IGBO LANGUAGE SSS 2 SECOND TERM

Table of Contents

 

SECOND TERM: E-LEARNING NOTES

 

SUBJECT:    IGBO LANGUAGE

 

CLASS:           SS2

 

SCHEME OF WORK

 

WEEK           TOPIC

1       Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga (B) Ogugu akwukwo a hooro

2-3   Atumatuokwu-A)mputara ya B)Udidi ya C)Omumatu ha D)uru o bara n”agumagu.I choputa

atumatuokwu n’ime agumagu ederede.I tinye ha n’ahiriokwu na ikowa ha

4    Ikowa asusu nka na inye omumatu dika ilu ,ukabuilu, akpalaokwu dgz

5-6   Usoro odide Igbo –Iwu nsupe Igbo-Oru “na” n’asusu Igbo.Mgbakwunye na nsokwunye. Okwu a     na-edeko onu na nke a na- edesa edesa. Udaolu.

7     .Ezumike nNta

-8   Echichi na echimechi odinaala-Udidi echichi di iche iche. Mmalite ha, Etu esi aba ha na oru di                 iche  iche ndi chiri echichi na-aru

  1. Echichi na  echimechi: oru ndi  chiri echichi uru echichi..
  2. Ogugu na aghotaazaa.
  3. Edemede— .Edemede nka na udidi ya.Uru na njirimara ya.Ide ya ede.
  4. Mmeghari na ule
  5. Ule na mmechi

 

 

IZUUKA MBU (WEEK1)           UBOCHI …….

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU                      –           Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga  (B) Ogugu akwukwu a hooro?  Oja Dufuo Dike Nke Ray C. Anene

NDINAYA:1. Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga.

  1. Ogugu akwukwo a hooro: Oja Dufuo Dike.

 

IZUUKA ABUO (WEEK 2)UBOCHI——-

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU                      –           Atumatuokwu

NDINAYA:    1. Nkowa atumatu okwu, udidi ya, na omumaatu ha.

  1. Uru o bara n’agumagu.

 

NDINISIOKWU 1: NKOWA ATUMATU OKWU, UDID YA, NA  OMUMAATU HA

Atumatu okwu (Figures of speech) Atumatuokwu bu okwu amamihe nke nwafo igbo ji ekwu o kwu oge o na achoghi ikpo ihe aha kpomkwem. E ji ya acho ederede, ma o bu okwu mmadu na – ekwu mma. E nwere ike ikowakwa  ATUMATU OKWU dika nka e ji acho asusu mma maobu ederede maobu ekwurunonu. Ndi igbo na- ewe onye na-adighi aghota atumatu okwu dika ofeke.Atumatu okwu na-adi mfe n’onu mana mputara ya na-adi omimi.

 

ATUMATU OKWU DI ICHE ICHE:                                         

  1. Ilu

ILU                                                                   NKOWA YA

  1. O bu otu aka ha O bu otuike mmaduha ka o na-eme ihe.

nwaanyi ka o na-

atukwasa di ya

  1. Isi kote ebu o gbaa ya Ihe onye choro ka o na-ahu.

iii.        Agbisi gbaa otule o                 Ihe mee mmadu onyeahu a muru ako

muru ako

  1. A nyukoo mamiri onu E  jikota aka onu ruwa oru a ruputa nnukwu ihe

o gbaa ufufu

  1. Ukwa ruo oge ya odaa Oge ihe obula ruru, o mee
  2. Aka aja aja na-ebube Onye ruo, ori e

onu mmanu mmanu

vii.      Nwatakiri jide oku,jide mma

o         oku ereghi yam ma eyie ya         onye na –acho okwu na uka ga- enwetariri ya.

2.Akpaalaokwu (Idioms)

Ndi igbo ji akpaakokwu ekwu okwu oge ha na-achoghi ikpo okwu aha kpomkwem

Omumaatu.

Akpaalaokwu                         Nkowa ya

  1. O gbara okwu oto O kwuru ihe niile ka osiri mee kpomkwem.
  2. O bu okuko udummiri O na-ariakari oria

iii.        Nkita anaghi eri nsiya O naghi enye mmadu ihe

  1. Okpuru iku anya Ihere anaghi eme ya.
  2. Mmanu emetula n’akwa Ihe joo emeela
  3. Anya huru ya ndi mmuo Ihe mesiri ya ike nkeukwuu

vii. O na-eme aka ntutu                      O na-ezu ohi.

 

  1. Okwuntughi / Okwuntabire/Okwumgbawa onu (Tongue Twister)

 

Omumaatu:

  1. Papa Pita patara popo, panye papa Polu wdg
  2. Nwaanyi na-eri anu ele I na-ere anu ele ere, ka i na-eri anu ele eri.
  3. Agwugwa gwam gwam gwam(Riddles).

 

Agwugwa            Usa ya
Gwa m ebu uzo ekpe

azu

 

     Nkita
Gwa m oti nwata ihe n’ihu nne ya

 

     Aguu
Gwa m etu ibe ji zuru uwa  onu

 

    Onwa

 

 

Gwa m o nwere anu

enweghi okpukpu

 

Ejule
Gwa m o no n’elu a bara ala mba.

 

 Egbeigwe

 

  1. Mburu (metaphor)

Mburu bu atumatuokwu na – ekwu na ihe a na-       okwu maka ya buzi ihe ahu kpomkwem.

Omumaatu

Mburu                                                            Nkowa ya

  1. Udo bu nnunu Udona ekwu oke okwu

 

  1. Ubaka bu agu Ubaka siri ike

iii.        O bumbe                                             O na-agho aghugho

  1. Ada bu anyanwu ututu Ada mara mma

 

  1. Myiri/ndika (simile)

Myiri bu atumatu okwuna-ekwu na ihe yiri ibe ya,   ma o bu di ka ibe ya omumaatu.

  1. Chike di ka nna ya
  2. O na-agho aghugho ka mbe

iii.        O di ka ezi

  1. Ugo di ka agu
  2. Okeke di ka mmonwu

 

  1. Mmemmadu (personification)

Nke a bu atumaatu okwu na-agwa ihe na-abughi     mmadu okwu ka aga-asi na o bu mmadu.

Omumaatu

  1. Mmanya ahu mara m aka nti
  2. Aguu gworo okoro iba

iii.        Onwu olee ebe ike gi di ozo?

  1. Mgbirigba kwuru na oge ezuola
  2. O nwu kuoro ibekwe aka n’uzo taa wdg

 

  1. Egbeokwu (Hyperbole)

Nke a na-etinye okwu nnu na ose iji mee ka o too uto na nti.

  1. Okpurukpu anya ya ha ka onwa.
  2. Isi ya ha ka ogbe ukwa

iii.        Uwa niile biara agbamakwukwo Amaka

  1. Afo ya ha ka ite mmiri
  2. Oke di n’ulo okeke ruru otu nde.

 

  1. Ucheuda (Ideophone)

O bu site n’uda ihe ahu dara ka eji ama ihe o bu

Omumeatu

  1. Ogbatumtum
  2. Isi akwu dara gbim

iii.        Gham gbam

  1. Dum Dum

 

  1. Nsinuuda (onomatopia)

            A na-esite ka uda okwu ahu si di wee ghota ka o      kwu ahu si ditabe.

Omumaatu:                              

  1. Oku a na-enwu zaa
  2. Mmiri ahu zoro patapata kwusi.

iii.        Ukwu ya na-ede jimjim n’ala.

 

11.Nkwuma (Euphemism)

E ji nke a eziputa ihe joro njo ma o bu ihe nwute n’uzo o ga-adika o bu ihe oma.

