SECOND TERM SS 1 IGBO LANGUAGE SCHEME OF WORK

SECOND TERM SS 1

SCHEME OF WORK WEEK TOPIC

 

 

 

 

IGBO LANGUAGE

 

 

 

SCHEME OF WORK WEEK TOPIC

  1. Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga (B) Ogugu akwukwo a hooro
  2. Ogugu na Aghotaazaa – Ahuike ndi ntorobia (i) nkowa ndi ntorobia(ii)mgbanwe n’ahu ndi ntorobia(iii)oria ufodu na-emetuta ndi ntorobia (iv) uzo mgbochio

3-4 Mkpuruedemede na usoro odide ya (a) Ikpoputa udaume (b)mgbochiume (c)myiriudaume na udamkpi. Akaraedemede

5-6 Ochichi odinaala (A)Mputara ya.(B)Usoro ochichi odinaal (C)Njirimara Ya na uru ya.

7.Ezumike nke nta.

 

  • .Ogugu akwukwo a hooro.”NKE M JIKA” (A) Nnyocha akwukwo a guru.(B) Agwa ufodu di n’ihe a guru (C) Uche umuaka banyere isiokwu na agwa ufodu
  • Edemede (A)mputara ya. (B)Udidi ya (C)Usoroodideha
  1. Atumatuokwu- (A)mputara ya (B)Udidi ya (C)Omumatu ha (D)uru o bara n”agumagu
  2. Oruaka- (A)Mputara ya. (B) Udidi oruaka(C)Uruoruaka
  3. Mmeghari naule

 

  1. Ule nammechi

 

 

 

 

IZUỤKA MBU (WEEK 1)

 

IHE ỌMỤMỤ: Asusu igbo

 

KLAASI: SS 1

 

 

 

ISIOKWU: Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga, ọgugu akwukwo a hooro: Mbediogu nke F.C Obgalu

NDINAYA: 1. Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga

 

  1. ọgugu akwukwo a hooro: Mbediogu nke F.C Ogbalu NDINISIOKWU 1.Mmeghari ihe ndi a muru na taam gara aga NDINISIOKWU 2.ọgugu akwukwo a hooro: Mbediogu nke F.COgbalu

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  AB ỤỌ(WEEK 2)

IHE OMUMU: Asusu Igbo

 

KLAASI: SS 1

 

ISIOKWU: Ọgugu na Aghotaazaa – Ahuike ndi ntorobia (i) nkowa ndi ntorobia (ii)mgbanwe n’ahu ndi ntorobia

(iii)ọria ufodu na-emetuta ndi ntorobia (iv)uzo mgbochi oria ndi a

 

NDINAYA: 1.Ọgugu na Aghotaazaa: Ahuike ndi ntorobia, nkowa ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia.

  1. Ọria ufodu na-emetuta ndi ntorobia, na uzo mgbochi oria ndi a.

 

Ọgugu na aghotaazaa: Ahuike ndi ntorobia, nkowa ndi ntorobia, na mgbanwe n’ahu ndi ntorobia.

NKOWA IHE BU OGUGU NA AGHOTAAZAA

 

Ogugu na aghotazaa putara a guchaa, ghota, a zaa ajuju na esote ihe a guru.

 

AHUIKE: Ahuike putara mgbe mmadu na-anaghi aria oria. Mmadu na-enwe ahuike mgbe o nweghị ntụpọ n’ahụ dika ọrịa n’ime ahụ ya, na-eri erimeri nke

 

 

 

oma, ma dikwa ike oru. Ndị kwuru okwu sị na onye nwere ahụike nwere ndụ: na ahụike bụ okpueze.Ọ bụ ya kpatara ndị ntorobịa ji agba mbọ ịhụ na ahụ ha zuru oke mgbe ọbụla.

AHUIKE NDI NTOROBIA: Ahuike ndi ntorobia bu onodu umuokorobia na umuagboghobia (ntorobia) ga-ano na-enweghi oria.

NKOWA NDI NTOROBIA

 

 

 

 

Ndi Ntorobia

 

Ndi ntorobia bu ndi gbara bido n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato. A na- akpo nwaanyi zonyere ukwu n’afo ndi a nwa agboghobia, ma na-akpo onye nwoke nwa okorobia. Ma na ha zukota onu a kpoo ha ndi ntorobia.

 

 

MGBANWE N’AHU NDI NTOROBIA

 

  • Mgbanwe n’ahuumunwoke

 

Mgbe umunwoke si na ibu nwata puo wee banye na ibu ntorobia, ha ga-enwe mgbanwe di iche iche n’ahu ha. Mgbanwe ndi a gunyere:

  1. Igba aji n’abu ha.
  2. Igba aji n’ihe ha jiri burunwoke

 

 

 

  • Igba afuonu na igba ajin’obi
  1. Olu ha ga na-adasi uda ike ma ha na-ekwu
  2. Ha ga na-etokwa ka ome ji n’ihi na ha na- eri oke nri.
  3. Ha na-ebido nwewe mmasi n’ebe umunwaanyi no.

Ya mere, ha ga na-adi ocha, na-akpachapuru uwe ha na-eyi anya.

 

(ii) Mgbanwe n’ahu umunwaanyi

 

  1. Mgbanwe umunwaanyi na-enwe n’oge a gunyere ndia:
  2. Ha na-agba aji n’abu
  • Ha na-agba aji n’ihe ha jiri buru
  1. Ha ga-ebido ikpu
  2. Ha ga-ebidokwa ihu nso ha n’onwa o bula.
  3. Ike ha na apata ukwu ha ga-ebido buwe ibu.
  • Akpupko ahu ya ga- na- akwo

iix. Ha ga na- etokwa oso oso.

 

Mgbe nke a na-eme onye ahu kwesiri ka akowara ya ihe mgbanwe ndi a putara na ndu ya di ka nwaanyi. O ga na-akpachapu anya wee na-eke ekike ka o wee na- adi mma ile anya.

 

 

NNWALE

 

  1. kedu ndi bu ndintorobia

 

  1. Deputa mgbanwe opeka mpe ise a na-enwe n’ahuumunwoke

 

  1. Deputa mgbanwe ise a na-enwe n’ahuumunwaanyi

 

MGBANWE N’OMUME NDỊ NTOROBỊA NJIRIMARA HA

 

Otu nwoke onyeọcha aha ya bụ Peteson (1966) chọpụtara ụzọ

akparamagwa abụọ n’ebe ndị ntorobia nọ. Agwa ndị ahụ gụnyere:

 

  • Agwaọjọọ ha (b) omume ha (pesọnaliti ha)

AGWA ỌJỌỌ HA

 

 

 

Mgbe ndi ntorobia na-amalite ndụ ha, ha na-enwe ọtụtụ agwa ọjọọ ha na-eme iji megide ndi mmadụ ma ọ bụ okirikiri ebe ha nọ. Agwa ndị ahụ gụnyere:

  1. Nnupuisi (disobedience).
  2. Ịlụ ọgụ(fighting).
  3. E nweghi ndidi (impatience).
  4. Ime ngaghari iwe wee na-emebi ọtụtụ ụlọakwụkwọ ha di iche iche (destructiverioting).
  5. Igbu mmadụ(killing).
  6. Izu ohi (stealing).
  7. Ịgba akwụna (prostitution).
  8. Ịba n’otu nzuzo(occultism).
  9. Iti ụmụaka ndi obere ihe aghara aghara (bullying). 10.Ibi ndụ nnwere onwe (free life).
  1. Ibi ndụ okomoko na ndị achọghi ima (luxiriouslife).
  2. Ọ bụ mgbe ụmụnwaanyi n’ime ha ji atụrụ ime ọkwa (unwanted pregnancy).
  3. Ọ bụ mgbe ime mpụ ule ji amalite (examinationmalpractice).

