na- aru oru di ka njiko
ORU ULO
Deputa omumaatu ise ebe ‘Na’ na- aru oru di ka Nnyemakangwaa
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 11) – Mmeghari
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 12) – Ule
IZUUKA NKE IRI NA OTU (WEEK 13) – Mmechi