Omumaatu

  1. O bulaala akwukwo – O nwuola
  2. O jighi anya ahu nwaanyi – O na-achukari nwaanyi

iii.        O jula gari – O nwuola

NNWALE

  1. Gini bu atumatu okwu?
  2. Deputa atumatu okwu ise.
  3. Nye omumaatu ilu ato.

 

NDINISOKWU 2: URU ATUMATU OKWU BARA

Atumatuokwu bara otutu uru nke gunyere ndi a:

  1. E ji atumatu okwu acho asusu igbo mma.
  2. E ji ya etinye ofeke na gbagharia

iii.        A na-eji atumatuokwu ekwu okwu ufodu a na-achoghi ikwu hoo haa.

  1. E ji ya ako ofeke onu maka na o ghotaghi nke ekwe na-aku.
  2. A na-ekwenyere onye na-ejikari ilu ma o bu atumatokwu o bula ekwu okwu ugwu na nsopuru.
  3. Ndi ode akwukwo ji atumatu okwu acho edemede ha mma.

NNWALE

  1. Deputa atumatu okwu iri i maara.
  2. Nye ommaatu abuo na nke o bula maka atumatu okwu ndi a
  3. ilu ii. akpaalaokwuiii. Egbeokwu iv. Myiri

 

Nchikota Nnwale (General Evaluation)

Tumbom Tumbom (Hopata nke a choro)

  1. O bulaala akwukwo. Atumatuokwu a bu(a) ilu (b) nkwuma (ch) Akpaalaokwu (d) Egbeokwu
  2. Chika yiri nne ya. Atumatuokwu a bu (a) ilu (b)mburu (ch) myiri (d) Agwugwa
  3. Ugomma bu ewu. Atumatu okwu a bu (a) mburu (b) mmemmadu (ch) Myiri (d) ilu
  4. Afo tara ya mmiri. Nke a bu (a) Mburu (b) ilu (ch) Nsinuuda (d) Akpaalaokwu
  5. Nwoke bidoroaka n’ala na- anyu nsi, mbili ya na-ara ahu(a) Myiri(b) ilu (ch) ukabuilu (d) ukabuilu

Edemede Nnwale (Essay Test)

  1. Deputaa ilu ato i maara
  2. Were mburu mee ahiriokwu abuo

Oru ngwucha izuuka (Weekend Assignment)

Guo Atumatu okwu ufodu n’Igbo maka Sinio Sekondiri 2

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo (Pre-reading Assignment)

Guo maka atumatu okwu n’ime laptop gi.

Akwukwo nlere anya( REFERENCE TEXT)

Ntuziaka Maka Udaasusu, Utoasusu, na Omenaala Igbo Nke Ndi Sekondiri Ukwu Nke Mbu (ss1) NkeOgechukwu Leti Okoye.InnogeTrading Company Limited.

 

IZUUKA ATO  (WEEK 3)UBOCHI——–

IHE OMUMU                           –           ASUSU IGBO

KLAASI                                     –           SS 2

ISIOKWU                                  –           Ichoputa atumatu okwu n’ime agumagu ederede, itinye ha n’ahiriowu.

NDINAYA         1:         Ichoputa atumatuokwu n;ime agumagu ederede.

  1. Itinye atumatuokwu n’ahiriokwu na ikowa ha.

 

NDINISIOKWU1.ICHOPUTA ATUMATUOKWU N’IME AGUMAGU EDEREDE

Guo ederede a ma zaa ajuju na-esote ya.

Ugomma bu anyanwu ututu.  O toro ogologo ka nne ya, mma ya na – enwu zuu.  Ntutu isi ya di yorii na-eji  kpikpikpi.

Nna ya zutaara ya ogbatutum o na – eji aga akwukwo O dighi ihe koro ya uko n’ihi nanne na nna ya nwere ego nke ukwuu.  Mana nkita a naghi eri nsi ugomma.

 

Zaa ajuju ndi a

  1. Choputa atumatu okwu ndi ewebatara n’ederede a

Usa ya

Atumatu okwu ndi ewebatara n’ederede n bu ndi a

  1. Mburu: Ugomma bu anyanwu ututu.
  2. Nyiri: O toro ogologo ka nne ya
  3. Nsinuuda: zuu yorii, kpikpikpi
  4. Ucheuda: Ogbatutum
  5. Akpaala okwu: Nkita anaghi eri nsi ugomma

NNWALE:

  1. Deputa udi atumaatu okwu bu ndi a
  2. O bu anyanwu ututu
  3. Zuu, yorii, kpikpikpi

iii.        Ogbatutum

 

NDINISIOKWU 2: ITINYE ATUMATU OKWU N’AHIRIOKWU NA IKOWA HA

Ahiriokwu                  Udi atumatuokwu          Nkowa ya

                                                           

  1. Isi Ada ha ka Egbe okwu                   Isi Ada buru ibu

Ogbe ukwa

 

  1. O na-eji ka       Myiri                     O na-eji oji

Unyi

 

  1. Ezeudo bu Mburu             Ezendo siri ike

Agu

 

  1. Mmiri na-ezo Nsinauda         Mmiri na-ezo

Patapata

 

  1. Ibeka na-eme AkpaalaokwuIbeka na-ezu ohi

Aka abuo

 

  1. Awo anaghi Ilu                    Ihe aneghi emena nkiti

Agba oso ehihe

n’efu

 

  1. Aguu gworo anyi.Mmemmadu Agwu guru anyi nke ukwuu uyiahu

Iba unyiahu

 

  1. Ndi biara Egbeokwu        Otutu mmadu biara

Mmemme ahu                                                mmemme ahu.

Kariri aja ala

 

  1. Obi agafeela Nkwuma          Obi anwuola

 

  1. O dara dimdim Ucheuda          O dasiri uda ike

 

NNWALE:

  1. Were atumatu+okwu abuo mee ahiriokwu.
  2. Kowaa ihe atumatu okwu ndi a putara
  3. Awo anaghi agba oso ehihie n’efu
  4. O na-eji ka unyi

iii.        O toro ogologo ka nne ya.

 

NCHIKOTA NNWALE

Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

  1. O gefeela. Atumatu okwu a bu(a)  Nkwuma   (b) ilu   (ch) egbeokwu  (d) mburu
  2. Chidimma nne ya. Nke putara na (a) chidimma you une ya (b) chidimma ga-adika nne ya (ch) Chidimma yiri nne ya (d) Chidimma nwere nne
  3. Nkita anaghi eri nsi ya putara (a) Nkita agaghi eri nsi ya  (b) O naghi enye mmadu ihe (ch) Nkita anaaghi eri nsi (d) O na-enye mmadu ihe.
  4. O dara dim dim. Atumatu okwu a bu (a) Uchenda   (b) Nkwuma (ch) myiri (d) mburu.
  5. Ezeudo bu Agu putara (a) Ezeudo na-eme ka agu  (b) Ezeudo yiri agu (ch) Ezeudo esighi Ike (d) Ezendo siri ike.

EDEMEDE NNWALE

Denye otu omumaatu atumatuokwu ndi a

  1. Ilu
  2. Myiri
  3. Agwugwa
  4. Akpaagbokwu
  5. Mburu

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Guo maka atumatuokwu ufodu n’Igbo maka Sinio Sekondiri 2

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Guo isiokwu ndi a na laptop gi ilu ukabuilu, Akpaalaokwu wdg.