 

MGBANWE N’OMUME HA (Pesọnaliti ha)

  1. Ime ihere.
  2. Ịtụ egwu na iweda onwe ha ala.
  3. Ha anaghi enwe ntụkwasiobi n’onwe
  4. Agụụ ịkwa iko.

 

 

NDINISIOKWU 2: ORIA UFODU NA-EMETUTA NDI NTOROBIA, NA UZO MGBOCHI ORIA NDI A.

Oria ndi na- echere ndi ntorobia aka di otutu. Mana nke ha na-adabakari n’ime ya mgbe o bula bu oria mmeko nwoke na nwaanyi. ufodu oria a na-ebute site na mmeko nwoke na nwaanyi bu ndi a:

  1. Gonoria

 

 

 

  1. Sifilis

 

  • Oria obirinajaocha (HIV/AIDS)

 

  1. stafirụs

 

Onye oria obirinajaocha (HIV Patient)

 

 

 

Oria ndi ozo bu:

 

  1. Iba

 

  1. Taifoidfiva,

 

  • Afoosisa(Diarrhea)

 

  • Lung cancer( A na-ebute oria ojoo site n’inusiga)

 

Uzo Mgbochi Oria Ndi a

 

Uzo di iche iche e nwere ike isi gbochie oria ndi a bu nke a

 

  1. Gonoria: kwusi mmeko nwoke nanwaanyi

 

  1. Sifilis: kwusi mmeko nwoke nanwaanyi

 

  1. Oriaobirinajaocha (HIV/AIDS): Gbaara mmeko nwoke na nwaanyi oso tutu i luo nwaanyi ma o bu
  2. Oria iba: E kwela ka mmiri na-ado aghara aghara n’okirikiri ebe ibi, kawa ahu na-ekpuchi mmiri i dowara n’ulo ekpuchi ka anwuta ghara ino n’imeya

 

 

 

mubaa, na-arahu n’ime neet, tupu i lakpo were aziza ulo piagbuo anwuta febatara n’ime ulo, ma o bu igbaa ha ogwu anwu.

  1. Taifoid fiva : A na-esite n’inu mmiri adighi mma ma o bu ocha ebute oria taifod fiva

Uzo ndi a ka e si egbochi oria taifoid bu na a ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a nuo.

  1. Afo osisa A na-esite n’inu mmiri adighi mma ma o bu ocha ebute oria afo osisa. Uzo  aga- esi egbochi oria afo osisa bu na a ga-esi mmiri n’oku nke oma tupu a
  2. Lung cancer: A na-ebute oria a site n’inu siga. Iji gbochie     oria, i ga-akwusi     ise ma o bu inu
  3. Oria akpukpa: Mmadu iru unyi na-akpata oria a. Gbaa mbo na-asa ahu, ma na- edebe uwe gi na-ebe obibi gi

NNWALE

 

  1. Deputa oria ndi nwere ike i metuta ndintorobia

 

  1. Deputa uzo niile e nwere ike isi gbochie oria ndiahu

 

NCHIKOTA NNWALE (GENERAL EVALUATION)

 

  1. Ndi gbara site n’afo iri na abuo ruo n’afo iri na asato ka a na-akpo———

— (a) ndi okenye (b) ndi ntorobia (c) umuaka (d) ikwu na ibe

  1. Ana- ebute otu n’ime oria ndi a site na mmeko nwoke na nwaanyi (a) iba (b) taifoid fiva (c) obirinajaocha (d) afo osisa
  2. Otun’ime ndi a esoghi na mgbanwe a na-ahu na ahu umunwaanyi (a) igba aji n’abu (b) ihu nso n’onwa (c) ikpu ara (d) igba afuonu
  3. Anughi ezigbo mmiri na-ebute otu oria n’ime ndi a  (a) Oria taifod (b)  oria mkpobiukwu (c) anya mgbu (d) aka mgbu
  4. Kedu oria e si n’anwuta ebute? (a) afo osisa (b) iba (c) gonoria (d) taifod fiva

 

 

 

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

  1. Kowaa ihe buahuike
  2. Depụta agwa ọjọọ ndi ntorobia ise i maara.
  • Kedu ndi bu ndintorobia?,
  1. Deputa oria ise na-emekpa ndi ntorobia ahu

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo ntuziaka udaasusu nke ogechukwu leti okeye,isi nke nari na iri asato na ano (Page 184)

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO (Pre-reading Assignment)

 

Guo mkpuruedemede na nsoroedide ya

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

Deputa ihe ato ozo nwere ike ime ka ndi ntorobia ghara inwe ahuike.

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Ntuziaka Maka Udaasusu, Utoasusu, na Omenaala Igbo Nke Ndi Sekondiri Ukwu Nke Mbu (ss 1) NkeOgechukwu Leti Okoye.InnogeTrading Company Limited.

 

 

 

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  AB ỤỌ(WEEK 3)

IHE OMUMU: Asusu Igbo

 

KLAASI: SS 1

 

 

 

ISIOKWU: Mkpuruedemede na nsoroedide ya (a) Ikpoputa udaume (b)mgbochiume( c )myiriudaume (d) udamkpi.

Akaraedemede.

 

NDISIOKWU: 1. Ikowa mkpuruedemede , na inye omumaatu

 

  1. Mkpuruedemede: (i) Mgbochiume (ii) Udaume (iii) Myiriudaume
  • Udamkpi

 

MKPURUEDEMEDE IGBO (IGBO ALPHABET)

 

Nke a bu abidii eji ede asusu Igbo. Mkpuru edemede e ji ede Igbo taa bu nke Onwu komiti weputere n’afo 1961. A na akpo ya Onwu otografi. Ha bu ndi a:

 

 

Mkpuru edemede nke nnukwu

 

A B CH D E F G GB GH
GW H I J K KP KW L
M N Ń NW NY O P R
S SH T U V W Y Z

 

Mkpuru edemede Igbo di iri ato na isii (36). O kere onwe ya uzo abuo; udaume na mgbochume.

Mkpụrụedemede nke obere

 

a b ch d e f g gb gh
gw h i j k kp kw l
m n ń nw ny o p r
s sh t u v w y z

 

 

 

NNWALE

 

  1. Guputa MkpuruedemedeIgbo
  2. Mkpuruedemede igbo o diole?

 

 

 

 

 

MKPU                                                                                         RUEDEMEDE:  (I)  UDAUME (II)  MGBOCHIUME (III) MYIRIUDAUME (IV) UDAMKPI

UDAUME(VOWELS)

 

Udaume Igbo di naani asato. Ha bu ndi a A E I Ị O Ọ U Ụ

Udaume kere onwe ya uzo abuo ;udamfe na udaaro

 

  1. Ụdamfe( lightvowels)
  2. Ụdaaro(heavyvowels)

 

 

 

 

 

 

 

 

Otu “A” (Udamfe) “Otu E” (Udaaro)
A E
I
O
U

 

 

Mkpọmụda((vocal cord) na-ama jiji oge a na-akpoputa udaume asato ndi a.

 

 

 

Ụdamfe( light vowels)

 

(otu A)-Ha bu ‘a’ na ndi nwere kpom n’ike.d.k a,ọ,ụ ,ị

 

Ụdaaro(heavy vowels)(otu E)-Ha bu ‘e’na ndi enweghi kpom n’ike dika e,o, u .i

 

 

Ụdamfe Ụdaaro

 

a-aka,anya, anụ e-eke,eze ,elu

 

  • ịgba,ịta, ịnya i-ite ,isi,  ije

 

ọ-ọnụ,ọcha,ọkụ o-oche, ose,oge

 

ụ-ụlọ,ụta,ụka u-ube,ute,ude

 

 

MGBOCHIUME (CONSONANTS)

 

E wepuchaa udaume n’ime abiidi ,ndi ozo bu mgbochiume. Ha di iri abuo na asato. Ha bu:

 

B, CH, D, F, G, GB, GH, GW, H,
J, K, KP, KW, L, M, N, N, NW
NY, P, R, S, SH, T, V, W, Y, Z.

 

 

Mgbochiume kere onwe ya uzo abuo;mgbochiume mkpi na mgbochiume nge Mgbochiume mkpi(diagraph) – CH, GB, GH, GW, KP,

KW, NW, NY, SH. Ha di itoolu(9)

 

 

Mgbochumenge(single) B, D, F, G,H, J, K, L, M, N, N

 

 

 

P, R, S, T, V, W, Y, Z. Ha di iri na itoolu(19)

 

 

 

 

 

 

MYIRIUDAUME (SEMI VOWEL)

 

Nke a bu oge ‘m’ na ‘n’ na-aru oru dika udaume.Nke a na-adi ire oge ‘m’ ma o bu ‘n’ nodebere mgbochiume n’okwu Igbo. Mkpọmụda((vocal cord) na-ama jiji oge a na-akpoputa M na N.

Omumaatu

 

Mmanu ( Palm oil) Ndo (Sorry)

 

Mma (Knife) Nri (Food)

 

Mmiri (Water) Nkita (Dog)

 

Mkp]Nnu (Salt)

 

 

EBE “M na N” NA ARU ORU DI KA MGBOCHIUME

 

Mgbochiume “M na N” na- egosiputa mgbe M na N anaghi enwe uda ma ha  kwuru onwe ha. M na N a naghi enwe uda, naani ma a agbakwunyere ha mkpuruedemede udaume.

Omumaatu

 

Maka  Nata  muta Naani Mere   Nari  Napuru Nara Metara Muo Muta Muru

UDAMKPI (Diphthong)

 

 

 

Udamkpi bu udaume abuo sokotara onwe ha na mkpuruokwu, ma nwee otu uda, ka a ga-asi na ha bu otu udaume. E nwere udamkpi ano n’asusu igbo. Ha bu: \a, ie, ịọ, io

Omumaatu

 

\a O piara ya utari n’isi Amaka gara ahia

ie Rie ji ahu dum

 

O naghi eme njem n’ehihie

 

ịọ Oke aririọ na-ebute oke mkpari Kwusinu uf] n’uloaku

io si ebe a piopu

 

Ewu ahu si na mpio gbapu

 

NNWALE

 

  1. Gosiputa uzo ole udaume kere onweya?
  2. Guputa mgbochiume nge enwere

 

NCHIKOTA NNWALE

 

  1. Otu n’ime ndi abu udaume (a)ny (b)p (c)u (d)m
  2. Okwu nwere myiriudaume n’ebea bu (a)maka (b)noro (c)nti (d)ube
  3. Akara edemede a na-etinye ebe a juruajuju bu? (a)kpom (b)akara

ntimkpu (c)rikom (d)akara ajuju

  1. Udaume Igbo di ole?——-(a)asato (b)iri (c)iri asato(d)abuo
  2. MyiriudaumeIgbo bu? (a)d na n (b)m na n (c)h na d (d)o na

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

 

 

  1. Gini bu ogugu na aghotaazaa?
  2. Kowaa ihe bu ahuike ndintorobia

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke Maazi Ngoesi M.C

IHE OMUME NKE OGUGU(Pre-reading Assignment)

 

Guo edemede na udi ya di iche iche n’ihe omumu asusu igbo di na laptop gi.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

See onye Eze n’ime akwukwo asusu igbo gi

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke Maazi Ngoesi M.C

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

IZU ỤKA  NKE  AN Ọ(WEEK 4)

ISIOKWU: AKArAEdEmEdE:

NDINISIOKWU : (i) Akara ntupo (ii) Kpom (iii) Rikom (iv) Akara ajuju

  • Akarauhie (vi)Akara mkpu (vii)Kpọmkpọm

 

 

Akaraedemede bu akara di iche iche a na-etinye n’ihe e dere ede iji mee ka ogugu, na mkoputa ya doo anya, ma nwee nghota zuru oke. Akaraedemede e nwere di otutu, ma na anyi ga-eleba anya na mkpuru ole ma ole.

Akara Igbo Bekee

 

 

 

. kpom fullstop
, Rikom comma
Rikomelu Apostrophe
? Akara ajuju Question mark
! Akara ntimkpu Exclamation
: Kpomkpom Colon

 

  • Akarauhie Hyphen

 

 

 

 

Kpọm (.) Kpọm bụ akaraedemede e ji ama na okwu, ma o bụ ahịrịokwu abịala n’isi njedebe. Mgbe ọ bụla e dehara okwu were tinye ya kpọm, a mara na echiche ya akwụsila.