Ihe omume nke ngwucha Izuuka

Deputa uru ato atumatu okwu bara

Akwukwo nlere anya(Reference text)

Ntuziaka maka udaasusu maka ndi Sekondiri 2 nke ogechukwu 1.02004.  Innoge &Sons Company Ltd.  Igbo Ogbaraohuu nke Chuks F.D 2003.  C. Dems Books Aba

Nchikota Ihe omumu nke asusu Igbo maka ulo Sinio Sekondiri nke & Maazi, Ngoesi M.C.

 

 

 

IZUUKA  ANO (WEEK 4)UBOCHI——-

IHE OMUMU                           –           ASUSU IGBO

KLAASI                                     –           SS 2

ISIOKWU          – Ikowa asusu nka na inye omumaatu di ka ilu, ukabuilu, akpaala – okwu.

NDINAYA         1.  Ikowa asusu nka: ilu na ukabuilu.

  1. Asusunka: Ikowa akpaalaokwu, na inye onmmaatu di iche iche.

 

NDINISIOKWU 1.IKOWA ASUSU NKA: ILU NA UKABUILU

 

ILU       (PROVERBS)

Nke a bu asusu juputara n’amamihe. O bu mmanu ndi Igbo ji eriokwu.  Okwundi Igbo anaghi ezucha oke ma o buru na ilu adigi na ya.

Omumaatu.

ILU                                                       NKOWA YA

  1. A nyukoo mamiri onu Ejikota aka onu ruwa oru a ruputa nnukwu ihe.

O gbaa ufufu.

  1. Ukwa ruo oge ya Ihe ruo oge ya o mee/ihe niile nwere oge.

O daa.

  1. Onye achoghi ka a O buru na ichoghi ka e mesie gi ike a chokwala okwu/onye na

Kpoo ya ohu eme-       -achoghi ntaramahuhu  ya erube isi

Kwala ka ohu

  1. Okuko chiri umu O bu etu onye siri nwee iheka mkpa ya hakwuazi.

O chiri ekwuruekwu

 

UKABUILU (Parable)

Ukabuilu bu ilu e tinyere n’udi nkenke akuko.Nghota ya n – adika nghota ilu.  O bu uka ekwuru ekwu burukwa ilu.

 

Omumaatu

  1. Akpa si n’elu nkwu daa n’ala, okuko gbara bia tuo ya onu, o wee juo okuko si ya, “Enyi m olee mgbe o bidoro sewere anyi”.
  2. Okuko siri umu ya ha na-atu ji ha na-atukwa mgborogwu ka o ga-abu onye nwe oru gwuru ji ya, ha atuwa mgborogwu.

 

NNWALE:

  1. Gini bu ukabuilu?
  2. Deputa ilu abuo, ma nye nkowa ha.
  3. Nye omumaatu ukabuilu

 

NDINISIOKWU 2:         AKPAALAOKWU (IDIOM)

Akpaalaokwu bu usorookwu na-etinye nghota di omimi n’ahiriokwu.

Omumaatu

Akpaalaokwu                                     Nkowa

  1. Adannana-eme aka abuo Adanna na-ezu ohi
  2. Ndi uwe ojii na-ana aka azu Ha na-eri ngari (bribe)
  3. Ngozi nwere anya ukwu Ihe anaghi ebu yan’anya.
  4. Afo tara ya mmiri O nwere obi ojoo
  5. Inwu o kwa n’aka Ipu n’uzo ututu
  6. Edi soro ya onu O na-arahu oke ura
  7. Iji eze ekpe ekwere             Ita oke ahuhu
  8. Ita ojiaka Ikwe n’aka
  9. Ipu eze elu Ime aru
  10. Ire idi nko Ikwu oke ekwurekwu
  11. Nti ike A dighi erube isi
  12. Igba ugba nwamkpi ichula mmadu mgbe oge ula ya erubeghi
  13. Ihusi anya Ita ahuhu.

 

NNWALE:

Ikowaa ihe akpaakokwu ndi a putaraa

  1. Ime aka abuo
  2. Ihusi anya
  3. Ije eze kpee ekwere
  4. Afo ita mmiri.

NCHIKOTA NNWALE

Tumbom Tumbom (Hoputa nke a choro)

  1. Afo tara ibekwe mmiri. Nke a bu(a) Mburu  (b) akpaalaokwu  (ch) ilu   (d) ukaburlu
  2. Adanne na-eme aka abuo. Nke putara (a) Adanna na-ezu ohi  (b) Adanna nwere aka abuo (ch) Adanna ji aka abuo eme ihe  (d) Adanna nwere aka abuo,
  3. Iji eze ekpe ekwere putara (a) iji eze atabi ekwere (b) iji eze ata ihe  (ch) ita oke ahuhu (d) iri uru
  4. Ukwa ruo oge ya o daa. Nke a bu (a) mburu(b) Egbeokwu (ch) ukabuile (d) ilu
  5. Ipu eze elu putara (a) ime aru (b) izu ohi (ch) ita ahuhu (d) ime isiike

 

EDEMEDE NNWALE

  1. Deputa ilu ato i maara
  2. Nye ommaatu akpaalaokwu ise i maara

 

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Guo  isiokwu a na laptop gi: Usoro odide Igbo: Iwu nsupe Igbo

Ihe Omume nke ngwucha izuuka

Deputa oru ato ‘Na’ aru n’asusu Igbo

Akwukwo nlere anya

Nchikota Akwukwo maka ule Sinio Sekondiri Nke Nze A. I. 2010. Mis Fav. Publishers

Ndezu utoasusu make ndo Sinio sekondiri nke Chinedu E na Ofomata 2004. Format Publishers (Nig.) Ltd.

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

 

IZUUKA ISE (WEEK 5)UBOCHI ———-

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU                      –           Usoro odide Igbo – Iwu nsupe igbo-oru ‘Na’ na-aru n’asusu Igbo

Mgbakwunye na nsokwuniye

NDINISIOKWU

1:        USORO ODIDE IGBO-IWU NSUPE ORU ‘NA’ NA-ARU             N’ASUSU IGBO

  1. MGBAKWUNYE NA NSOKWUNYE.

 

  1. USORO IDIDE IGBO: IWU NSUPE, ORU ‘NA’ NA-ARU N’ASUSU IGBO

ORU ‘Na’ na-aru n’asusu Igbo

‘Na’ na- aru oru n’asusu igbo n’uzo ndi a:

  1. Na’ di ka mbuuzo
  2. Na’ di ka njiko
  3. Na’ di ka Nnyemakangwaa.

4 ‘.Na’ dika isingwaa.

 

 

 

Na’ di ka mbuuzo

A na- eji nke a egosiputa onodu ihe. O buru okwu ‘Na’ na esote bidoro na udaume, a ga-ewepu ‘a’ tinye rikom elu () di ka n’

Omumaatu

  1. Azu di na ngiga
  2. Mmiri di n’ite
  3. Akwukwo m di n’elu oche
  4. Chioma no na klaasi
  5. Ego di n’akpa

 

 ‘Na’ di ka njiko

NDINAYA

E ji ‘Na’ejikota mkuruokwu na mkpuruokwu, aha na aha, nnochiaha na nnochinaha, nkebiokwu na nkebiokwu, nkebiahiriokwu na nkebiahiriokwu.

Omumaatu

  1. Ji na ede bu ihe oriri
  2. Ifeoma na Ugochukwu bu nwanne
  3. Azuru m azu na osikapa
  4. Mu na ya bu nwanne
  5. Aki na ukwa bu enyi eze
  6. Nwaanyi ahu na nwa ya na-ese okwu.