Ọmumaatu:

 

  1. Bịa.
  2. Nne m gara
  3. Achọghị m ihụ gi ebe a ụbọọchịọzọ.

 

Rikom (,) Eji rikom egosi na okwu agwụbeghị kama na onye na-ede ya ma ọ bụ onye dere ya chọrọ ikute ume tupu o dewakwa. Rikọm na-akọwakwa na okwu ejerubeghi ebe ọ na-eje. Ọmumaatu:

  1. Ha zutara nnu, ji, ede, na osikapa n’ahia.
  2. Ji, ede,akidi na akpụ bụ nri ndi

 

Akara ajuju (?) Mgbe ọ bụla anyi na-ede okwu ọ bụla bụ ajụjụ, ọ bụ akara ajụjụ ka e ji ya. N’asụsụ Igbo, e nwere mkụrụokwu ndi anyi maara nke ọma di ka njụajụjụ. Ebe ọ bụla na mgbe ọ bụla e dere ha, a ga-ama na ọ bụ ajụjụ mana iji mee ka ụtọasụsụ ha zuo oke, a na-etinyekwa ha akara ajụjụ. Omumaatu :

 

 

 

  1. Gini bụ ahagi?
  2. Olee mgbe ị bịara ?

 

Akarauhuie (-) E ji akarauhie egosi na mkpụrụokwu abụọ na-arụkọ ọrụ ọnụ mana ha abụọ adịghị mma idekọ ọnụ. Ọ bụ n’etiti mkpụrụokwu na-enyere ngwaa aka na ngwaa ọ na-enyere aka ka akarauhie na-adi. Ọmụmaatụ :

  1. Uche ga-eje ọrụ echi.
  2. Nwanne m na-ebe

 

Akaramkpu ( !) Nke a bụ akaraedemede e ji amata na okwu ekwuru bụ mkpu ka e tiri ya. Ọmumaatu :

  1. Chei ! Anwụọla manwụ
  2. Si ebe a gbafuo ọsọ ọsọ!

 

Kpọmkpọm (:) okwu ọ bụla nwere kpọmkpọm n’azụ ya na-egosi na ya agwụbeghi. Na o nwere okwu ndi ọzọ ga-esote ya n’azụ. Ọmụmaatụ :

  1. Nna m gara ahịa zụta ji : Nne m sie ya esi
  2. Ngọzi, ihe ndi ị ga-azụtara m ma ị gaa Ọnịcha bụ : uwe, mgbaaka, akpụkpọụkwụ na ncha

Rịkọmelu (‘) Ebe rịkọmelu na-apụtakari ihe n’asụsụ Igbo bụ mgbe ‘NA’ nz-arụ ọrụ

di ka mbuụzọ. Ọmụmaatụ :

 

  1. Nneka nọ n’eluụlọ
  2. Osisi sụrụ yan’anya

 

NNWALE

 

  1. Gini bu Akaraedemede

 

  1. Deputa akara edemede ise e nwere, ma tugharia ha na

 

 

NCHIKOTA NNWALE (General Evaluation)

 

 

 

Tumbom Tumbom

 

  1. Akarauhie bu (a)hyphen (b)full-stop (c) comma (d) colon
  2. Kpom ka a na-akpo ———-na bekee (a) fullstop (b)hyphen (c)colon (d)exclamation mark
  3. Onye ka i bu .  Akara e kwesiri itinye na ngwucha ahiriokwu a (a) . (b) , (c)?

(d) ;

  1. Hoputa akara etinyere nke oma n’ahiriokwu ndi a (a) Ọ na- bia (b)ha diole:

(c) bia ebe a! (d) Ọ biara! ma na o hughi m,

  1. Comma putara ——– n,asusu igbo (a) kpom(b)akara uhie(c) akara ajuju (d) rikom

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

Deputa akaraedemde ise i maara ma tuhgaria ha na Bekee Gini bu akara edemede? Kowaa na mkpuruokwu ole na ole.

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O  (pages )

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO (Pre-reading Assignment)

 

Guo maka Ochichi Odinaala

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

Tinye akaraedemede n’ahiriokwu ndi a

 

  1. Ha na abia
  2. Oririnri
  • Anyi zutara nnu ose na mmanun’ahia

 

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

 

 

Simplified Igbo Grammar for Secondry Schools by M.C Ofodile

 

Nchikota ihe omumu nke asusu igbo maka ule sinio sekondiri nke Maazi Ngoesi M.C

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

 

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  ISE  (WEEK 5)

IHE OMUMU: Asusu Igbo

 

KLAASI: SS 1

 

ISIOKWU: Ochichi odinaala (a)Mputara ya (b)Usoro ochichi odinaala (C)Njirimara ya na uru ya

NDISIOKWU: 1. Nkowa ochichi odinaala

 

  1. Usoro ochichi odinaala

 

 

 

 

 

 

 

 

 

 

NDINISIOKWU 1:NKOWA OCHICHI ODINAALA

 

 

 

 

 

Ndi ochichi odinaala(Traditional rulers)

 

 

 

 

Ndi ochichi odinaala(Traditional rulers)

 

Ochichi odinaala bu udi ochichi ndi obodo ji elekota onwe ha. A na-enwe ochichi odinaala n’obodo; nke a na-enye onye o bula ohere ikwuputa uche ya. Nke a na- eme ka ndi obodo nwee otu obi n’ihe o bula ha n-eme.

N’obodo di iche iche iru oru ochichi obodo na-adikari n’aka ndi isi ala, ndi ichie, ma o bu ndi eze. O bu oru ha ichedo iwu na omenaala obodo n’ihu na udo di n’obodo.

 

 

 

 

 

 

NDI OCHA

 

Tupu ndi ocha abia, di ka e si koo n’akuko e nweghi ebe e nwere eze na-achi ala igbo dum. Ma na nke a aputaghi na ndi igbo e nweghi uzo ha si achikota onwe ha. Ihe o putara bu na ndi Igbo enweghi onye a hoputara maka ochichi di ka ndi Yoruba siri nwee Oba, ndi Hausa Enwee Emir, Ndi Calabar Obon, ndi mbammiri enwee Amanyanagbo. Isi ochichi n’oge gboo na amalite na’ezinaulo. Ezinaulo o bula nwere onye isi. Onye is ezinaulo na-abu onye kasi mmadu niile okenye n’ebe ahu. ihe o bula o kwuru na-abu ihe onye o bula bi n’ezinaulo ahu ga-eme.

Oge ndi bekee batara n’ala Igbo ha chere na ndi Igbo e nweghi usoro ochichi ha ji achikota onwe ha. Ma na ha mechara choputa n’ikpeazu na nke a abughi eziokwu.

 

 

NNWALE:

 

Gini bu ochichi odinaala?

 

Gini bu echiche ndi Bekee na mge gboo banyere ochichi odinaala?

 

 

NDINISIOKWU 2:USORO OCHICHI ODINAALA

 

Abia n’ala igbo usoro ochichi digasiri onwe ya iche iche. N’oge gboo ndi igbo na- achikota onwe ha no’obodo n’obodo. Ya bu obodo o bula nwere Eze ma o bu Igwe na-achi ha. n’ihi na ha na-achi onwe ha n’obodo n’obodo, ma rukwaari n’ogbe.

N’ihe na ogbe o bula nwere Igwe ma o bu ndi Eze obodo di ka ichie ga-eleru ha anya, ma na-agwa Eze ka ihe siri kwuru. Nke a mere ka onu na-eru onye o bula n’okwu.

N’usoro ochichi odinaala, ochichi aka ike adikabeghi ya, n’ihi na onye o bula nwere ike ikwu uche ya.

N’ala igbo obodo o bula na-anoro onwe ha, ma na-achikwa onwe ha. O nweghi onye a ga- asi na o bu ya bu Eze Igbo niile n’uwa. Igwe ma o bu Eze bu obodo o bula na nke ha. Ya bu ochichi anaghi adi n’aka otu onye n’ochichi odinaala.