 

 

 

Na’ di ka Nnyemakangwaa

‘Na’ di ka Nnyemakangwaa na-enyere ngwaa aka ikowaputa nke oma ebumnuche ya bu ngwaa n’ahiriokwu o no na ya.  A na- eji akara uhie

uhie (-) edesa ya na ngwaa ahu o na-enyere aka.

Omumaatu

  1. Anyi na- aga uloakwukwo
  2. Chinedu na-eri nri
  3. Anyi na- ele ule
  4. Umunwaanyi ahu na-aga ahia
  5. Nne m na-esi nri.

Na dika isingwaa : Nke a bu mgbe ‘na’ bidoro ngwaa n’ahiriokwu.

Omumaatu: nabatara__ Obi nabatara ndi obia ya nke om a.

nara_____Biko nara m ego a.

NNWALE

  1. Deputa uzo ato na na- aru oru n’asusu igbo
  2. Nye omumuatu abuo ebe ‘Na’ na- aru oru di ka njiko

 

ORU ULO

Deputa omumaatu ise ebe ‘Na’ na- aru oru di ka Nnyemakangwaa

 

 

2:        MGBAKWUNYE (AFFIXES)

Mgbakwunye bu umu kirikiri mkpuruokwu a na-atinyere mkpuruokwu ozo n’ihu, n’etiti, ma o bu n’azu iji mee ka o nwee nghota di  iche.  Mgbakwunye di uzo ato.  Ha bu

  1. Nganuhu (Prefix)
  2. Nnoneetiti (Interfix)
  3. Nsonaazu (Suffix)
  4. Nnoniime (Infix)

 

Nganiihu (prefix)

Nke a bu mgbakwunye a na-etinye n’ihu isingwaa iji mebe okwu ohuu.  A na-agbakwunye yana ngwaa.

Nganiihu                      Isingwaa                                  Mkpuruokwu

i                                               je                                             ije

a                                              ku                                            atu

e                                              ri                                              eri

i                                               cho                                          icho

m                                             ma                                           mma

n                                              ku                                            nku

 

Nnonetiti (interfix):  Nnonetiti bu mghakwunye nke onodu ya na-adi n’etiti Mkpuruokwu iji kewaa ya nhatanha

Omumaatu

Ede     +   m   +   ede   =  Edemede

Ngo      +  ri     +   ngo   =  ngoringo

Ekwu   +  m    +  okwu =  ekwuekwu

Ako     +   m    +  onu    =  akomonu

Egu      +  r       +  egwu =  egwiregwu

 

  1. NSONAAZU: Nke a bu mgbakwunye na-adi n’azu    isingwaa.

Isingwaa                     Nsonaazu                    Mkpuruokwu

  1. gu o                                              guo
  2. ri e                                              riie

iii.        ta                                             a                                              taa

  1. gbu o                                              gbuo
  2. gu ghi                                           gughi
  3. je re                                             jere

vii.       che                                          ta                                             cheta

 

  1. NNONIME(infix): Nnomime bu nsonaazu na-abughi ya kpezi azu n’ebe enwere karia otu nsonaazu.

Omumaatu

  1. ga +    fe     +    re    =   gefere
  2. kwa +   ghe  +   pu     =   kwaghepu

iii.        cho   +   pu    +   ta      =   choputa

  1. go +  si       +   ta     =   gosiputa

 

NSOKWUNYE

Nsokwunye bu mkpuruokwu na –eti nyekwu nghota n’ahiriokwu.  O na-anodebekari ngwaa, mkpoaha, na nko- waa. Oburu na o na-esote ngwaa, edekota ya na ngwaa, ma o sote nkejiasusu ozo, edesaa ya edesa.

Omumaatu

Kwa, cha, noo, mu, kwanu, zi, ga, rii, si wdg

  1. Uwe ndi a bucha nke gi
  2. Onye kwa ka i na-acho?

iii.        ibunoo onye nzuzu

  1. Gini buzi uche gi n’okwu a?
  2. Ha bunu umuakwukwo.

 

NNWALE:

  1. Gini bu mgbakwunye
  2. Deputa udi mgbakwunye ano e nwere
  3. Nnye omumaatu abuo abuo na ndi a

(i) nzonaazu(ii) nnoneetiti (iii) nganiihu (iv)                                       nsokwunye

 

NCHIKOTA NNWALE:

Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

  1. Erila nri ahu. N’ahiriokwua ‘la’ na-aru oru di ka:  (a) mbuuzo (b) nganiihu  (c) nzonaazu (d) nnoneetiti
  2. Azu di na ngiga. ‘Na’ na-aru oru ebe a di ka: (a)  mbuuzo (b) njiko (ch) isingwaa (d) Nnyemakangwaa
  3. Onye kwa ka i bu ‘kwa’ bu (a) nsonaazu (b) nganiihu (ch) nsokwunye (d) nnoniime
  4. Gaa rie nri. ‘Ga’ na-aru oru di ka (a) isungwaa (b) nsonaazu (c) Nnyemakangwea (d) mbuuzo
  5. Ha na-egwu egwur ‘r’ na-aru oru di ka (a) nsonaazu   (b) nnoneetiti (c) nnoniinne (d)nsokwunye

Edemede nnwale

  1. Kowaa mgbakwunye ndi a, ma nye omumaatu abuo na nke o bula

(i) nganiihu (ii) nsonaazu  (iii) nnonetiti

Oru ngwucha Izuuka

Guo Igbo maka sinio sekondiri (peji ….).

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka

Gue maka okwu a na-edeko onu na uke a na-edesa edesa na laptop gi.

Ihe omume nke ngwucgha izuuka

Nye omumaatu mkpuruokwu ise a na-edese edesa

Akwukwo nlere anya

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

Nchikota akwukwo maka ule sinio sekondiri

 

IZUUKA ISII  (WEEK 6)UBOCHI ——–

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU   –     OKWU A NA-EDEKO ONU, NA NKE A NA-EDESA EDESA, NA UDAOTU.

NDINISIOKWU

  1. OKWU A NA-EDEKO ONU NAN DI A NA-EDESA EDESA.

2    .           UDAAOLU

1    . OKWU NDI A NA-EDEKO ONU, NA NDI A NA-EDESA EDESA

N’asusu igbo di ka O dikwa n’asusu ndi ozo, enwere mkpuruokwu ndi a na-edeko onu, ma nwekwaa ndi a na-edesa edesa.  Ka anyi leba anya na mkpuruokwu ndi a:

 

MKPURUOKWU NDI A NA-EDEKO ONU

  1. Agumagu xii        Mkpumkpu
  2. Ekwumekwu xiii.      Agbataobi

iii.        Ogologo                                  xiv. Nkejilwu

  1. Ezinsulo xv. Nkebiahiri
  2. Ohanaeze xvi. Osiiso
  3. Akwukwo xvii. Umuakwukwo

vii.       Onuogugu                               xviii.Umuaka

viii.      Okwukwe                                xix Umunne

  1. Omume xx Onyenkuzi
  2. Mmadu
  3. Mkpuruokwu

 

MKPURUOKWU NDI A NA-EDESA EDESA

  1. Ndi a vii.       Ngwa ngwa.
  2. Ndi ahia

iii.        Onye a

  1. Ugbu a
  2. Ike ike
  3. Oso oso

vii.       N’asusu Igbo e nwere

 

 

 2:        UDAOLU (Tone Marking)     

N’asusu Igbo e nwere udi akara udaolu ato e ji eziputa udi uda ato e ji akpoputa mkpuruokwu igbo: Ha bu ndi a:

(a)        Akara udaelu (High tone) (/)

(b)        Akara udansuda (mid tone) (-)

(ch)      Akara udaala (Low tone) (\)  .Na nchikota,a ga akowa udaolu dika ihe e ji ama ndiiche di n’etiti  okwu abuo jiri onwe ha na nsupe ma mputara ya di iche.  O bu naani udaume na myiriudaume (m/n) na– anabata akara udaume n’odide asusu n’igbo.

 

 

 

Udaelu (HH)

  1. Aka (hand)
  2. Egwu (music)

iii.        Akpu (cassava)

 

Udaala (LL)

  1. Ala (hand)
  2. Ukwu (bundle)

iii.        Enwe (monkey)

  1. Akwa (Bed)
  2. Aku (Wealth)

 

Udaelu na undansuda (HM)

  1. Mma (beauty)
  2. Eze (teeth)

iii.        Ego (money)

  1. Ero (mushroom)

 

NNWALE:

  1. Deputa mkpuruokwu ise a na-edeka onu
  2. Deputa mkpuruokwu ise a na-edesa edesa
  3. Tunye akara udadu na mkpuruokwu ndi a:
  4. Aka (hand
  5. Anya (eye)

iii.        Akwukwo (book)

 

NIHIKOTA NNWALE

Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

  1. Kedu mkpuruokwu e dejoro na ndia(a) ndia (b)  agumagu (ch)  eznsulo(d) umunne
  2. A na- edeko otu n’ime mkpuruokwu ndi a onu (a) ugbu a   (b) umunna (ch) ngwa ngwa (d) oso oso
  3. E nwere akara udaolu —— (a) abuo  (b) ise  (ch) ano (d) ato.
  4. Anya (eye) nwere akara (a) //  (b)  \\  (ch)  /-  (d) / \
  5. Kedu nke putara akwa (bed) na ndi a (a) akwa /\ (b) akwa \\ (ch) akwa// (d) akwaa /-

 

Edemede nnwale

  1. Gini bu udaolu?
  2. Tinye akara udaolu na mkpuruokwu ndi a

(i)         Ube (pear)

(ii)        Eze (teeth)

(iii)       anyanwu (sun)

(iv) Akwukwo (book)

(v) Ngaji (spoon)

 

Oru ngwucha izuuka

Guo ntuziaka maka udaasusu nke o gechukwu L. O. (page 52)

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Guo maka echichi na echimechi odinaala

Ihe omume nke ngwucha izuuka

Deputa udidi echichi ato I maara

Akwukwo nlere anya

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

IZUUKA ASATO(WEEK 8)            UBOCHI ——-

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

 

ISIOKWU              ECHICHI NA ECHIMECHI ODINAALA

NDINISIOKWU

  1. ECHICHI NA ECHIMECHI ODINAALA.
  2. UDIDI ECHICHI DI ICHE ICHE.
  3. ORU NDI CHIRI ECHICHI.
  4. URU DI N’ECHICHI

 

 ECHICHI NA ECHIMECHI ODINAALA

Echichi ma o bu ime emume bu ihe di ukwuu na ndu ndi igbo.  Ndi uka akwusla ndi otu ha imee ma o bu ichi echichi ndi a n’ihi iji mkporogwu na igo mmuo di n’imeya. Ka anyi ileba anya n’udi echichi di iche iche di ka:

  1. ichi nze/ozo
  2. ibe amenwuru

iii.        ichi eze

  1. ichi iyom
  2. ichi loolo
  3. ichi eze ji/diji

vii.       ichi  atama   wdg

 

 

NNWALE:

  1. Deputa udi echichi ise maara.
  2. Kowaa ihe mere ndi uka ji kwusi ndi nke ha ichi echichi odinaala ndi a.

 

2:  UDIDI ECHICHI DI ICHE ICHE

  1. Ozo:Onye o bula bu nwoke na-echi ozo n’ala igbo. Nke a bu iji gosi na onye ahu eruola ihe e ji nwoke eme.  Onye o bula ga-echi ozo ga aburiri onye agwa ya di mma, o gaghi abu onye na-asi asi.Ichi ozo bu na  mmasi o bughi na mmanye.
  2. Nze:A na-ahoputa onye nze site n’etiti ndi chiri ozo. O na abu onye kachasi buru okenye n’umuma. o bu umunna na-echi onye di otu a nze. O bu ndi nze na-atukari aro maka  Ihe gbasara omenaala di ka ichu aja, ikpu aru, ichoputa ihe ojo o na-eme n’obodo.
  3. Iba Amanwuru: Nke a bu nkwado a na-emee n’bodo ufodu n’ala igbo iji kwado mmadu maka echichi ozo. O buru na mmadu abanyeghi amanwuru, agaghi enye ya ikike ichi ozo.
  4. Ichi eze: O bu ndi eze odinaala na-achi obodo o bula.  Onye a na-ahoputa di ka eze bu onye bukarisiri isi na umunna, ma o bu onye buru uzo chie ozo maobu eze.  Ona-anochite anyaumunna ha n’ochichi obodo.  O ga-abu onye na-ekwu eziokwu, na-akpa ezi agwa, ma hukwa umunna ya n’anya.
  5. Ichi iyom: Nke a bu echichi a na-echi umnwaanyi kpatara ego, obodo na – echikari echichi a bu Onitsha na Asaba. Tupu echie mmadu \y]m, a ga-enyocha agwa onye             ahu ma otozukwara oke.  A na-ebdo n’isi ututu ubochi a na-echi ya gbanye onye ahu odu aka, na nke ukwu. Nke a ka na-akpo “mmacha” oga emere nke a onye ahu ga-ewere ukwu gazuo ogbe niiledi na ghurugburu  ha na benna ya.   Oge nke a gasiri a na-enye ndi mmadu ihe oriri na nke onunu.
  6. Ichi lolo: Nke a bu echichi a na-echi umunwaanyi tozuru ihe e ji nmadu eme, tumadi nwunye igwe na ndi eze ndi ozo.  O bu oru ndi loolo-ilekota umunwaanyi ndi ogbe ha na-ahu na ha na-eme ihe kwesiri ekwesi ka udo wee di n’ogbe nakwa obodo ha.
  7. Ichi, ezeji/diji: O bu onye kacha kota ji n’obodo n’ofo ka a na-echi eze ji, ma o bu diji.  Onye ahu ga-eke Iji nke oma n’akuku oba ano, ma gbasaa ufodu n’ala.  Ubochi a ga-echi nimadu ezeji ndi ozo echii ezeji ga-agbakota an’ulo onye ahu.   A ga-esi ihe oriridi iche iche maka ndi obia ga-ebute ji a ga-eri n’ubochi ano di n’izu (eke, osie, afo na nkwo).   A ga-akpoba ewu n’ime oba ji ya.  Oga-ano ebe ahu na-ata ji ru o abali-ano.  A ga-akpaputa ewu ahu, chiputa ji ndi o tara, ma nye he umu ogbenye.  Nke a ka a na-a kpo “ahia n’ano” oge n’ano”.  A ga-amalite ubochi ahu kpoba onye ahu diji, ma o bu ezeji.
  8. Ichi atama: O bu onye tozuru ihe e ji mmadu eme ka a na-echi echichi Atama.  Obodo na-echi atama bu Nsukka na Enugwu.  Ezike nke di n’Enugwu Steeti.Onye na-elekota mmuo atama nwuo, echie onye ozo atama.   A na-ajuta arusi ase onye aga-echi atama tupu emee nke a. Oge a na-echi onye ahu atama, a na-etinye ose oji n’anya ya iji gosi na arusi atama anabatala ya.  A ga-akpoba zi onye ahu atama malite n’ubochi ahu.