 

 

 

 

 

 

 

NNWALE

 

  1. Gini bu ochichiodinaala?
  2. Deputa ndi ato chiri echichi na-enye aka n’ochichi

 

NCHIKOTA NNWALE (GENERAL EVALUATION)

 

Tumbom Tumbom

 

  1. Udi ochichi ndi obodo ji elekota onwe ha ka a na-akpo (a) emume (b)  ochichi odinaala (c) omenaala (d)onweghi
  2. Ochichi odinaala na-enyere ndi obodo aka ime otu n’ime ndi a: (a) inwe otu obi (b) ikpo asi (c) izu ohi (d) izoala
  3. Ochichi odinaala na-adikari n’aka otu n’ime ndi a (a) ndi ofogori (b)umunna

(c) umuaka (d) ndi isiala

  1. Tupu ndi ocha abia na Naijiria, e nweghi eze na-achi dum (a) Yoruba
  • Hausa (c) Igbo (d)kwara
  1. Otu n’ime ndi a esoghi n’ochichi odinaala (a) Eze (b) Ofogori (c) Igwe (d) Ndi Ichie

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

  1. Kowaa usoro ndi Igbo si achikota onwe ha tupu obibia ndiocha
  2. Gini mere e ji si na igbo e nweghji eze tupu obibia ndiocha

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo isiokwu ndin’ a muru izuuka a n’Igbo maka Sinio Sekondri 1 Nke E Nolue Emenanjo

 

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO (Pre-reading Assignment)

 

 

 

Guo njirimara ochichi odinaala n’ihe omumu asusu igbo di na laptop gi.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

Deputa udi ochichi odinaala ato imaara.

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Igbo maka Sinio Sekondri 1 Nke E Nolue Emenanjo

 

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

 

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  ISII (WEEK 6)

IHE OMUMU: Asusu igbo

 

KLAASI: SS 1

 

ISIOKWU: Njirimara ochichi odinaala na uru ya

 

NDINAYA: 1. Njirimara ochichi odinaala

 

  1. Uru ochichi odinaalabara

 

 

 

 

NJIRIMARA OCHICHI ODINAALA

 

E ji otutu ihe mara ochichi ochichi odinaala, ma na ole ma ole ka a ga-edeputa ebe a.

A na- enwe eze na-achi obodo n’ochichi odinaala

 

A naghi azo eze azo n’ochichi odinaala; n’ihi na Eze nwuo Okpara ya anochie anya

 

 

 

ya.

 

Ochichi odinaala nwere usoro usoro esi eweputa Eze.

 

N’ochichi odinaala di ka o di n’oge gboo, onye Eze na-ano n’obi ya oge niile. A naghi agbagha okwu Eze agbagha n’ochichi odinaala.

A na-enwe ochichi onye kwuo uche ya.

 

 

NNWALE

 

  1. Deputa njirimara ochichi odinaala anoimaara
  2. Kwuputa ndiiche ato di na ochichi odinaala na nke ugbu a

 

 

URU OCHICHI ODINAALA BARA

 

Uru ochichi odinaala bara gunyere ndi a:

 

1.O na-eme ka obodo di n’otu

 

  1. O na-eme ka obodo nwee usoro ochichi nkeonye o bula O na-esoro n’ime ya.
  2. O na-enye aka igbochi ogbagharan’obodo

 

  1. O na-enye aka na mmepe nke obodo

 

  1. Ndi mmadu na- esite na ya akwu utu isi ha nye ndigomenti

 

  1. O na-enye aka ime ka udo di n’obodo

 

  1. Ochichi odinaala na-enye aka ichoputa onye mere ihe ojoo, ma o bu onye mereihe ala na-aso nso
  2. Ochichi odinaala na-enye aka ikwaliteomenaala nke mba o

 

  1. O bu site n’ochichi ka e si enwe iwu na-achi obodo, na ndi bi n’ime

 

 

 

 

 

NNWALE

 

  1. Deputa njirimara chichi odinaalaato
  2. Deputa uru ise ochichi odinaalabara
  • Kooro umuakwukwo ibe gi ihe ndi obodo gi na-eme onye zuru ohin’obodo.

 

 

NCHIKOTA NNWALE (General Evaluation) Tumbom Tumbom

Hoputa nke a choro

 

  1. A na-enwe ——– na-achi obodo n’ochichi odinaala (a) Amadioha (b)dibia
  • Eze (d)mmanwu
    1. A naghi azo otu n’ime ndi a azo n’ochichi odinaala (a) Eze (b) ala (c) ulo (d) nwa
    2. Ihe ndi a niile bu uru ochichi obodo bara e wezuga otu (a) udo (b) ihunanya (c) mmepe obodo (d) igbummadu
    3. Ochichi odinaala na-enye onye o bula ohere ime otu n’ime ndi a (a) ikwa uko (b) igbu mmadu (c)ikpo asi (d) I kwu uche ya
    4. N’oge gboo onye ezena-ano naani (a) n’usekwu (b) ya (c) n’oba ji

ya (d) n’obi n’ulo arusi

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

ORU NGWUCHA IZUUKA (Weekend Assignment)

 

Guo isiokwu a muru n’izuuka a n’Igbo maka Sinio Sekondri 1 Nke E Nolue Emenanjo

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO (Pre-reading Assignment)

 

Guo Oruaka na laptop gi.

 

 

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA (Weekend Activity)

 

Deputa udi oruaka ise i maara.

 

AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

 

Igbo maka Sinio Sekondri 1 Nke E Nolue Emenanjo

 

Ntuziaka Maka Udaasusu Nke Ogechukwu L.O. 2004. Innooge company Ltd.

 

 

 

 

 

 

IZUỤKA NKE ASAA (WEEK 7)  EZUmIKE ỌKARA TAAM

 

 

IZU ỤKA  ASAT Ọ(WEEK 8)

IHE OMUME ASỤSỤ IGBO

KLAAS|—- S. S. 1

 

ISIOKWU—- ỌGỤGỤ AKWỤKWỌ A HỌRỌ “NKE M JI KA” NDINAYA –1.NNYOCHA AKWỤKWỌ A HỌRỌ

  1. AGWA NDI NA YA.

 

 

NNYOCHA AKWUKWO AHOPUTARA:

 

USORO A NA-AGBASO MGBE A NA-ENYOCHA AKWUKWO.

 

Ihe mgbakwasi ukwu:

 

  1. AhaAkwukwo:

 

 

 

Aha akwukwo bu ihe izizi onye na-atule akwukwo ga-akowaputa.O ga-akpo aha akwukwo.

  1. Aha odeakwukwo:

 

Oga-akpotukwa aha onye dere akwukwo,ma kowakwaa nkenke akuko banyere ndu onye ahu ma buru na o maara ya.

  1. Afo mbiputa na ndi biriya:

 

Onye nyocha ga-akowaputa afo e jiri wee biputa ya,ulooru biputara ya.

 

  1. Ntoalaakwukwo:

 

Mgbe a na-akowaputa ihe gbasara ntoala akwukwo,ihe ndi di mkpa bu:(i) Ebe

(ii) Oge.(iii) Ndi e bu n’ uche dee ya. 5.Isiokwu:

Olee ihe akwukwo na ekwu maka ya,kedu out ihe maobu ihe ndi bu okpurukpuokwu akuko ya ?