 

NNWALE:

  1. Deputa udidi echichi ise I maara
  2. Kedu ndi na-echi loolo?

NCHIKOTA NNWALE:

Tumbom Tumbom

Hoputa nke achoro

  1. Kedu nke na-abughi echichi na ndia(a)Ikpu uzu (b) ichi ozo (ch) ichi ido (d) ichi eze
  2. O bu nwunye igwe, ma o bu eze ka a na-echi ——— (a) atama (b) ezeji (ch) loolo (d) nze
  3. Ezeji bu——— (a) onye umengwu (b) okenye (ch) ofogori (d) onye kacha kota  ji n’obodo n’afo
  4. N’ichi echichi ezeji, ji ndi ewu tara, ka a na- enye (a) Eze (b) ndi ogbenye (ch) okenye (d) lolo
  5. Otu n’ime ndi a na-echi ozo (a) nwaanyi (b) unwaka (ch) iyom (d) nwoke

Edemede Nnwale:

  1. Deputa uzo echichi asaa i maana.

Oru ngwucha Izuuka

Guo mtuziaka maka udaasusu, utaasusu na omeneala Igbo nke ndi Sedondiri ukwu nke abuo (SS2) pages 197 – 198.

 

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo.

Gue oru ndi chiri echichi n’ime laptop of:

Ihe omume nke ngwucha izunka

Deputa oru ise chiri echichi na-aru.

Akwukwo nlere anya Ntuziaka

(3) ORU NDI CHIRI ECHICHI N’ALA IGBO

ndi chiri echichi na-oru di iche iche n’obodo. Oru ndi a ahu gunyere ndi a:

  1. He na-enye aka n’ochichi obodo
  2. Ha na-enyere ndi ogbenye aka
  3. Ha na-enye aka ihu na omenaala Igbo na-aga n’ihu
  4. Ha na-elekota ndi ahenyene ha n’aka.
  5. Ha na-achikota mmemme a na-eme n’obodo
  6. Ha na-achoputa uzo a ga-esi dozie nsogbu daputara n’obodo
  7. Ha na-eme ka obodo na-adi ocha ma na-ewebeta ihe ndi na-enyere ndu aka. Wdg.

 

NNWALE:

  1. Deputa oru ise ndi chiri echichi na-aru
  2. Deputa uzo echichi ato ndi igbo na-echi

 

 

(4)URU DI N’ECHICHI

Ndi o bula chiri echichi nwere uru ha na-erite na a.  Ufodu uru ndi abu bu:

  1. Ha na-enwe ugwu na nsopuru
  2. Echichi na-eme ka otutu mmadu na-okwuba aka fa oto
  3. Ha na-esonye na ndi onu na-eru n’okwu n’obodo.
  4. Ndi chiri echichi na-enwe afo ojuju n’ihi echichi echiri ha.
  5. Echichi na-emeka mmadu na-agba mbo.
  6. Ha na-enweta akunuba ufodu site n’echichi
  7. A na-eso n’echichi enweta ego.

 

NNWALE:

  1. Deputa uru ise a na-enweta n’echichi.
  2. Deputa udidi echichi ato imaara.

 

NCHIKOTA NNWALE:

Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

  1. Onye chiri echichi na-aru otuoru n’ime ndi a (a) ikwa iko (b) ikpo asi  (ch) igbu mmadu (d) inyere ndi ogbenye aka
  2. Otu n’ime ndi a anaghi ahu agamu n’ihu omenaala Igbo (a) ofogori (b)  eze  (ch) nze (d) igwe
  3. Onye chiri echichi na-enwe ihe ndi a niile e wezuga otu (a) afo ojuju (b) ugwu na nsopuru    (ch) ego  (d) ume ngwu.
  4. Ikwuba aka oto putara (a) ichuli aka elu (b) ibi ezi ndu  (ch) ime mpu (d) izu ohi
  5. Onye chiri echichi kwesiri inwe njirimara ndi a niile, ewezuga otu (a) itu asi  (b) ikwu eziokwu (b) ikpo asi (ch) izu ohi (d) ikwa iko

Edemede Nnwale

  1. Deputa oru ato ndi chiri echichi na-aru
  2. Deputa uru abuo a na-enweta n’echimechi

 

Oru ngwucha izuuka

Guo ntuziaka maka udaasusu, utoasusu na omenala igbo nke ndi sekondiri ukwu nke (pages 200 – 202)

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Guo maka ogugu na ghotaazaa n’ime laptop gi.

Ihe omume nke ngwucha izuuka

kowaa ihe bu aghotaazaa

Akwukwo nlere anya

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

 

IZUUKA ITOOLU(WEEK 9)UBOCHI——-

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU                      –           OGUGU NA AGHOTAAZAA:

NDINISIOKWU

  1. NKOWA OGUGU NA AGHOTA AZAA, NLEKOTA GBURUGBURU
  2. IKOWA OKWU SIRI IKE NIHE AGHURU NA IJI MKPURUOKWU NDI A MEBE AHIRIOKWU.

3.IJI MKPURUOKWU NDI A MEBE AHIRIOKWU

 

NDINISIOKWU  1:OGUGU NA AGHOTAAZAA

Ogugu na aghotazaa putara a guchaa, ghota, a zaa ajuju na esote ihe aguru.

 

Guo ederede a ma zaa ajuju ndi na-esote ya.

Gburugburu

Gburugburu bu okirikiri ebe mmadu no, ma o bu bi. Nlekota bu iledo ihe anyanke oma hu na ihe ahudi mma.

Ilekota gburugburu anyi anya putara ikpachapuru gburugburu anyi anya, na-ahu na o di ocha.

E nwere ike ihu otutu ihe na gburugburu anyi di ka: owa mmiri, ebe mkpofu ahihia, pompu mmiri, okporouzo, osisi, uloakwukwo, waya oku latrik, waya telefoonu wdg.

A na-enweta nsogbu ndi a na gburugburu, ma o buru na edebeghi ya ocha.

Di ka: anwuta, unyi ijuputa okporouzo nke ga-ebute otutu oria, agwo n’ihe ndi ozo na-ata ata ga-amuba, n’ihi azu-chaghi ahihia di nagburugburu.

 

Zaa ajuju ndi a

  1. Kedu aha ozo a na-akpo gburugburu?
  2. Gini ka ilekota gburugburu putara.

3.Deputa ihe ato igutara n’ederede a, di na gburugburu

4.Deputa ihe nsogbu ato a na-enweta n’ihi elekotaghi gburugburu anya.

 

IKOWA OKWU SIRI IKE N’IHE A GURU, NA IJI MKPURUOKWU NDI A MEBE AHIRIOKWU.

  1. Gburugburu (Surrounding). Gburugbburu bu ogige ma o bu okirikiri ebe mmadu bi.
  2. Owa mmiri (Gutter) bu uzo mmiri si aga
  3. Ebe mkpofu ahihia (Disposal site) Ebe a na-ekpofu ahiahia, ma o bu ihe ndi ozo na-        adighimkpa.

4          Pompu mmiri (pipe borne water) ebe a na-agbata   mmiri on unu.

  1. Anwuta (mosquito) Nke a na-atanye mmadu iba n’ahu

 

IJI MKPURUOKWU NDI A MEBE AHIRIOKWU

1.Gburugburu: Gburugburu ulo anyi di ocha

2.Owa mmiri:  E nwere owa mmiri na gburugburu ulo anyi.

  1. Ebe mkpofu ahihia: Ebe a na-ekpofu ahihia di na gburugburu anyi.
  2. Pompu mmiri: Anyi nwere pompu mmiri n’okirikiri ulo anyi.
  3. Anwuta: Anwuta na-atanye iba n’ahu mmadu.