  1. Nchikota akuko:

 

N’uzo mkpirisi.e dee ihe akwukwo na-ako maka ya?

 

  1. Nhazi din’akuko:

 

Olee otu ode akwukwo siri hazie akuko ya?O haziri ha n’isi? Kedu otu isi obula na ibe ya siri jikota?Kedu ka akuko siri noo n’isi n’isi? (plot)

  1. Akparamaagwa:

 

Olee ndi a kpoo aha n’agumagu? Kedu otu agwa ha siri diri? Ihe ode kwuru maka onye ahu,ihe onye ahu kwuuru onwe ya,ihe ndi ozo no n’akuko ahu kwuru maka ya,na ihe onye nnyocha kpebiri n’echiche nke aka ya.

  1. Omenaala na nkwenye ndi putara ihe:

 

Ana-arutu aka n’omenaala;nkwenye di iche iche na ofufe ndu.

 

 

 

  1. Ihe ojoo di icheiche:

 

Ana-arutukwa aka ihe ndi oha na eze na-agbaruru ihu.(Ihe ojoo di iche iche).O nwere echiche na-ezighi ezi odeakwukwo gosiputara?

  1. Asusu nka:

 

N’ebe a,a na-enyocha otu ode si webatasia atumatu okwu di iche iche dika: ilu,akpaalaokwu,ukabuilu,mburu,odika,ntakwu w.d.g.Kedu ka odeakwukwo siri dee ya?

  1. Ihe mmuta:

 

Olee ihe ode choro ka si n’agumagu ya muta?

 

 

NNWALE

 

  1. Kpoputa ihe izizi a na-ahu na-inyochaakwukwo

 

  1. Ole afo akwukwo aputara

 

  1. Olee mgbe ebighaririya?

 

 

 

 

NCHIKOTA NNWALE

 

  1. Otu ihe a na-atule mgbe a na-enyocha akwukwo bu…… (a)ego (b)mmad[(ch) ntoala (d) obi ojoo
  2. Omenaala p[tara ihe n’akwukwo a.

 

(a) iyi (b) iwa akwa (ch) igba alukwaghi m (d) iru mgbede

 

  1. Aha obodo putara ihe naya bu (a) }ka (b) nteje (ch) }niche (d) awusa

 

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

  1. Deputa ihe ato a na-atule mgbe a na-enyocha akwukwoagumagu

 

  1. Dee nke nke edemede maka agwa abuo din a akwukwo

 

IHE OMUME NGWUCHA IZUUKA

 

Kowaa agwa kachara puta ihe.

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA

 

Guo akwukwo a ma were omuwaatu enyere gi mee nyocha di dabara adaba.

 

IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA

 

Guo akwukwo NKE M JIKA Isi nke abuo

 

AKWUKWO NLERE ANYA

 

NKE M JIKA WAEC edition nke Nwaozuzu G.I

 

 

 

 

 

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  ITOOLU (WEEK 9)

ISIOKWU EDEMEDE

 

NDINAYA (i) Edemede:Mputara ya na u di ya di iche iche

 

(ii) Usoro edemede

 

Edemede :Mputara ya na u di ya di iche iche

 

Edemede bu echiche mmadu maọbụ ọchịchọ mmadụ nke e deturu edetu n’akwụkwọ. Ọ bụ ihe ọbụla e chepụtara ma depụtakwa n’akwụkwọ nke nwere

 

 

 

nghọta na echiche zuru oke.

 

E nwere udi edemede di iche iche nke ufodu n’ime ha bu

 

  • Edemede akọmakọ, Edemede nkowasi, Edemede ilu, nk]wasi, Edemede mgbagha, Mkparitaụka Edemede ekwumekwu– Edemedeleta
    1. EDEMEDE AKOMAKO – Ndi a bụ edemede nke a na-ako maka ihe mere n’oge gara aga. Dika Ubochi m gaghi echefu

 

  1. EDEMEDE ILU – Nke a na-abu ilu nke a ga –enye nkọwa ya. A ga-eji akuko dabara adaba were gosi ilu ahụ. Dika – Awọ anaghi agba ọsọ ehihien’efu.

 

  1. EDEMEDE LETA: Nke a bu udi edemede anyi na-edere ndi nne na nna anyi nke na-enwe ebe akwukwo ahu si maobu a ga-eziga ya nke. E nwekwara ike I dere ya ndi enyi anyi ugbu a nke’a adikeghizi n’ihi

 

  1. MKPARITAUKA – N’edemede a, a na-eziputa ihe mmadu abuo maobu karia na-akpa. Dika Mkparitauka di n’etiti ndi ntorobia abuo banyere uko

 

  1. EKWUMEKWU:- Nke a bu edemede iji iziputa okwu mmadu na-agwa ogbako Dika sinio Prefect ulo akwukwo gi deputa ihe ga-agwa Ohaneze banyere ulo akwukwo unu ubochi unu ga-asi ndi gucharala akwukwo gaa nke

 

6. EDEMEDE MGBAGHA

Edemede Mgbagha bu udi edemede na-egosiputa mgbagha maobu nkwenye banyere isiokwu e nyere. Dika

  • O ka mma izu nwanyi n’akwukwo kariaumu-nwoke
  • O ka mma ibu onye oru ugbo karia ibu dibia

 

  1. EDEMEDE NRURITA UKA:- Nke a bu edemede na-eziputa mgbagha n’etiti otu abuo. Dika Oru ugbo ka mma karia izu ahia ma Ọ bụ ibu onye ojiego a chụ ego karia irụ ọrụ

 

 

 

NNWALE

 

  • Gini buedemede?

 

  • Kpoputa udi edemede ato I maara.

 

  • Kowara m edemede akomako.

 

 

Usoro Edemede

 

Edemede nwere usoro o na-agbaso. A ga-ejiri usoro ahu o na-enwe were dee ya. Usoro edemede Igbo ndi ahu bu:-

  • MMALITE – O ga-enwe mmalite ebe ode ga-ede ihe maka isiokwu e nyere ya. Mmalite ga-adi uto ka o wee mee onyee na-agu ya itusa obi ala guo
  • ETITI/AHU EDEMEDE: – N’etiti maobu ahu edemede ka ode ga-ede okpurukpu okwu o choro ide maka
  • MMECHI: – Onye na- ede edemede ga-achikotazi ihe o dere maka isiokwu ahu onu. O ga-ama mma ma o were okwu kwesiri ekwesi mechie

 

 

USORO EDEMEDE LETA

 

Leta so n’otu udi edemede e nwere. Leta dika edemede ndi ozo na-enwe

usoro.

 

USORO EDEMEDE LETA

 

Leta na-enwe ụzọ ato ndia

 

  • MMALITE – Leta na-enwe mmalite ma mmalite yana-abuo

 

  • Adreesi, (ii) Ekele mmalite omuma

 

Deeper Life High School,

Km.42 Lagos-Ibadan Expressway,

 

 

 

 

 

 

Ezigbo Ngoo,

Ogun State. 28/8/2013

 

 

  • AHU LETA – N’ebe a ka ode ga-ede ozi niile o choro izi site na Leta ya. O choo ugwo akwukwo ya ebe’a ka o ga-ezi
  • Mmechi – Na mmechi Leta, Odee ga-edezi aha ya iji ziputa onye na-ede Leta.

Dika

 

O bu m,

Nwa gi nwanyi, Ngoo.

 

 

NCHIKOTA NNWALE

  1. Echiche mmadu cheputara banyere isiokwu ma dee ya ede bu–

 

  • Edemede (b) Isiokwu (ch) Mkparita uka(d)Nkejiasusu

 

  1. Otu udi edemede m maara (a)  Isiokwu (b) Mkpoputa  (c) Nzute (d) Ilu

 

  1. Onye na-ede leta ga-etinyeriri otu na ndia

 

  • Nkejiasusu (b) Adresi (ch) Mvelope (d)Mkpokota

 

  1. Ebe onye na-ede e demede na-ede isiokwu o jiri debe edemede ya bu na – edemede
    • ahu/etiti  (b) mmalite (c) mmechi (d)

 

  1. Onye na-ede Leta ga-ederiri – na ngwucha iji gosi onye dere ya.

 

  • Isiokwu (b) ahu/etiti (c) mmalite (d) aha

 

 

EDEMEDE NNWALE

 

 

 

  1. Gini buedemede?

 

  1. Udi edemede ole ka e nwere? Deputa

 

  1. Usoro ole ka edemede na-agbaso?

 

  1. Nye nwa nkenke nkowa banyere edemede

 

  1. Deputa adresi otu o kwesiri idi mgbe I na-edere nne na nna gi leta. (b) Deekwaekele

 

 

ORU NGWUCHA IZUUKA

 

Guo akwukwo EXAM FOCUS IGBO MAKA WASSCE AND JME. Nke Nolue Emenanyo Et al isi iri na otu

(Chapter II, page 25) Maka edemede.

 

 

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA

 

Guo Akwukwo Nchikota nke A.I Nze page 44

 

Dee nkenke edemede maka Edemede Nrurita uka naEdemede Ekwumekwu.

 

AKWUKWO NLERE ANYA

 

  • EXAMFOCUS

 

IGBO maka WASSCE and J.M nke Emenanjo et al

 

  • Nchikota Akwukwo Maka Igbo Sinio sekondiri (Correct step)

WASSCE

 

 

 

 

 

 

 

 

IZU ỤKA NKE  IrI  (WEEK 10)

ISIOKWU: Udidi atumatuokwu, omumatu na uru o bara n’agumagu. NDINAYA:

  1. Udidi atumatuokwu na omumatu ha.

 

  1. Uru o baran’agumagu.

 

NDINISIOKWU: 1. Udidi atumatuokwu na omumatu ha. A.UKABUILU (PARABLE):

Ukabuilu bu ilu e tinyee na nwantakiri akuko. O bu obere akuko ndi Igbo na-ako n’uzo ilu iji were choo okwu mma.

Omumatu:

 

  1. Udele ghuchara ahu were juo umunna ya kedu ka o di ugbua, umunna ya were zaa ya si ya na o bu ugbu a ka njo malitere riwa ya

 

 

Nkowa:

Nke a na-akowa mi mime ihe ojoo karia otu o si eme na mbu.

 

  1. Otu nwa mmuo na-acho mmadu. O were puta n’uzo were hu ozu nwuru anwu, o were tie E hee na ije eberela ya

 

Nkowa: Nke a putara mmadu inweta ihe o na-acho na ntumadi n’atughi anya ya.

 

 

B. EGBEOKWU (hyperbole)

 

 

 

Egbeokwu bu atumatuokwu a na-akpunyefe nnu n’ihe a na-ekwu site n’iji ihe  kariri ihe a na – ekwu wee ma atu iji meek a ihe a na-ekwu maka ya na-ada ka egbe.

Omumatu:

 

  1. Ndi no n’ama egwuregwu ahu kariri aja din’ala.

 

  1. Uwa dum na-anu ka okeke na-agwo uran’abali.

 

 

CH. IGBUDUOKWU (PARADOX)

 

Igbuduokwu bu atumatuokwu ebe a na-ekwu okwu na-adiba ka okwu iberiibe ma e chemie echiche lee ha anya, ha eziputa eziokwu.

Omumaatu:

 

  1. Ura ga-eju onye nwuru anwu afo.
  2. Onye atufughi o naghi

 

 

D. EKWUECHEOZO (IRONY)

 

O bu atumatuokwu nke mmadu ji eziputa ihe ozo o bu n’uche nke na-aru uka n’ihe onye ahu kwuputara.

Omumatu:

 

  1. I biakazi n’oge wee bia mgbe ana-agbasa.

 

  1. Akola m oji n’ihi na oji juru uloa.

 

 

E. MBIAMBIAUDA (ASSONANCE)

 

O bu ebe uduaume na-aputa ugboro kwuru ugboro.

 

 

 

Omumatu:

 

  1. Nna Ada si Aba gaa ahia na

 

  1. Amara na-ata akara na achaghari anya na-acho

 

 

F. MBIAMBIAMGBOCHI (ALLITERATION)

 

Mbiambiamgbochi bu ebe otu mgbochiume na-aputa ugboro  kwuru ugboro.

Omumatu:

 

  1. Nna ya ochie bulawara akwukwo.

 

  1. Onye ohi ahu no ugbua na-esi igwen’imi

 

H. ASINIILU (WELLARISM)

 

Asiniilu bu udi ilu a na-akpo out onye maobu out ihe aha sin a o bu ihe onye/ihe ahu kwuru.

Omumatu:

 

  1. Udara siri na o bughi naani ya mutara nwa a na-apiwa

 

  1. Nkita siri onye ya turu oche wenatakwara ya ego na ntukwu amarala ya  ahu.

Nnwale:

 

  1. Deputa ndiiche di n’etiti mbiambiamgbochi nambiambiauda?

 

 

 

NDINISIOKWU: 2URU ATUMATUOKWUBARA N’AGUMAGU.

 

  1. Atumatuokwubu okwu nka a na-etinye n’okwu maobu n’edemede iji mee

 

 

 

ka o nwee ugwu ma too uto n anti.

  1. A na-enye nwata akwukwo na-etinye atumatu okwu n’edemede ya maak puru ichen’ule.
  • E ji atumatuokwu acho edemede agumagu mma.
  1. Atumatuokwu na-abata n’edemede o bula e dere n’asusu
  2. Mmuta atumatuokwu na-eme ka ederede aguoazaa di mfe. NNWALE:
  1. Deputa uru abuo atumatuokwu baran’agumagu?