 

NNWALE:

  1. Deputa ihe mkpuruokwu ndi a putara n’asusu Igbo
  2. gutter (ii)  mosquito    iii.  Disposal site
  3. Were mkpuruokwu ndi a mee ahiriokwu (i) gburugburu   (ii) pompu mmiri

 

NIHIKOTA NNWALE

Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

  1. Aha ozo a na-akpo gburugburu bu

(a) owa mmiri (b) okirikiri (ch) mkpofu (d) pompu

  1. Otu n’ime ndi a esoghi n’ihe ndi a na-ahu na gburugburu (a) pompu (b) osisi (ch) owa mmiri    (d) onweghi
  2. Gburugburu putara ——- na bekee (a) house (b) surrounding (ch) gutter (d) disposal site
  3. A na-enweta nsogbu ndi a na gburugburu e wezuga otu (a) anwuta (b) ibnyi (ch) agwo (d) uloakwukwo
  4. Snake putara——– n’asusu Igbo (a) agwo (b) anwuta (ch) oke (d) okuko.

 

Edemede Nnwale:

  1. Deputa ihe ano I na-ahu na gburugburu uloakwukwo gi.
  2. Deputa uru abuo di n’ilekota gburugburu

 Oru ngwucha izuuka

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd (pejis 45 – 46).

Ihe ogugu maka nkwado izuuka ozo

Choputa ihe bu edemede

Akwukwo nlere anya

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

IZUUKA IRI(WEEK 10)                UBOCHI——-

IHE OMUMU               –           ASUSU IGBO

KLAASI                         –           SS 2

ISIOKWU                      –           IDE OTU NKENKE AKUKO MAKA EDEMEDE NKOWAMI.IKWWAPUTA ILU     N’EDEREDE AHU.

NDINAYA                     1.IDE OTU NKENKE AKUKO MAKA EDEMEDE NKOWAMI.

  1. IKOWAPUTA ILU N’EDEMEDE AHUNLEKOTA GBURUGBURU.

 

1;IDE OTU NKENKE AKUKO MAKA EDEMEDE NKOWAMI.

Edemede nkowami (Expository Essay)

N’edemede nkowami ode na-eziputa ihe dum o       nwere ike ide iji kowaa nke oma ihe di iche iche o maara maka ihe o na-ede maka ya. O bu edemede choro igba isiokwu ya n’anwu.

Omumaatu:

  1. Uru oru ugbo bara
  2. Ndi uwe ojii
  3. Uru osisi bara na ndu mmadu

Edemede nkowami nwere ike idi n’ubi abuo.  Dika:

  1. Di ka iluokwu
  2. Di ka otu isi mkpuruokwu.

Edemede nkowami bu ilu okwu

  1. Ahia omana-ere anwe ya
  2. Ura ejula ozu afo

Edemede nkowami ndi bu otu isi mkpuruokwu

  1. ihunanya
  2. oku

iii.        mma

  1. Eziokwu

Omumaatu Edemede nkowami

UZO E NWERE IKE ISI KWALITE ORU UGBO N’ALA ANYI

E ji oru ugbo mara ala anyi.N’oge mbu o bu n’oru ugbo ka ndi ala anyi naara enwetaa akununba ha ji egbo mkpa di iche iche.  Ma na oge a choputara mmanu e si n’ala enweta, ndi ala anyi bido ida mba n’orungbo.  Ugbu a isi ogu adighikwa ebe a mabaara ya.

Ndi mmadu na-adazi mba iru oru ugbo ugbu a.  Onye obula  na-achuzi oru Bekee.  O dighizi onye choro iru oru ugbo nihi na ndi na-aru aru anaghi aruputacha ihe o kwesiri mgbe e lere ihe ha na-etinye n’ihi ya ekwesiri ima ihe a ga-eme ka onodu a gbanwee.

Ihe ndi a ga-eme ka onodu a gbanwee bu ndia:

  1. Ihu na-eji uzo ogbara ohuu wee kowa/ruwa oru ugbo n’obodo anyi,n’ihi na a noghi otu ebe ekiri mmanwu.
  2. Anyi ga-amalite iji ntu Fetiliza na-ako ihe.
  3. Ndi ochichi ala anyi ga na-enye ndi oru ugbo ntu Fetiliza n’efuka nkwu were soro ibe ya abaa mmanu.
  4. Ndi ochichi ala anyi ga-ahu na a na-enye ndi oru ugbo ozuzu gbasaramkpuru akuku ogbara ohuru na ngwa oru ogbaaraohuru.
  5. A ga-ahu na a na-enye ndi oru ugbo ego iji kwado ha.
  6. Ozo kwa ndi ochichi kwesiri idi na-ekesara ndi oru ugbo ogwu nke na-egbu ahuhu na-    atagbu mkpuru akuku ha koro n’ubi ka mmadu ghara i kwo aka tiere okuko aki.
  7. Ndi be anyi ga – abagidokwa oru ugbo ozo site na onye obula iko ihe n’akuku ulo.
  8. A ga na-akuzi ihe gbasara oru ugbo n’ulo akwukwu anyi niile iji meea o buru nwanwa tote o tokwuru.

 

NNWALE:

  1. Kowaa ihe edemede nkowami putara.
  2. Deputa uzo abuo a ga-esi mee ka oru ugbo gaa n’ihu n’ala anyi.

 

2:IKOWAPUTA ILU  N’EDEMEDE NLEKOTA AHUIKE GBURUGBUIRU

E jiri ilu ufodu ndi Igbo wee dee edemede a bu uzo a ga-esi kwalite oru ugbo n’ala anyi.  Ilu ndi a ka anyi ga-achoputa ebe ha di deputa ha ma kowaa ha.

Ihe ndi a bu –

  1. A noghi otu ebe ekiri mmawu nkowa ya:

Ihe omume anaghi abu naani otu uzo ka e si eme ya.

  1. Ka nkwu were soro ibe ya gbaa mmanu.

Nkowa ya

Ka ndi be anyi were di ka ndi ala ozo na-eme nke oma n’ihe gbasara oru ugbo.

  1. Ka mmadu ghara ikwo aka tiere okuko aki

Nkowa ya

Ka uchu/mbo mmadu gbara ghara ila n’iyi maobu buru n’efu.

NCHIKOTA NNWALE

NNWALE          TUMBOM TUMBOM

  1. Otuna ndi a bu edemede nkowami otu mkpuru okwu

(a) Ndi uwe ojii (b) ihunanya (ch) ego oyibo (d) uru oru ugbo bara

  1. N’edemede nkowami, ode na-agba ihe niile n’anwu putara

(a)  ode na-ede ihe niile maka edemede ahu o maara

(b)  O naghi edecha ihe nile o mara

(ch)      O na-edebiri isiokwu ya

(d)        Ihe ole na ole ka o na-ede maka ihe o mara maka isiokwu ya.

 

  1. ‘Igba n’anwu’ bu (a)Ilu (b) myiri (ch) Akpalaokwu (d) mburu.
  2. Edemede nkowami nwere ike ibu—– (a)ekwumekwu(b) edemede (ch) udaume (d)         iluokwu
  3. Ka e wee kwalite oru ugbo n’obodo anyi, ndi ochichi kwesiri ime otu n’ime ndi a

(a) Ikwusi oru ugbo (b)Inye ndi oru ugbo ego mgbazinye (ch) Isi onye obula tuo ego(d)      Ime ka ndi oru ugbo na-agba alukwaghi m n’oru ha.