 

NCHIKOTA NNWALE: Tumbom Tumbom Horo otu n’ime ndi a:

  1. Kedu akpaalaokwu nkowa ya bu I gba nnukwu uzo? (a) edi suru ya o nu (b)  o nwu obu n’aka (ch) o na-agu okpa onu (d) o ji mbe n’aka.
  2. Nneka dika nza putara na (a) Nneka nwere nku ka nza (b) nneka tara nnukwu ahu (ch) Nneka di mkpumkpu (d) nneka nwere ugbene ka
  3. Kedu udi atumatu okwu gwongworo bu? (a) ndika (b) mburu (ch) akpaalaokwu (d)
  4. Kedu udi atumatu okwu ahiriokwu a-onwu, i mee aru na-egosi? (a) ndika (b) mburu (ch) mmemmadu (d) akpaalaokwu.
  5. Ole nke bu aha nsinuuda n’ime ndia? (a) mkpurumkpu (b)  komkom (ch) osisi (d)agbisi

Edemede Nnwale:

 

  1. Kowaa ihe bu mmemmadu? Were ahiriokwu di iche iche were choo nkowa gi
  2. Were omumatu ato kowaa n sinuuda?

 

  1. Akpaalaokwu na ilu ha bu otu? Kowaa onwe gi nke oma.

 

  1. Kedu ka ukabuilu si mere di iche n’ilu naakpaalaokwu?

 

 

 

 

  1. Deputa ndiiche di n’etiti ilu na ukabuilu? Were ihe omumatu were choo nkowa gi mma.

 

 

Oru ngwucha izuuka:

 

  1. Guo Nchikota Ihe omumu nke Asusu Igbo maka Ule Sinio Sekondiri nke Maazi M. C. Ngoesi, Optimal, Press Ltd. Nig. (pejis 141-148)

Ihe Ogugu maka nkwado izuuka o zo:

 

Gue oruaka na uru oruaka bara.

 

Ihe omume nke ngwucha izuuka.

 

Deputa akpaalaokwu ise I mara ma kowakwo ha nkeoma?

 

Akwukwo nlere anya:

 

  1. Ndezu utoasusu Igbo nke ndi Sinio Sekondiri nke Chinekum Ofomatadere; Format Publishers (NIg.)Ltd.
  2. Nchikota Ihe omumu nke Asusu Igbo maka Ule Sinio Sekondiri nke Maazi
  3. Ngoesi dere. Optimal Press Ltd. Nigeria.

 

 

 

 

IZU ỤKA  NKE  IrI  NA  OTU (WEEK 11)

ISIOKWU: Oruaka: (A)Mputara ya (B)Udi oruaka di iche iche (C)Uru oruaka bara

 

NDINAYA: 1.Nkowa ihe bu oruaka, na oruaka di iche iche

 

  1. Uru oruaka bara

 

 

 

 

 

 

 

NDINISIOKWU 1:NKOWA IHE BU ORUAKA

 

Oruaka bu ihe mmadu na-eme na ndu o ji akpata ego. Onye o bula kwesiri inwe oruaka n’ihi na a na-ewere onye na-enwwghi oruaka di ka ofogori.

ORUAKA DI ICHE ICHE

 

E jiri oruaka di iche mara ndi igbo. Oruaka kere onwe ya uzo abuo; Ha bu:

 

  1. Oruaka nkeodinaala
  2. Oruaka ogbaraohuru

 

 

 

 

(A) ORUAKA NKE ODINAALA

 

Nke a bu oruaka ndi ahu si n’aka ndi nna nna anyi ha rute anyi aka. Di ka:

  1. Oruugbo
  2. Ikpa enunu (ikpa anu ulo di iche iche di ka ewu, aturu, ezi, ehi wdg)
  • Azumahia
  1. Ikuazu
  2. Ichu nta
  3. Iji osisi tuoihe
  • Ikpa iheokpukpa

iix. Ikpu ite Wdg.

 

 

 

 

Oru ikpa ihe okpukpa Oru ikpa anumanu

 

  • ORUAKA OGBARAOHURU

 

Oruaka ogbara ohuru bu oruaka choro akonauche sitere n’agumakwukwo. O bu oruaka si n’obodo ndi ocha wee rute anyi aka;

Omumaatu:

Igwo oria

 

  1. Igwo oria

 

  1. iwu

 

 

 

 

 

Iwu

  • Nchekwa ego
  1. Nkuzi
  2. Mgbako, na nwepuego

 

 

 

 

 

 

 

  1. Nosin Nosin

 

  • Ntaakuko

Ntaakuko

iix. Injiniarin

  1. Inya ugboala
  2. Ikwa akwa
  3. Kapintri
  • brikleyin, wdg.

 

 

NNWALE

 

  1. Gini buakaoru?
  2. Deputa akaoru ise imaara

 

 

NDINISIOKWU 2: URU ORUAKA BARA

 

Ndi a bu uru oruaka bara

 

  1. Inwe oruaka na-enye mmadu ugwu, nansopuru
  2. E ji oruaka ama ihe bu akaraka mmadu
  • Oruaka na-eme ka onye o bula kwuuru onwe ya. O nweghizi onye ga-asi ibe ya nye
  1. O na-eme ka ime mpu laa n’obodo
  2. O na-eweta aguu igu akwukwo

 

 

 

  1. Onye nwere oruaka na-eriju afo, na akpachapuru ezinaulo yaanya
  • Adighi enwekebe ndi ofogori n’obodo onye o bula nwereoruaka

 

 

NNWALE

 

  1. Gini buoruaka?
  2. Deputa oruaka iri imaara
  • Kowaa uru ise oruaka bara

 

 

NCHIKOTA NNWALE

 

Tumbom Tumbom Hoputa nke a choro

  1. Oruaka putara ——– (a) izu ohi (b) akoanuuche (c) ofogori (d) ihe mmadu na-aru akpata ego
  2. Oruaka kere onweya uzo (a) abuo (b) ano (c) ise (d) ato
  3. Otu n’ime ndi a bu oruaka ogbara ohuru (a) Azumahia (b) Iku azu (c) ntaakuko (d) Ichunta
  4. Kedu nke bu oruaka nke odinaala? (a) ichu nta (b) nkuzi (c) ikwa akwa (d) inya ugboala
  5. Oruaka na-enyere mmadu aka ime otu n’ime ndi a (a) ikpo asi (b) izu ohi (c) iriju afo (d)onweghi

 

 

EDEMEDE NNWALE (ESSAY TEST)

 

  1. Kowaa ihe buoruaka
  2. Deputa oruake ise imaara
  • Deputa uru ato oruaka bara

 

 

 

ORU NGWUCHA IZUUUKA (Weekend Assignment) Guo akwukwo Igbo Sekondri N’usoro Bezik Edukeshon

IHE OGUGU MAKA NKWADO IZUUKA OZO(Pre-reading Assignment)

 

Gugharia isiokwu ndi akuziri site n’izuuka abuo ruo n’izuuka ato. IHE OMUME NKE NGWUCHA IZUUKA( Weekend Activity) Deputa uzo ata e nwere ike isi kwalite oruaka n’ala Igbo AKWUKWO OGUGU ( REFERENCE TEXT)

Igbo maka Sekondiri N’usoro Bezik Edukeshon Nke S.N Okafo, na nke M.U Osuji, Elites’ Publishers.

 

 

IZUUKA IRI NA ABUO (WEEK 12)

 

Mmeghari na ule

 

IZUUKA IRI NA ATO (WEEK 13)

 

Ule na mmechi

Spread the word if you find this helpful! Click on any social media icon to share