 

EDEMEDE NNWALE

  1. Kowaputa uzo ano a ga-esi kwalite oru ugbo n’obodo anyi.
  2. Deputa ilu ato di n’ederede a bu: uzo a ga-esi kwalite oru ugbo n’obodo anyi.
  3. Gini bu edemede Nkowami?
  4. Deputa isiokwu ato e were ike ide edemede nkowami na ha.
  5. Dee nkenke edemede maka isiokwu aNdi uwe ojii.

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

Gue akwukwo agumagu Igbo

NCHIKOTA IHE OMUMU NKE ASUSU IGBO MAKA ULE SINIO SEKONDIRI NKE MAZI M. C. NGOESI Peji 116 – 117.

 

OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO.

Guo edemede nka n’akwukwo ntuziaka maka udaasusu, utoasusu na omenala igbo nke ndi sekondiri ukwu nke abuo nke ogechukwu leti okoye n’isi nke iri na itoolu

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZU UKA

Dee uru asaa oru ugbo bara obodo anyi.

 

  1. akwukwo nlere anya

Ntuziaka maka udaasusu, utoasusu na omenala i gbo nke ndi sekondiri ukwu nke abuo (SS2) nke ogechukwu leti okoye

  1. Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke mazi m. c. ngoesi.

 

 

IZUUKA IRI NA OTU (WEEK 11)               UBOCHI——–

IHE OMUMU               – ASUSU IGBO

KLAASI                         – SS 2

ISIOKWU          –      EDEMEDE NKA NA UDIDI YA.URU NA NJIRIMARA YA.IDE YA EDE

NDINISIOKWU

  1. EDEMEDE NKA NA UDI YA
  2. URU EDEMEDE NKA BARA, NA NJIRIMARA YA

 

  1. URU EDEMEDE NKA BARA, NJIRIMARA EDEMEDE NKA.
  2. IDE OTU NKE NKE AKUKO MAKA EDEMEDE NKOWAMI

 

1: EDEMEDE NKA NA UDI YA

Edemede nka bu edemede ndi puru iche nke a na – agbaso iwu were ede.  Edemede nka di iche n’edemede nkiti nke onye obula nwere ike imaba debe ngwa ngwa.  Edemede nka di iche n’ihi na agaghi esi otu esi ede akuko wee dee abu  maobu si otu e si ede akuko wee dee ejije.  Edemede nka gunyere – abu, akuko na eiije.

 

EDEMEDE NKA N’UDI AKUKO

Akuko bu agumagu siri n’echiche puta nke na-eziputa ndu na obibi ya.  Akuko a di n’udi n’udi.  O nwere usoro a na-abaso mgbe a na – ede akuko.  Agaghi esi otu e si dee akuko wee dee abu maobu ejiye.

Edemede nka na-ewebuta atumatu mgbe a na-ede ya.

Eji ilu, akpaalaokwu, mburu, myiri na ndi ozo mgbe a na-ede ya.

ABU:   Abu bu edemede ozo eji nka ede.  Ide abu nwere usoro na iwu na-achikwa ya.  Ihe ndi ufodu eji ama abu bu ndi a:

  1. a) Abu na-enwe isiokwu.
  2. b) Asusu ya anaghi eto ogologo.

Ch)       O na-adi na nkebi na nkebi.

  1. d) Nghota ya na – adi omimi
  2. e) E nwere ike iji olu abughi Igbo izugbe wee dee abu.

Odide abu abughi ihe di mfe n’ihi ya o choro igbado anye.

EJIJE:

Ejije bu njije nke mmadu na-ejije ihe e kere eke.  A na-eji nka ede ejije.  Onye na-ede ejije ga – eso iwu e ji ede ejije.

A na-enwe nkowa na mbido ya. A na-enwekwa aha ndi na-ejije ihe obula.  A na-enwekula obom ebe ndi a nwere usoro a na-agbaso wee ahazi ya.

NNWALE

  1. Gini bu edemede nka?
  2. Deputa udidi edemede nka ato i maara

 

2:URU EDEMEDE NKA BARA,NA NJIRIMARA YA

URU EDEMEDE NKA BARA

  1. a) O na-egosi ndiiche di n’etiti ya na edemede ndi ozo
  2. b) O na-eme ka otutu mmadu ghara idi na-ede udi edemede a.
  3. ch) O na-eweputa udo asusu anyi bu igbo.
  4. d) O na-eme ka onye na-agu agumagu chemi e echiche ime.
  5. e) O na-enye aka ikuziri umuakwukwu out e si ede ya.

 

NJIRIMARA EDEMEDE NKA

  1. Edemede nka nwere usoro dabara adaba eji ede ya.
  2. Nghota ya anaghi adi mfe n’ihi ausu nka eji ede ya.
  3. Edemede nka na – akokuri maka ndu, ebimndu na akparamagwa.
  4. Odee nwere ike iko akuto ya n’uzo masiri ya.
  5. Udi edemede a na-arutu aka oge ihe mere.

 

NNWALE

  1. a) Edemede nka nwere udi ato kpoputa ha ato ma kowaa otu.
  2. b) Kwuo ihe ato e ji ama edemede nka.
  3. ch) Abu, akuko na ejije. Oke nke na-adi na nkebi nkebi.

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Edemede Nka –
  2. a) abu, isiokwu na akuko
  3. b) abu, ejije na okwuputa
  4. ch) akuko, abu na ejije.
  5. d) isiokwu, abu, akuko
  6. Edemede nka a na-ede na nkebi na nkebi bu –
  7. a) abu     b)  akuko     ch)  Ejije na      d) isiokwu.
  8. Edemede nka a na-enwe ndi na-ejije ihe obula a na eme na ya bu –
  9. a) abu (b) ejije     (c) isiokwu    (d) akuko
  10. Otu n’ime ndi a abughi ejirimara edemede nka.
  11. a) O nwere usoro a na-agbaso nay a.
  12. b) O na-akokari maka akparamagwa na ebimundu udi
  13. ch) O naghi enwe usoro a na-agbaso nay a.
  14. d) Odee nwere ike iko akuko ya n’uzo masiri ya.
  15. Otu akwukwo akuko m maara bu
  16. a) Omenala Igbo
  17. b) Oja Dufuo Dike
  18. ch) Obidiya
  19. d) Nchikota ihe omumu nke asusu Igbo maka ule sinio

 

EDEMEDE NNWALE

  1. Kowaa na nkenke ihe bu edemede nka.
  2. Deputa ma kowaa udi edemede nka abuo
  3. Edemede nka bara uru. Deputa uru abuo edemede nka bara.
  4. O nwere ihe e ji ama edemede nka? Kpoputa abuo n’ime ha.
  5. Deputa usoro ato onye na-ede abu ga – agbaso.

 

ORU NGWUCHA IZUUKA.

GUO AKWUKWO AKUKO OJA DUFUO DIKE NKE MAZI RAY C. ANENE.  ISI ASATO NA ITEOLU

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO

Gue maka udi edemede ndi ozo

NCHIOKOTA IHE OMUMU NKW ASUSU IGBO MAKA ULE SINIO SEKONDIRI

PEJI 115 – 117.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZU UKA

Deere enyi gin woke no n’ulo akwukwo ozo gwa ya ka obia emume asompi ulo na ulo ulo akwukwo o unu ga – eme ma onwa Maachi gbaa mkpuru abali iri n’out nafo 2014.

 

AKWUKWO NLERE ANYA

(i)         Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri by maazi m. c. ngoesi

(ii)        Ntuziaka maka udaasusu, utoasusu na omenala igbo nke ndi sekondiri ukwu nke abuo.

 

  1. Mmeghari na ule
  2. Ule na mmechi